Kamsiyo Agbasianya: Ndị ntọ atọrọla nwata afọ ise na Nnewi ka ọ na-aga 'block rosary'

Kamsiyo Agbasianya

Ebe foto si, Meka Family

Ndị a maghị ndị ha bụ atọrọla otu nwata gbara afọ ise aha ya bụ Kamsiyo Agbasianya, na Nnewi, Anambara steeti.

Joseph Meka bụ nna Kamsiyo, gwara BBC Igbo n'ekwenti na "ọ bụ ka ya na ibe ya gara ekpere 'Block Rosary' na mgbede Tuzde" ka ụmụnwoke bu ọgbatumtum, tọọrọ ọdụdụ nwa ya dịka ya na ibe ya so aga, buru ya gbalaga.

Nwoke ahụ bụ onye Obiagụ dị n'Uruagụ, Nnewi gwara BBC Igbo na ndị ji nwa ha akpọbeghị ha dịka o kwukwara na ha ewegarala ndị uweojii mkpesa maka ihe mere.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ndị uweojii n'ekwentị, ha kwuru na ha na-agbalị ịchọta nwa ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru sị "anyị ga-eme ihe niile ị me ka nwa a na ezianụlọ ya zụkọọ onwe ha ọzọ."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: