Ndị ntọ atọhapụla Eze ndị Igbo na Ondo steeti bụ Donatus Okereke

Donatus Okeke

Ebe foto si, Innoson Chuks Ezeh

Nkọwa foto, Donatus Okeke, Eze ndị Igbo na Ondo

Donatus Okereke, onye bụ onye ndu ndị Igbo bi na Ondo steeti, enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ.

Cheta na BBC Igbo wetaara gị akụkọ etu e si tọrọ Mazi Okereke n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Nọvemba.

Mana dịka ụlọntaakụkọ Punch siri kwuo, Okereke nweere onwe ya n'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na ise nke Nọvemba.

Ọkaiwu Innoson Chuks Ezeh, onye bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo na Ondo steeti, gwakwara BBC na ọ bụ eziokwu na Mazi Okereke enwerela onwe ya.

Okereke kọrọ etu ndị ntọ ahụ siri nwuchie ya n'okporo ụzọ na-aga Ọwọ.

O kwuru sị: "Ọ bụ n'elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ ụbọchị Mọnde ka ya bụ ihe mere."

"Oge m pụtara n'Elegbeka 'junction' ka m bidoro ịnụ ụda egbe aghara aghara nke mere ka m kwụsị ụgbọala m."

"Otu n'ime ndị ntọ ahụ yi akwa ndị agha. Ha bịara dọtuo m, dọrọ m banye n'ime ọhịa."

"Ha kwuru na ha ga-egbu m ma ọ bụrụ na emeghị m ihe ha sị m mee.

Aha onyonyo, Ihe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala

"Anyị nọrọ awa asatọ n'ime ọhịa ahụ nke dị nso n'ebe ha nọrọ tọrọ m, mana anyị mechara were ụkwụ gaa ije abalị ahụ niile."

"Oge chi foro, anyị malitekwara ịga ije. Anyị gara ije n'ime ọhịa abalị atọ."

"Ọ bụ n'abalị Tọzde ka ha tọhapụrụ m oge a kwụrụ ha ụgwọ."

"Ha bu ụzọ sị na mụ ga-akwụ nde naịra 100, mechaa ha butuo ya ruo nde naịra 20."

Aha onyonyo, Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga

"Ha kwuru na ha ga-egbu m ma ọ bụrụ na akwụghị m ya bụ ego."

"Nwunye m agwabeghị m ego ole ha mechara kwụọ tupu a tọhapụ m."

"Ndị ahụ tọọrọ bụ ndị Fulani. Mgbagha adịghị ya."

Etu ndị ntọ si tọrọ Eze Ndigbo n'Ondo steeti

Donatus Okeke

Ebe foto si, Innoson Chuks Ezeh

Nkọwa foto, Donatus Okeke, Eze ndị Igbo na Ondo

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị ntọ atọọla Eze Ndị Igbo n'Ifon dị n'ọkpụrụ Ọchịchị Ose dị n'Ondo steeti.

Ndị bu egbe tọọrọ Igwe Donatus Okeke n'ọkpọrọụzọ dị nso n'ụlọọrụ na-egwupụta ihe ọnatarachi n'ụbọchị Monde abalị 22 nke ọnwa Novemba, afọ 2021.

Onye ndụ Ohaneze Ndigbo n'Ondo steeti bụ Ọkaiwu Innoson Chuks Ezeh gwara onye ntaakụkọ BBc Igbo na ya bụ ihe mere eme.

O kwukwara na ndị ntọ ahụ napụrụ Eze Igbo ahụ akatamkpo ego o bu mgbe ya bụ ihe mere.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị omekome ahụ akpọọla ezinaụlọ Eze ahụ ma kwuo ka e nye ha nde naira 100 tupu a tọhapụ ya.

Aha onyonyo, Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ.

Ọkaiwu Ezeh sịri, "Ọ bụ n'ụtụtụ ụnyaahụ(Monday, Novermber 22, 2021), ka Eze ndị Igbo n'ụzọ gara Ifon tupu e rue a kpọrọ 'Nigercat Quarry' ka a sị na ndị ntọ mapụtaraa, jide Eze Ndigbo n'Ifon, gbaghara ụgbọala ya,kpụpụta ya n'ụzọ, kpụba ya ọhịa."

"Ha napụkwara ya nnukwu ego n'ihi na a nụrụ na ọ na-aga 'quarry' iga zụta okwute"

"Kemgbe ahụ ndị ntọọ ahụ akpọọla mana ego ha na-akpọ dịka nwunye ya bụ Odubeze si kwuo bụ N100m."

"Anyị enyela ndị Amotekun ozi ihe mere. nwunye ya akpọkwala ndị uweojii."

Aha onyonyo, Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa

Ọkaiwu Ezeh gara n'ihu kọwaa na ebe ya bụ mkpamkpa nọọ mee bụ eze ndị ntọ tọọla ọba ndị Yoroba ma gbuo ya na nsonso a.

Ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha na-esochi mkpesa ha nwetara banyere Eze Igbo ahú a na-achọ achọ ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Funmi Odunlami kwuru na 'anyị nwetara ozi ihe mere." "Anyị amabeghị ma ọ bụ ntọ. Anyị nwetara ozi n'ụtụtụ(ụnyaahụ) ozigbo o mechara.

"A hụrụ ụgbọala ya n'okporoụzọ mana ahụghị ya. A kpọkwara ekwentị ya ma ọ naghí aga aga."

Odunlami gara n'ihu kwuru na "ndí ọrụ anyị agharịala n'ọhịa dị n'akúkọ ebe ahụ niile chọọ ya".

O kwukwara na nnyocha na-aga n'ihu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: