Herdsmen attack : Etu ndị ọchịehi si kpaa mkpamkpa n'Eha-Amufu, Enugu steeti

Ndị ọchịehi anaghị anọ otu ebe dịka ha na-achịgharị ihe ha na mpaghara dị ịcheịche ọkachasị ebe ahịhịa na mmiri jupụtara maka anụmanụ

Ebe foto si, AFP

Ndị eche na ha bụ ndị ọchịehi egbuola otu nwaamadị aha ya bụ Ejike Odo ma merụọ otu nwoke ọzọ ahụ n'Eha-amufu, Enugwu steeti na ngwụcha izuụka a.

Mana ndị uweojii steeti ahụ sị na ha amaghị maka ọdachi ahụ.

Ejike na nwanne ya nwoke gara ịzọpụta nwanne ha nwaanyị ndị ahụ chọrọ ịwakpo n'ọhịa ebe ọ gara ugbo.

Ndị bi n'obodo ahụ gwara BBC Igbo na Ejike nwụrụ na ya bụ ije dịka ndị ọchịehi ahụ gburu ya, ebe ụmụnne ya abụọ ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ya.

Otu onye n'ime ha bụ Ngozi Odo gwara BBC Igbo n'ekwentị na "nke a bụghị mbụ ndị Fulani na-akpa ike n'Agụ-Amede".

Agụ-Amede dị n' Eha-Amufu n'Okpuru Ọchịchị Isiụzọ dị n'Enugwu steeti n'ebe okeala ha na Benue steeti.

"Ndị Fulani anaghị ekwe anyị zuo ike ebe a n' Eha Amufu. Ọtụtụ ndị mmadụ agbapụchaala na be ha maka ụdị ike ha na-akpa".

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe gwara Igbo na ndị uweojii steeti ahụ enwetaghị ozi ọbụla banyere ọdachi ahụ.

Ngozi Odoh na ndị obodo ha ndị ọzọ ha na BBC Igbo kpara gbara ama na ndị ọchịehi na-akpa ike ebe ahụ kemgbe otu afọ gara aga.

Ha kwukwara na ndị ọchịehi na-emekpa ọtụtụ obodo dị na mpaghara Eha Amufu.

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Ngozi Odo kwuru na, na Mgbuji dịkwa n' Eha Amufu, ndị Fulani na-achi ehi gburu mmadụ iri na atọ na Febuwari ma gbukwa otu nwaanyị dị ime na nwa ya.

Ọ sị, "o nweghịzị onye na-aga ọrụ ugbo na Mgbuji".

Otu onye nwere agba n'otu Ohaneze ndị Igbo n'Enugwu steeti na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na "ndị Fulani na-achị ehi na-emesi anyị ike na be anyị."

"O nwere mgbe gọọmentị Enugu steeti chịtara ndị agha ebe ahụ. Ndị agha ahụ nọrọ otu ọnwa.

Nke a mere ebe dum jiri daa jụụ mgbe ahụ mana ugbua, ha amalitela inye nsogbu ọzọ".

Onye bụ Onowu ndị Mgbuji bụ Christian Nnaji sị na ya bụ ihe malitere kemgbe afọ gara aga ka ha malitere ịta ahụhụ n'aka ndị Fulani na-achị ehi.

Ọ sị na, "ndị ọchịehi ahụ ji aka efo ihe a kụrụ n'ubi, na-emebicha ihe niile a kọrọ n'ugbo. Onye kwuo okwu ha sị na ebe ahụ bụ be ha, na ọ bụghị nke anyị".

"O nweghị mgbe m ji cheta anyị na ndị ọchiehi ji nwere ala be anyị. Ha ji ike achọ ịnapụ anyị be anyị".

Onowu boro ebubo na ndị ọchịehi ahụ gburu ọtụtụ ndị be ha, ọkachasị mgbe ha gara n'ahịa ha ga gbuo ọtụtụ mmadụ bụ nke ha gbara ọkụ na ndụ.

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Ruo taa, ọo nweghị onye bi n'ebe ahụ.

Ndị ọchiehi mebiri ihe anyị kọrọ n'ugbo - onye nche

Valentine Edeh bụ onye ọrụ nche obodo sị na ndị ọchịehi ji ehi ha emebi ihe anyị kụrụ n'ugbo.

O kwuru na na mbụ, na mbụ ndị ọchịehi na mbụ anaghị emebi ihe n'obodo.

" Ọ na-abụ, ha bịa n'ugbo ha arịọ anyị mmiri maọbụ nri, anyị enye ha, ha ekele gị gawa. Mana ugbua, ndị nke a na-eme ihe ọjọọ dị iche iche".

Edeh sị na ndi nke a bịa ugbua kemgbe afọ atọ gara aga dị iche,

"Ha na-akpọrọ ehi ha baa n'ugbo ndị mmadụ na-emebi ihe, na-awakpokwa nwaanyị n'ike 'ubi.

"Onye kwuo okwu, ha e nwere mma chụwa onye ahụ gbuo."

"Ndị ahụ mechere buwe egbe".

Edeh kọro na Jenwari afọ 2021, ndị ọchịehi gara gbuo osisi akparata dị n'iwu obodo were akwụkwọ ya nye ehi ha.

Ka ndị na-agafe ụzọ juru ese, ha ridata were mma chụwa ha, gbuo otu onye.

"Ọtụtụ mgbe ha na-esi n'okeala anyị na Benue steeti bịa gbuo ọtụtụ mmadụ gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ."

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, BBC Sport

Nke bụ na ha bịara n'ime ahịa Ogbete Mgbuji bịa gbawa egbe aghara agha gbuo ọtụtụ mmadụ.

Ndi ọrụ nchekwa gọomentị niile gara hị ime ndị ahụ mere ebe ahụ.

Mgbe ahụ ka gọvanọ steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi jiri kpọga ndi agha Naijirịa ka bịa chekwaa anyị,

"Nke tụrụ anyị n'anya bụ nke mere na 24 Maachị 2022 ka ndi ọchehi a bịara gbawa gbe aghara agha n'ime obodo.

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

"Mgbe anyị gbagawara ebe ahụ ịzọpụta ndi be anyị e meruru ahụ, anyị amaghị na ha zoro n'akụkọ ụzọ were kwawa anyị mgbọ."

" Ọ bụ Chineke zọrọ m. Ha gburu otu onye anyị na ya sọ tinyere mmadu iri abụọ ndị ozọ."

Edeh kọrọ ike mere ụnyaahụ bụ 15 Mee, ka ha chọrọ ịtọrọrọ onyeisi nchụaja ndị Church of Christ bụ nke ha mechere tọrọ nwunye ha, nwoke ahụ buru ube nma gbaa ọsọ".

Ọ sị na kemgbe ahụ ndị ọbụla hapụrụ ha ebe ahụ gbaa ọsọ.

Ha na-arịọ gọọmentị ka ha nyere ha aka chụpụ ndị ahụ ka ha laghachi be ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: