Justice for Uwa: 'A kwụrụ anyị otu nde Naịra iji gbuo Uwa Omozuwa'

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Aka ndị uweojii Edo steeti akparala mmadụ isii a na-enyo n'aka ha dị n'ọnwụ Vera Uwaila Omozuwa, nwa mahadum 'University of Benin.'

Ndị a mabụghị ndị ha bụ wakporo ma gbuo Uwa n'ụlọụka ndị 'Redeemed' dị nso n'ụlọ ha na Bini ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ n'abalị.

Ndị uweojii nwụchiri ma kpụtụta n'ọha; Collins Uligbe,Mary Ade,Nelson Ogbebor,Akato Valentine, Tina Samuel na Nosa Osabohien maka ebubo aka ha ịdị n'ọnwụ nwata nwaanyị ahụ na-agụ 'Microbiology' n'Uniben.

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

Collins Uligbe, onye kwuru na ọ bụ Mary Ade, onye nwe Ulọ ebe bụ sị "Onye nyere anyị otu nde Naijiria iji gbuo Uwa ma were ịchafụ aka fichara ọbara ya ga-enye onye dunyere anyị ọrụ."

Ọ gbakwara akaebe na Oriakụ Ade nyere aha gbuo nwata ahụ n'ihi na okwuru na nwata ahụ bụ ezi nwata, naụlọụka ha na-akpọ ya n'ihe niile ha na-eme.

O kwuru na ọ bụ igwe e ji emenyọ ọkụ(fire extinguisher) ya ya jị kụọ Uwa ugboro ugboro.

Nosa Osabohien bụ onye zụrụ ekwenti Uwa bụ ihe ndị uweojii ji nweta ndị gburu Uwa kwuru na ya zụrụ ekwentị ahụ N17,000.

Cheta na e dinara Uwa n'ike ma kụọ ya ihe hapụrụ ya n'ọnụ ọnwụ n'abalị iri na atọ nke ọnwa Mee, afọ 2020, ebe ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ 'University of Benin Teaching Hospital' n'Abalị iri atọ na otu ọnwa ahụ.

Ngagharịiwe sochiri ọnwụ ya dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa otu ụmụnwaanyị kpọrọ oku ka a chọta ndị gburu ya ma taa ha ahụhụ dịka iwu si dị nke gbalitere mụọ onyeisiala Muhammadu Buhari inye ntuziaka ka a chọta ndị gburu Uwa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka mnwụchie a nwụchiri ndị a

Ụfọdụ ụmụ Naijiria dịka Wendy toro ndị uweojii maka "ike ha kpara."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ụfọdụ nddị ọzọ dịka Omoluabi kpọrọ oku ka ndị uweojii gaa n'ihu kpụpụ ha ụlọikpe.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ụmụnwaanyị Igbo ekwuola ihe ha ji mee ngagharịiwe n'Edo steeti gbasara Uwa Omozuwa

Ndị ngagharịiwe

Ebe foto si, Wacol

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Uwavera

Onyeisi ndị Women Aid Collective (WACOL) bụ Joy Ezeilo ekwuola ihe mere ha jiri buru ngagharịiwe gawa Edo steeti ịdọnyere ezinaụlọ Omozuwa nakwa ụmụnwaanyị niile n'ụwa gbaa gburugburu ukwu maka agha ana ebuso mpụ mwakpo ụmụnwaanyi.

Ezeilo sị na "mwakpo anaghị akpa oke. Ka o si metuta onye ukwu bụ ka o si metuta onye nta".

O sị na ọ bụ maka ya kpatara ha jiri rịọ nkwado ndị Actionaid nakwa nke ndị Canada ka ha nyere ha aka n'iti ya bụ mkpu ka o ruo ụwa ntị.

Ezeilo sị na ọ bụ ndị obiọjọọ butere asịrị imebi aha Uwa site n'ịsị na ya bụ nwaagboghọ butere afọime tupu awakpo ya.

Ọ sị na obi dị ya ụtọ na nchọpụta gosiri na onweghị ime ya bụ nwa dị.

Gee ya ntị n'olu ebe a.

Aha onyonyo, Justice for Uwa: Ụwụnwaanyi Igbo mere ngagharịiwe gbasara Uwa Omozuwa
Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Nna Uwavera gwara BBC okwu mgbe ha gakwuru ya n'ụlọ ha na Benin.

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

Onyeisioche ndị Naịjirịa nọ na mba ofesi bụ Abike Dabiri Erewa depụtara n'akara twitter ya na ndị uweojii nọ n'Edo steeti anwụchiela otu onye a na-eche n'aka ya dị na mwakpo na ogbugbu Vera Uwaila Omosuwa.

O kwuru na onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Edo steeti bụ Chris Nwabuzor kwuru na anwụchiri onye ahụ ka enyochara mbinyeaka a hụrụ n'igwe eji emenyu ọkụ.

BBC Igbo gbaliri ka ha nụta n'ọnụ Chris Nwabuzor mana o bughị ekwenti ya nke o ji azaa ozi anyị zitere ya n'ekwenti.

Ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Uwavera

Ebe foto si, OKWUTE FREDRICK SWANKY

Cheta na ụịmụakwụkwọ apụtala mee ngagharị iwe maka ogbugbu na mwakpo Vera Uwaila Omosuwa.

Otu onye gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ mgbe niile ka na anụ akụkọ maka mwakpo ụmụnwaanyị kama enweghị ihe a na-eme ndị ejidere.

Onye a gara n'ihu na-ajụ "Uwa ọ na-enweta ikpe ziri ezi ka ndị a ha a ga-ala n'efu".

Lee ya ebe a

Aha onyonyo, Emeela ngagharị iwe maka ogbugbu Uwavera n'Edo steeti

Ndi uweojii ekweela nkwa ijide ndị gburu Uwavera

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ga-ezipu ndị nkwado na ihe eji eme nyocha iji chọpụta ndị gburu nwaada Vera Uwaila Omosuwa.

Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na eti mkpụ ma na-ewe iwe maka ogbugbu na mwakpo Uwalia nke mere n'Edo steeti nso nso a.

Onyeisi ndị uweojii katọrọ ya bụ ihe dịka ọ na-eti ezinụlo Uwaila na ndị enyi ya aka n'obi ma kwee ndị mmadụ mkwa na ndị uweojii ga-ejide ndi mere ya bụ arụ n'oge na adịghị anya.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ihe ndị ụka RCCG kwuru

Adeboye na Uwa

Dịka ndị mmadụ na-eti mkpụ na-ebeku gọọmenti maka ịkpe nkwụmọtọ n'isi nwaada Uwavera bụ ndị omekome napụrụ ndụ n'ike ụbọchị Wenezde gara aga, ndị ụka ya bụ Redeem Christian Church of God ekwuola okwu gbasara ya bụ arụ mere n'ogige ha na Benin, Edo steeti.

N'akara Twitter, RCCG sị na ha kagburu ma katọọ ya bụ arụ mere ma na-akpọkụ ndị uweojii ka ha nye aka chọpụta ndị kpara ya bụ arụ.

Uwavera Omozuwa dị afọ iri abụọ na abụọ nwụrụ n'ọdachị e chere na ọ bụ mwakpo n'ike mere n'ụlọụka dị na Benin.

Kedụ ka o si nwụọ?

Nwaane ya nwaanyị bụ Judith gwara BBC news na Uwa bụ onye ka banyere mahadum ọhụrụ a gara ịgụ akwụkwọ n'ụlọụka Redeemed Christian Church of God dị n'akụkụ bee ha mgbe a wakporo ya n'ike.

Aha onyonyo, Justice For Uwa: 'Uwa yi akwa m ụbọchị a wakporo ya n'ụlọụka'

O kwuru na Uwa na-ejekarị ụlọụka ahụ eje agụ akwụkwọ makana ebe juru oyi. Ụbọchị awakporo ya , ọ gara ebe ahụ ịgu akwụkwọ dịka o si eme na mbụ.

O kwuru na ka elekere isi nke mgbede kụchara, otu onye n'aka ụlọụka ahụ kpọrọ nne ya n'ekwenti si ya bịa na ha amaghị ihe mere nwa ya nwaanyị makana ha hụrụ ya n'ikpo ọbara, ebe siketi na ọbante ya dọkara adọka, ọbara juru sheeti ya.

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

N'okwu nwaane ya nwaanyị, a wakporo ya, ọ bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke, o dịnatụbeghị nwoke na mbụ."

Tupu ndị bee ha eruola n'ụlọụka, a gwara ha na ebugala ya ụlọ ọgwụ.

Judith kwuru na ndị ọrụ nchekwa anọghị ya mgbe ihe mberede a mere. " Ọ nọ n'igwe na-enyere ya aka ikute ume n'ụlọọgwụ ụbọchị atọ tupu ọnwụọ."

BBC news gbaliri ịnụta n'ọnụ nne na nna Uwavera mana Judith kwuru na obi mgbawa ekweghị ha ikwunyere onye ọbụla.

"Ihe ha chọrọ bụ ka a chọpụta ndị rụrụ ala a ma ma ha ikpe ruru ha."

Ihe ndị uweojii kwuru maka ọdachị a

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Edo steeti bụ DSP Chidi Nwabuzor gwara BBC na etu ndị mmadụ si ekwu na ọ bụ mwakpo n'ike gburu Uwavera nwere ka ọ dị.

O kwuru na mgbe ọ kpọrọ DPO na-elekọta Ikpoba Hill, ọ gwara ya na ọ bụ ọgụ dapụtara n'etiti Uwa na ndị agboro.

Nwabuzor kwuru na ọgụ ahụ mere n'ime ụlọụka tupu akpọrọ ya gawa ụlọ ọgwụ ebe ọ nọ nwụ mana DPO kwuru na ọ ga-ewetere ya akụkọ zuruoke ka ya bụ ihe si mee nke o na-eche ka ewetere ya.

O kwuru na ha na-ahụ ya bụ ọdachị dịka nke ọgụ butere.

Soshal midia nwuru ọkụ maka akụkọ a

Kamgbe akụkọ a pụtachara, Justice For Uwa na-ewu.

@Ebuka kwuru na ya bụ akụkọ na-agbawa obi nke ukwuu.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

@ozzyetomi kwuru na udiri ihe a ekwesighị ime Uwa.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

A na-ekwu ka a na-ekwu ndị ụka Redeemed Christian Church of God, RCCG, dee n'akara Twitter n'ehihie Satọde a, na-arịọ ka ndị mmadụ kpewere onyeisi ha bụ Pastor Adeboye ekpere.

RCCG

Ebe foto si, Chris Okereke

Nkọwa foto, Twitter/RCCG

Ya bụ okwu atọghị ndị mmadụ ọchị ma ọlị.

Ha gosiri nke a site na-ịwụ ha ọnụ na-asị na ha ekwesighị ịde ihe dị otu ahụ ebe e gburu onye otu ha n'ime ụlọụka ha.

N'obi ha ndị ụlọụka a kwesiri ide maọbụ kpọọ oku maka ikpe nkwụmọtọ n'isi nwaagbọghọ a anapụrụ ndụ n'ike, karịa ikwuwe okwu onyeisi ha dịka #JusticeForUwa na-ewu kemgbe ụtụtụ .

Leekwe ụdị ihe ha dere ebe a.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

Skip X post, 8

End of X post, 8

Akụkọ ndị ga-amasị gị: