Ihe nwaanyị na nwoke kwesịrị ịma maka ịgbakọ mgbe nwaanyị na-eyi akwa

Nnyụsịta ọtụ
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Ndị Igbo na-asị na ihe onye amaghị bụ ya okenye mana ikwu amaghị, ibe ezi ya.

Ọtụtụ mgbe, nsogbu amụtaghị nwa na-esite na di na nwunye amaghị ihe ha kwesịrị ịma maka ihe ndị na-eme n'ahụ nwaanyị kwa onwa, nke gụnyere oyiyi na ndapụ akwa nwa nke Bekee kpọrọ, 'ovulation.'

Ọtụtụ ndị mmadụ ma maka nsọ nwaanyị (menstruation) nke na-eme n'ọnwa n'ọnwa, mana ọ bụghị mmadụ niile maara isi a hụrụ kwawa okpu bụ oyiyi na ndapụ akwa nwa, nke na-eme kwa izuụka abụọ tupu nwaanyi ahụ nsọ ya.

Afọ nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Oyiyi na ndapụ akwa nwa nke ụfọdụ ma dịka ọnọdụ ụga maọbụ ọnọdụ izi, bụ ntọhapụ akwa site n'akpa akwa nwaanyị nke ụfọdụ na-akpọ 'ehe' (ovaries) gawa n'eriri akpa nwa ebe ọ ga-ezute olulu nke Bekee kpọrọ 'sperm', were ghọọ nwa ma ọ bụrụ na ya bụ nwaanyị na di ya enwee mmekọrịta.

Nnwaanyị na di ya

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọmụmụ siri kọwaa, ahụ nwaanyị na-akachasị anabata nwa oge 'ovulation' mere.

Dkt Joseph Akinde kọwara na "Ọ bụrụ na di na nwunye nwee mmekọrịta otu abalị maọbụ atọ tupu 'ovulation' ebido, nwaanyị ahụ ga-atụrụ ime."

Mana dịka nwaanyị ọbụla nwere oge o ji ahụ nsọ ya, ha niile nwekwara oge dị iche iche ha ji enwe 'ovulation' ha.

Na mbido

Nwa nwaanyị ọbụla na-ebu akwa ruru otu nde maọbụ atọ (1-2m) apụta n'ụwa.

Ọ bụ dịka nwa ahụ ruru ihe e ji agbọghọ eme ka akwa ndị ahụ ga-ebido ịpụ ya n'ahụ kwa ọnwa ma ọ bụrụ na ya nwoke enweghị mmekọ aramara.

Etu nsọ nwaanyị si amalite

Ebe foto si, Getty Images

Njirimara ọnọdụ izi

Dkta Akinde sị na ụfọdụ ihe nwaanyị ji amata na o nwere oyiyi na ndapụ akwa bụ na "ụfọdụ obere ọbara na-apụta, ụfọdụ na-enwe afọ ọtịta maọbụ afọ mgbu ga-abịa nwa oge, ihe dị ka otu nkeji maọbụ ruo otu ụbọchị mana ọ naghị akarị otu ụbọchị."

Aha onyonyo, Lee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke

Otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo, na ọvulation nke ya na-eme ka "ara m zaa na-anyị m arọ".

Mana o bụghị nwaanyị niile na-enwe njirimara doro anya ha ji ama oge oyiyi nakwa ndapụ akwa nwa ha.

Ya mere o ji dị mkpa ịgụkọ ya n'ụzọ ọ ga-edo anya.

Ụzọ ị ga-esi gụkọ 'ovulation'

Dịka Joseph Akinde bụ dọkịta na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị si kọwaa, e nwere ụzọ ole na ole nwaanyị nwere ike isi gụkọọ 'ovulation'.

Ha gụnyere:

1. Ngụkọ e ji kalenda agụ kwa ọnwa

Kalenda e ji agụkọ • Oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị
  • Dopu akwụkwọ iche maka ịgụkọ nso gị kwa ọnwa
  • Oge ọbụla ị hụrụ nsọ gị, dee maọbụ kanye ya n'akwụkwọ
  • Detukwaa oge ị hụrụ nsọ na-eso ya
  • Ị dee ya ọnwa ole na ole ị ga-ahụta abalị ole ị na-anọ tupu ịhụ ya ọzọ
  • Ohere dị n'etiti ụbọchị mbụ ị hụrụ ya n'otu ọnwa na ụbọchị ị hụrụ ya ọzọ n'ọnwa na-eso ya nke a na-akpọ 'menstrual cycle.'
  • Oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị bụ ụbọchị iri na anọ (14) tupu ụbọchị ị ga-ahụ nsọ gị ọzọ

2. Iji "Basal body temperature" gụkọọ ya

Basal body temperature bụ ọnọdụ ahụ gị (ma ọ dị ọkụ ka ọ dị oyi) oge ị na-ezu ike.

Dịka Akinde siri kwuo, nwaanyị na-eji igwe e ji agụkọ ka ahụ onye si dị ọkụ maọbụ jụọ oyi ele onwe ya site na itinye ya n'okpuru ire ya ma o teta ụra, tupu ọ hapụ akwa ya.

Ọ na-akanyekwa ihe ọ chọpụtara n'akwụkwọ kwa ụbọchị n'akwụkwọ nke Bekee kpọrọ 'graph'.

