'Ụmụaka m na-ejibu keke aga akwụkwọ n'onwe ha'

Ndị mụrụ ụmụaka anọ onye keke e dunyere buga ha akwụkwọ buru gbafuo agwala BBC Igbo ije ya na mkparịtaụka.
Nne ha bụ Oluchi Chịmaobi gwara BBC igbo na ụmụ ya na-esobi Keke agara onwe ha akwụkwọ tupu ọdachi ahụ e mee.
N'ụbochị Monde,abalị 27 nke ọnwa Novemba, afọ 2023, Oriakụ Chimaobi Oluchi tinyere ụmụ ha anọ na keke ha kwusịrị n' ụzọ ka ọ bụru ha gaa ụlọakwụkwọ 'Great Ambassadors College' dị n' Ọkpuru Ọchịchị, Ukaiuga Nkweoegu, Ohuhu.
O bekuru ụmụ Naijiria ka ha nyere ya aka chọta ụmụ ya ma hapụ ịta ya ụta maka ihe mere.
Kirie ya n'uju

Otu onye agbataobi akọrọla BBC ihe mere ha kemgbe atọrọ ụmụaka anọ si n'otu nne n'izuụka gara aga.
Ọ si na ebe niile bụ so iri ụjụ ka ndị niile na-eme n'ihi na ụmụaka ahụ bụ ndị mmadụ niile hụrụ n'anya.
Nwaanyị ahụ kwukwara na ụmụaka ahụ bụ ndị a zụrụ ọfụma na-asọpụrụ ma na-enyere mmadụ niile aka.
Ọ sị na ụmụaka ahụ na-eje akwụkwọ ma na-abata n'enweghi nsogbu ọbụla rukwe ụbọchị ahụ ọdachi dakwasiri ha.
Cheta na ndịuweojii na-enyocha akụkọ banyere etu onye ọkwọ Keke amabeghi onye ọ bụ si tọrọ ụmụaka anọ si n'otu nne na nna na-aga akwụkwọ.
Etu onye keke si kwọrọ ụmụaka anọ a sị ya kwọga ụlọakwụkwọ milaa

Ebe foto si, NFP
Ndị uweojii Abia steeti ekwuola na ha ebidola ime nchọputa gbasara ụmụaka anọ onye keke bu ha aga akwụkwọ buru ha gbalaga.
Nne na nna ụmụaka anọ a na achọ-achọ agwala ndị uweojii etu umu ha sịrị bụrụ ndị amaghị ebe ha nọ ugbua.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Maazị Chimaobi Agha na nwunye ya bụ Oluchi Chịmaobi bị na Ụmuagu, Ibeku, n' Ọkpụrụ Ọchịchị Umuahia North gara n'ụlọọrụ ndị uweojii bụ 'Ohuhu Police Divisional Headquarters' ebe ha mere mkpesa ma kọwa etu ụmụ ha anọ; Chinweotiti Chimaobị, nwa nwaanyị dị afọ asaa; Nmesomachi Chimaobị, nwa nwaanyị dị afọ asaa; Testimony Chimaobị, nwa nwoke dị afọ anọ na Godswill Chimaobị , nwa nwoke dị afọ abụọ, sị bụrụ ndị na-efu efu.
Ha gwara ndi uweojii na n'ụbochị Monde,abalị 27 nke ọnwa Novemba, afọ 2023, Oriakụ Chimaobi Oluchi tinyere ụmụ ha anọ na keke ha kwusịrị n' ụzọ ka ọ bụru ha gaa ụlọakwụkwọ 'Great Ambassadors College' dị n' Ọkpuru Ọchịchị, Ukaiuga Nkweoegu, Ohuhu.
Oluchị esoghị umuaka ha baye na ya bu Keke maka na ha bụ na ọbị na nwa ha nke dị afọ asaa mara uzọ na agbanyeghị na ha amaghị onye keke ahụ.
Mgbe akwụkwọ gbasara n' ụbọchị ahu, ụmuaka anọ ahu anataghị na be ha ma rue ugbua.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti bụ Maureen Chinaka kwuru n'ozi o wepụtara sị, "Ndị uweojii amalitela ime nnyocha ịmata ebe ụmụaka ahụ nọ."
"Nnyocha e merela gosiri na ụmụaka ahụ eruteghị ụlọ akwụkwọ ubọchị nne ha tinyere ha na keke ma rio oha na eze ka nyere aka n' ichọputa ịhe emere."