Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ etinyela iwu ị kwesịrị ịhụ tupu i mee njem

Ọkporoụzọ ụgbọelu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu akpọrọ Federal Airport Authority of Nigeria (FAAN) bụ Henrietta Yakubu kwuru na o nweghị ihe ngalaba ahụ ga-eme maka usoro ụlọọrụ ụgbọelu si ofesi hiwere maka ụmụ Naijiria na-aga mba ọzọ.

Nke a na-eme dịka ụfọdụ ụloọru ụgbọelu dịka Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ tinyere iwu nke kwuru na onye ọbụla sị Naijirịa chọrọ iso ụgbọelu ha mee njem ga-egosirịrị akwụkwọ nnyocha coronavirus nke gosiri na ha ebughị ọrịa ahụ tupu ha ekwe buru ya.

Ha kwuru na akwụkwọ ahụ a ga-eme nnyocha ahụ n'ime abalị anọ tupu onye ahụ emee njem ya.

Usoro ndị a gụnyere na onye ọbụla sị Naijirịa eme njem ụgbọelu a ga mba ọzọ ga-egosi ha akwụkwọ nyocha na-egosi na o bụghị ọrịa coronavirus.

Nke a wepụrụ ohere ndị mmadụ nwere ịkwụ ụgwọ njem n'oge ka ọ beere ha ego, ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị enweta mpụta nyocha ha n'oge .

Ndị na-eche ị banye ụgbọelu Medview na ọdọ ụgbọelu Abuja

Yakubu kwuru sị "Obodo niile nwere ikike ihiwe usoro nke ha maka nchekwa ọrịa coronavirus, o nweghị ihe ụlọọrụ FAAN ga-emewnu maka nke a".

O kwukara sị "Ka mmadụ niile mee njem ofesi nanị mgbe ọ dị mkpa ma ka ha bido kwa n'oge haziwe ihe niile ha ga-eji eme njem a n'oge".

Dịka Naijirịa ebidobeghị njem ụgbọelu nke ofesi, Yakubu na-ekwu na ha na-etikọ isi ọnụ iji wepụta usoro njem ndị si ofesi chọrọ ịbata Naijirịa.

Lee ụfọdụ ndi ụlọọrụ ụgbọelu hiwere usoro a:

Emirates

emirates.com

Ebe foto si, emirates.com

Etihad

etihad.com

Ebe foto si, Etihad

Kenya Airways

Akwụkwọ njem Kenya Airways

Ebe foto si, kenya-airways.com

Qatar Airways

Qatar Airways

Ebe foto si, www.qatarairways.com

Cheta na e hinyeburu mmalite njem mba ofesi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst, tupu e bugharịa ya gaa ụbọchị ise nke ọnwa Septemba.

'Gọomentị Naịjirịa ga-amachị onye njem ụgbọelu mba ofesi ọbụla ghọrọ aghụghọ maka nnyocha COVID-19' - Sani Aliyu

Dịka a na-akwado maka mmehe njem ụgbọelu mba ofesi ụbọchị Satọde na-abịanụ, onyeisioche ọrụ ọtawaike COVID-19 bụ Sani Aliyu adọọla aka na ntị na onye njem ọbụla ghọrọ aghụghọ maka

nyocha nje coronavirus na gọọmentị Naịjirịa ga-amachi ya ịbata obodo a.

O kwuru nke mgbe ndị otu ọtawaike COVID-19 akpọrọ Presidential Task Force on COVID-19 na agwa ndị nta akụkọ okwu ụnyaahụ.

Aliyu kwuru bụ onye kwuru nke a n'Abụja ụbọchị Mọnde sị na ha ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị na-eme njem sị mba ofesi dịka Naịjirịa na-ejikere ịmehe njem ụgbọelu mba ofesi ọzọ ụbọchị Satụde.

O kwuru na onye ọbụla na abata Naịjirịa ga-eme nnyocha ahụ Bekee kpọrọ "Polymerase Chain Reaction test for COVID-19" n'obodo ha si, wekwara mee ọzọ mgbe ha rutere Naịjirịa.

Ọ sị na ndị dara ya bụ ule ahụ agaghị abata Naịjirịa.

Ndị ụgbọelu ghọrọ aghụghọ maka ule ndị a ga-akwụ nha $3,500 maka otu onye njem dara iwu a.

Ọ dọkwara ha aka na ntị maka onye njem ọbụla agaghị eme nnyocha hụ nke aga eme abali asaa onye ahụ batachara Naịjirịa.

Aliyu sị ndị ọrụ Immigration ga-akagbu akwụkwọ ikike njem ya.

O kwuru na ya bụ mpụtara nnyocha agaghịzị adị ire ruo abali iri na anọ (14), dịka akara mbụ, kama na ha emeela ya abali asaa malite ụbọchị ha mere ya, na agaghị akarị abali abụọ tupu ha amapụ ya bụ njem.

O kwukwara na onye ọbụla ga-aga eme ya bụ nnyocha na Naịjirịa ga-akwụ ụgwọ ya malite na 29 ọnwa Ọgust 2020.

Ọgọst 29: Njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị a

Ebe ndị njem si apụ n'ọdọ ụgbọelu

Ebe foto si, FAAN_Official Twitter

Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika ekwuola na njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst.

O kwukwara na ọ bụ ọdọụgbọelu Legọs na Abuja ka njem a ga-ebu ụzọ malite.

O kwukwara na ọ ga-ewepụta usoro nakwa iwu ndị pụrụiche ga-ekpuchi njem a n'oge adịghị anya.

Mana akụkọ si n'akụkụ tebulu otu "presidential task force" na-ekwu na esubeghị oge mmepe njem ofesi kpọm.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post