Nigeria lockdown update: Lee usoro ọhụrụ a ga-eji aka ụka maka coronavirus

Ndị ụkọchukwu Anglikan

Ebe foto si, Facebook/Ememanka

Ngalaba Onyeisiala Muhammadu Buharị hiwere maka ọrịa coronavirus a kpọrọ "Presidential Task Force" ewepụtala etu ụlọ ofufe ga-esi eme ofufe dịka ewepụrụ mmachi nnọkọ n'ụlọ ofufe.

Ọ bụ onye na-achịkọta ngalaba a bụ Sani Aliyu wepụtara usoro ndịa a n'ụbọchị Tuzde.

Lee usoro ndịa ebe a

1) Tupu mmadụ abata ụlọ ofufe ọbụla, ha ga-asa aka ha, yiri mkpuchi ihu, nyocha etu ahụ ha sị ekpo ọkụ ma were "Hand Sanitizer" hichaa aka ha.

Ndị na-akwọ aka

Ebe foto si, Getty Images

2) A ga-eme ka ahụ na mmadụ nyere mmadụ ibe ya ohere nke bekee na-akpọ "Social Distancing".

3) A na-adụ ndụmọdụ ka mmadụ hapụ ibi ọma, ịkwe n'aka, isusu ọnụ na mmetụ ahụ ndị ọzọ.

4) Enye kwara ndụmọdụ ka ezinụlo na anọko ọnụ n'ụlọ ụka.

5) Ndị na-arụ ọrụ n'ụlo ụka dịka ndị na-anabata ndị mmadụ (Ushers), ndị na-agụ egwu, na ndị nche bụ ndi nwere ọrịa ọzọ ekwesịghị ị so rụọ ọrụ.

6) Ofufe agaghị akarị otu awa

7) Ụlọ ofufe ndị nwere ọtụtụ mmadụ ga-eke oge ofufe ha iji hụ na mmadụ na mmadụ ibe ya nwere ohere, ma a ga-enyekwa nkeji iri atọ tupu ha ebido ofufe ọzo ka ndị mmadụ nwee ike ịsa aka ha.

8) Ụlọ alakụba ga-enwe nkeji iri abụọ tupu ha ebido ekpere ma mechie nkeji iri abụọ ma ha mee cha ofufe.

9) A gaghị enwezị ụlọ akwụkwọ Islamiya.

10) A ga-eme ka oge ekpere dị nkenke

11) Ụzọ ọpụpụ na nke mbata ga-adị iche n'ụlo ofufe niile

Ndị na-ebi ọma n'ụlọụka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ugbua, ụdị ekele udo ndị a ga-akwụsị iji hụ na e gbochiri mfesasị ọrịa coronavirus n'ụlọụka.

12) Ndị mmadụ agaghị anọkọ n'ezi ma emecha ofufe

13) Ndị na-ere ahịa na mpaghara ụlo ofufe agaghị emepe

14) Ndị okenye rugoro afọ iri ise na ise kwesiri ị nọ n'ụlo mee ofufe nke ha

15) Ulo ọfufe nille ga-agba mbọ hụ na ha na-edebe ebe niile ọcha.

Ndị nọ n'ụlọụka

Ebe foto si, Facebook/Ememanka

Nkọwa foto, Nke a pụtara na ndị mmadụ ga-amalite ịnọpụrụ onwe ha iche n'ime ụlọụka, ihe dịka mmadụ abụọ n'otu ogologo oche.

16) A ga-emepe windo n'ihi na ọ ga mma karịa imechi ebe niile

17) Ofufe emere na mbara ezi kacha mma

18) A ga-ehicha ụlọ ofufe mgbe niile

19) A ga-eji "Bleach" etinyere mmiri ehicha ụlọ ofufe ndi a

Ụkọchukwu na-enye oriri nsọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ajụ sị "Kedu maka oriri nsọ".

20) Ndị na-enwe njirimara ọrịa Covid-19 agaghị a bịa ụlo ofufe

21) Ụlọ ofufe niile ga-edebanye aha ndị ọrụ na ndị niile bịara ofufe

22) Ndị nyocha gosipụtara na ahụ ha dị ọkụ nke ukwu agaghị abata ụlo ofufe

23) Ọ ka mma ị nọ n'ụlo mee ofufe karịa ị ga-ụlọ ofufe

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Naịjirịa amaka