"Ọ na-eme nke a kwa ụbọchị, ọ ga-ahụ ụbọchị ọ ga-agbalite karịa etu ọ na-adị na mbụ. Nke a bụ oge Oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị. "

Akinde sị, "Ụbọchị ọbụla 'temperature' ya gbara obere tupu ọ gbalitekwa, ọ mara na ọ bụ ụbọchị ahụ bụ ọnọdụ izi ya."

3. Iji 'Ovulation test kit' gụkọọ ya

Nwaanyị na di ya na-ele akọrọngwa e ji enyocha ahụ

Ebe foto si, Getty Images

A na-eji akụrụngwa agụkọ ọnọdụ mmiri ahụ nwaanyị iji mara mgbe nke a kpọrọ 'leutinizing hormone' (LH) rịrị elu na mammịrị nwaanyị.

'Leutinizing hormone' na-arịkarị elu awa iri na abụọ (12 hours) na iri atọ na isii (36 hours) tupu ọnọdụ ụga.

Dịka dọkịta ahụike ụmụnwaanyị ọzọ aha ya bụ Dkta Olusegun Akeredolu si kọwaa, "i nwere ike iji mammịrị nakwa asọmmiri ele, iji mata oge ọnọdụ izi gị tunyerela n'ụkwụ."

4. Iji nnyụsịta ọtụ (vaginal discharge)

Nnyụsita ọtụ

Bido n'oge nwaanyị hụrụ nsọ ya rue oge ọ ga-ahụ ọzọ, ọ na-ahụ nnyụsịta ọtụ dị n'ụdị na ụdị.

Dịka ụlọakụkọ nchọpụta ahụike bụ MedicalNewsToday si dee na websait ha, mbido 'cycle' nke na-eme n'ụbọchị mbụ rue ụbọchị nke ise, na-abụ oge nsọ nwaanyị na-eme.

Ihe ga na-apụta nwaanyị n'ahụ ya na-abụkarị ọbara.

A hụchaa nsọ (ụbọchị ise rue iri): Na mbido ya, naanị ntakịrị nnyụsịta ọtụ nke ga na-anya anya na-apụta. Nwaanyị ịtụrụ ime n'oge a rara ahụ.

Tupu oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị nke bụ ụbọchị 10 rue 14; mmiri ahụ nwaanyị a kpọrọ estrogen na-agbalite. Nnyụsịta ọtụ na-apụta ya n'ahụ anaghị ebu ibu, kama ọ na-acha nzu nzu (cloudy).

Nnyụsita ọtụ

Ụbọchị oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị (Ụbọchị 14): Akinde kọwara na "Ọ bụrụ na nnyụsịta ọtụ dị ntakịrị, na-acha ka mmiri ma na-alọ alọ nke ukwuu, ị mara na ọ bụ oyiyi na ndapụta akwa nwa."

N'otu aka ahụ, websaịt MedicalNewsToday kwuru na ọ bụrụ na i tinye nnyụsịta ọtụ a n'etiti mkpịsị aka gị dọtịa ya, ọ nwere ike ịdọtị rue 'inch maọbụ karịa."

A hụchaa oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị site n'ụbọchị 14 rue 22, mmiri ahụ nke a kpọrọ 'Progesterone' ga-arị elu ma n'ahụ nwaanyị nke ga-amịkọ nnyụsịta ọtụ. Nke a ga-eme ka ọ na-acha nzu nzu ma e mechaa riwanye nne.

Tupu ị hụ nsọ gị (ụbọchị 22 rue 28): Dịka nsọ gị na-eru, nnyụsịta ọtụ ga-arọ arọ dịka ihe e ji anya ihe. O nwekwara ike agaghị enwe ihe ga-apụta nwaanị n'ahụ ya abalị abụọ maọbụ otu tupu ọ hụ nsọ ya.

E tere ogiri, e tere ụgba, nsogbu dịka ọrịa ịba, ọrịa nwaanyị, nakwa oke ndọlị (stress) nwere ike ikposa ụzọ ndị a dị iche iche e si agụkọ ọnọdụ izi, dịka Dkta Akeredolu siri kwuo.

Aha onyonyo, Dr Akinde: Mkpa Ngụkọ 'ovulation' na-egbokarị

Ihe mere ngụkọ ọnọdụ izi ji dị mkpa

Ngụkọ oge nwaanyị na-anọ n'ọnọdụ izi abụghị naanị na ọ na-enyere di na nwaanyị aka ịmata oge ha ga-adịnwu ime, ọ na-enyere nwaanyị aka ịmata oge ọ ga-agbara aramara ọsọ, ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịdị ime.

Dr Akinde sị, "Ngụkọ na-egbokarị mkpa ma ọ bụrụ na di nwaanyị anọghị nso maọbụ na nwaanyị abụghị naanị ya ka di yana-alụ, ọ ga-eji ngụkọ ahụ mara oge ya na di ya ga-anọkọ ka ọ dị ime."

"E meghị etu a, nwaanyị bụ naanị ya ka di ya na-alụ nwere ike imekọ ihe dịka ugboro atọ n'otu izuụka , o nwe ike tụrụ."

Nke ọzọ bụ na ọ na-enyere nwaanyị aka ịmata oge nsọ ya ga-abịa ọzọ, ka o were jikere nke ọma ma gbalahụ imenye onwe ya ihere ụzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: