Coronavirus Update: Lee ihe ga-agbanwe ma e bido njem site steeti gawa steeti ọzọ

Ndị Njem

Gọomentị ekwuola etu njem ụgbọala n'etiti steeti ga-esi adị. Ọ bụ na mgbasa ozi nke ngalaba nzụkọ presidemtial Task Force kwuru na-ewepụla mmachi njem site otu steeti gawa ọzọ.

Dịka gọọmentị wepụrụ mmachi ngagharị dị n'etiti steeti na steeti ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ihe chere ha mgbe ha ga-eme njem okporoụzọ.

Ọdụ mmanụ agbịdị
Nkọwa foto, Njem ime steeti agbanwela dịka ndị ụgbọala na-ebuzi nanị 50% iha ha na-ebu mbụ

Onyeisi ngalaba 'Risk Communication' nke 'National Centre for Disease Control bụ NCDC n'aha ịchafụ bụ Disu Yahya Oyewoga gwara BBC Igbo ihe ndị ga-agbanwe na njem ụgbọala n'etiti steeti.

Ha gụnyere :

  • Ụgbọala niile ga-ebu nanị mmadụ passenti iri na ise (50%) pekarịa ihe ha na-ebu na mbụ mgbe ọbụla
  • Ndị ọkwaa ụgbọala ga-ahụ na e nwere ohere mita abụọ n'etiti ndị ha bu eme njem.
  • Mmadụ niile nọ n'ụgbọala ga-eyi mkpuchi imi
  • Ndị ụlọọrụ na-aakwa ụgbọala ga ahụ na mmadụ nile ji mmrịrị e ji ehicha aka hicha aka ha tupu ha abanye ụgbọala

Oyewoga kwukwara sị "ngalaba NCDC, nzụkọ Presidential Task Force (PTF), Ngalaba FRSC na ndị nille nwere aka na njem ụgbọala na-enwe nzụkọ iji tule etu ha ga-esi mee ka iwu njem ụgbọala n'etiti steeti nwee isi".

Ndịọrụ FRSC ga-eso nyere aka hiwe iwu njem etiti steeti

Ebe foto si, @FRSCNigeria

Ọ kọwakwara na ha ga-enwe nzụkọ a kwa mgbe iji hụ na njem ụgbọala n'etiti steeti ga adị mma.

Oyewoga kwukwara sị "anyị na-enwe kwa nzụkọ ka anyị bipụta atụmatụ ga-eme ka mmadụ niile ghọta usoro njem ụgbọala".

Kedu ihe atụmatụ a nwereike ibute?

Otu ihe nwereike ime dịka ndị ngalaba nọrọ onwe na-achịkọta njem ụgbọala na Naijrịa bụ National Union of Road Transport Workers ekwuola na ọ bụrụ na gọọmentị ewepụtaghị ụzọ ha ga-eji nyere aka na ha ga-ebuli ego njem ụgbọala.

Ngalaba a na-akọwa na ọ bụrụ na ha ga-ebu nanị mmadụ passentị iri ise pekarịa ihe ha na-ebu mbụ na ha kwesiri ibuli ego njem ha ka ha nweta uru.

Ndị ọkwọ ụgbọala sị na Olabode na-enyere ha aka itinyeju ndị mmadụ n'ụgbọala ha ngwa ngwa.
Nkọwa foto, Ego ndị jị ụgbọala eme njem n'ime stteti dịka Legọs arịala elu

I ji maa atụ, mgbe ewepụrụ mmachị ngagharị n'ime steeti, ndị ọkwaa ụgbọala na-ebubu mmadụ anọ n'oche ma naa ha N300 were si Ajao Estate ruo Obalende kama ma dịka ha tinyere atụmatụ nchekwa coronavirus, ha na-ebuzi mmadụ abụo n'oche ma na-anazị ha N500.

Otu onye na-arụ n'ụlọọrụ na-eji ụgbọala ebu ndị mmadụ site na otu steeti gawa ọzọ kwuru na ha agaghị ebido ọrụ ozugbo tupu ha atule etu ya bụ atụmatụ ga-esi metụta ọrụ ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị