A tọrọla ụfọdụ ndị be anyị ma na-agba egbe aghara aghara - Ndị obodo Ikem, Enugu steeti

Otu ndị ojiegbe dị iche iche na-akpa ike n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa kemgbe afọ ole m ole.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu ndị ojiegbe dị iche iche na-akpa ike n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa kemgbe afọ ole m ole.

Akụkọ si obodo Ikem nke okpuru Ọchịchị Isi-Uzo n'Enugwu steeti apụta na-ekwu na ụfọdụ ndị otu ojiegbe wụchiri n'obodo ha na-amaja ndị mmadụ, agba egbe aghara aghara ma a tọrọ ndị ọzọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo n'ụtụtụ Monde na "E nweghị ozi banyere mwakpo maọbụ ntọrọ ọbụla anyị natarala n'akụkụ Enugu ọbụla."

Akụkọ ndị sikwa ebe ahụ adapụta kwuru na ya bụ ndị ojiegbe jibidoro ya bụ obodo kemgbe otu izu gara aga.

Iji saa nke a, Ndukwe kwuru 'Ndị na-akọ akụkọ a amakwa ihe njibodo pụtara? Enweghị akụkụ Enugu ọbụla ndị ojiegbe maọbụ ndị otu ọbụla jibidoro."

Mana ndị bi n'obodo ahụ kwutuuru BBC Igbo ma kọwa na ọ bụ n'ezie na otu ndị ntorobịa bụ egbe na-apụta ugboro ugboro kemgbe izu gara aga na-agbali egbe elu ma atọọrọ ndị mmadụ.

Otu onye n'ime ndị obodo ahụ kwuru: "E ji anya m hụ ya bụ ndị ntorobịa, ụfọdụ n'ime ha yicha uwe ojii dịka ha pụtara gbaa ebe aghara aghara n'akụkụ be m dịka ndị mmadụ gbara ọsọ." "A tọrọ mmadụ ise bụ ndị m maa" "Ụbọchị nke mbụ, ha tọọrọ mmadụ abụọ, ụbọchị so ya ha tọọrọ mmadụ atọ n'akụkụ ọzọ." Onye ahụ gwara BBC Igbo na ruo ugbua, enwebeghị onye n'ime ha ise atọhapụrụla.

Ọ kwukwara na ndị ahụ tọọrọ ndị a na-anazị ezinaụlọ ndị ahụ atọrọ ego mgbapụta.

O kwuru "Ha na-ana ego ruru nde Naịra 40 iji tọhapụ ndị a."

O kọwara na ya bụ ndị ojiegbe na-eji egbe ha na-agba na-achụsa ndị obodo ahụ ma na-amaja ha.

Ọ gara n'ihu kwuo: "Ama m mmadụ anọ n'ime mmadụ ise ahụ a tọọrọ, otu onye n'ime ha bụ nwoke na-arụ ọrụ 'Welder' nke ọtụtụ na-akpọ aha 'Iron-must-obey."

"Nwoke ahụ bibụ n'Enugu mana ọ lọghachitere obodo anyị tupu ndị ojiegbe ahụ atọọrọ ya" Ọ kọwara na atọkwara otu nwaanyị na-ere ihe nrị n'ahịa obodo ahụ bụkwa onye ọ ma ama nakwa otu nwaokorobịa ọzọ na-akọ ugbo." Ọ gara n'ihu kwuo na a tọkwara otu nwata akwụkwọ Sekọndịrị ọ ma ama bụ onye ahụ adịghị lọrọ ụlọ ka ọ nweta ọgwụgwọ.

Ndị uweojii n'Enugu steeti na-ekwu na enweghị akụkọ mwakpo maọbụ ntọrọ ọbụla si Ikem bịaara ha.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii n'Enugu steeti na-ekwu na enweghị akụkọ mwakpo maọbụ ntọrọ ọbụla si Ikem bịaara ha.

Onye ọzọ gwakwara BBC Igbo okwu kwuru na a tọrọ nna otu onye Ụkọchukwu n'obodo ahụ dịka o kwuru na a na-ana ezinaụlọ ya bụ nwoke ego ruru nde Naịra 10. Onye ahụ kwuru na n'ezie ọtụtụ ndi uweojii nakwa ndị agha awụjuola n'obodo ahụ taa bụ Mọnde dịka ha na-arụ ọrụ nchekwa ha ebe ahụ ugbua. Cheta na obodo Ikem a nọ n'akụkụ Eha-Amafu bụ ebe ndị a na-eche bụ ndị ochi ehi wakporo ugboro ugboro n'afọ 2022. Ọtụtụ ndị obodo Eha-Amafu agbaala ọsọ ndụ ha ma gbabata obodo Ikem bụzị ebe wakpọ na-adapụta ugbua.

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, Louis Amoke/Facebook

Ihe gọọmentị Enugu kwuru

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ndụmọdụ gọvanọ Enugu steeti n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Steve Orurua gwara BBC Igbo n'ụbọchị Monde na ihe niile gbasara ozi nchekwa na-esi n'aka ndị uweojii apụta, na ọ bụghị n'aka ya.

Mana ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghị ihe ọhụrụ na ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-emetụta Enugu steeti etu o sikwa emetụta steeti Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ndị ọzọ nakwa akụkụ Naịjirịa ndị ọzọ.

Ọ gakwara n'ihu kọwa ihe ọ ma gọọmentị Enugu steeti na-eme ọkachasị banyere nsogbu enweghi ezi nchekwa na-emetụta Isi-Uzo nakwa Eha-Amafu.

Orurua sị,"Gọọmentị Enugu agbaala mbọ kpọkuo ndị ọchịchị obodo ndị, ndị nwere agba, ndị isi ụkwa nakwa ndị ọzọ ma mee ka ha nwee mkparịtaụka ma jịkọwa aka ọnụ n'iweghachite udo n'akụkụ obodo ahụ."

O kwukwara na, "Okwu nchekwa abụghị ihe dịịrị naanị ndị ọrụ nchekwa, ndị obodo na-etinyekwa aka, nke bụ ihe gọọmentị Enugu na-agba mbọ na-akwado."

"Anyị akwadola ndị nche obodo ma hibekwa otu nchekwa pụrụiche ga na-eleba anya n'ime ọhịa obodo anyị nke gụnyere Eha-Amafu. Nke a bụ ndị a kpọrọ 'Forest guard'."

O kwuru na enweghị ebe ọzọ na Naijirịa ihe dị etu a dị dịka ọ kọwara na gọọmentị Enugu "Enyela mmadụ 1700 ikike dịka ndị otu 'Forest guard', itinye aka na ọrụ nchekwa."

"Gọọmentị Enugu steeti na gọọmentị Benue steeti bụ ndị agbataobi anyị ejikọọla aka ọnụ n'okwu ibuso mwakpo n'aka ndị eche bụ ndị ochi ehi agha."

Ndị obodo Ikem gwara BBC Igbo gbara ama na ndị agha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ awụchiela n'akụkụ obodo ahụ mana ha kwuru na ezigbo ụjọ ji ha n'ihi ọtụtụ mwakpo emeela n'Eha Amafu dịka ya bụ ihe na-abatazị n'ime obodo nke ha.