Etu ndị a sị yi akwa ndịagha si wakpoo Eha-Amufu gbuo ọtụtụ mmadụ

Ndị uweojii

Ebe foto si, Nigerian Police

Nkọwa foto, Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa emeela njem gaa ebe mwakpo a mere dịka nnyocha na-aga n'ihu ugbua.

Ndị uweojii n’Enugu steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na mwakpo mere n’ụzọ Eha-Amafu/Nkalagu nke okpuruọchịchị Isi-Uzo na steeti tara isi ọtụtụ mana ha ekwupụtaghị kpọm kwem mmadụ ole ya bụ mwakpo tara isi ha.

N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Daniel Ndukwe zipụtara, ọ kọwara na ndị uweojii nakwa ndị agha Naịjirịa emeela njem gaa ebe ahụ ma were anya ha hụ etu e si gbaa otu nnukwu ụgbọala ọkụ ma gbakwa ndị mmadụ ọkụ ebe ahụ.

O kwuru na ha ejịkọla aka ọnụ malite nnyocha n’okwu mwakpo a dịka ọ kọwakwara na ngalaba nnyocha pụrụiche ndị uweojii bụ State Criminal Investigation and Intelligence Department etinyela aka n’ọrụ ima imi n’ala nnyochapụta ihe niile gbasara mwakpo a.

Ọ gakwara n’ihu kụchapụ akụkọ ọ sị na-efegharị na ya bụ nnukwu ụgbọala bu ọtụtụ ngwa ọgụ nakwa ndị omekome ‘Bandits’. Ndukwu kwuru “Nnyocha anyị na-egosi na ihe dị n’ime ụgbọala ahụ a gbara ọkụ bụ ibu nakwa ngwa ahịa ndị mmadụ, ọ bụghị ngwa ọgụ nke o jiri bụrụ ndị omekome nọ n’ime ya.’

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Getty Images

Kedụ ka mwakpo a siri mee?

Akwa na anyammiri na-ezo n'Ebo, Eha-Amufu dị n'kpuruọchịchị Isi-Uzo dị n'Ebugu steeti dịka a sị na ndị ojiegbe bu egbe nakwa mma wakporo obodo ahụ n'ụbọchị Tozde, abalị Itoolu nke ọnwa Disemba, 2022.

Ndị obodo ahụ kwuru na ndị bịara mee ya bụ mwakpo bụ ndị a sị yi akwa ndị agha.

Otu onye n'ime na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo sị, "Ọ bụ n'ụzọ ụtụtụ Tọzde ebe elekere atọ ka ha bịara bido gbawa egbe aghara aghara."

"Ha yi akwa ndịagha, anyị echebuo na ha bụ ndịagha Naịjriịa mana etu ha si gbiricha ozu ndị ha gburu abụghị etu ndị agha Naijiria si egbu mmadụ."

Ọtụtụ akụkọ pụtara na ndị mere ya bụ mwakpo gbakwara ogige ahụ ọkụ.

Na nonso a, ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi awakpoola Eha-amufu ihe karịrị ugboro anọ na ọnwa ole na ole gara aga odo.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Ifeanyi Ugwuanyi nakwa ndị ọrụ nchekwa mere njem gaa ebe ahụ dịka ha ṅụrụ iyi na ha ga-enyochapụta ndị mere ya bụ mwakpo.

Gọvanọ Ugwuanyi wepụtara ego naịra nde 10 nye ndị obodo ahụ dịka e kwuru na ọtụtụ n'ime ha gbara ọsọ ndụ ha ma gbaa obodo ndị ọzọ dịka ya bụ ego bụkwa ego iti aka n'obi nye ezinaụlọ ndị ya bụ mwakpo mere na Nọvemba metụtara.