COZA Pastor: Biodun Fatoyinbo azaghị oku anyị kpọrọ ya bịa kwuo ọnụ ya - PFN

Ebe foto si, Busola Dakolo/Fatoyinbo/ BBC
Otu jịkọrọ ndị ụka ọgbara ọhụrụ na Naijiria nke a kpọrọ Pentecostal Fellowship of Nigeria, PFN, n'aha ịchafụ agbaala ama na ha enweghị ikpe ibi okwu banyere ebubo mwakpo n'ike e boro Pastọ Biodun Fatoyinbo.
Aha Biodun Fatoyinbo wuru ewu na Naijiria ọnwa ole na ole gara aga dịka Busola Dakolo, nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo boro ya ebubo na ọ wakporo ya oge ọ bụ nwata nwaagbogho ọtụtụ afọ gara aga.
Onyeisi PFN hiweburu kọmitii iji lebanye anya iji mara ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ otu ọnwa gara aga.
Mana dịka otu onye ndu komiti ahụ bụ Bishop Emma si kwuo na mkparịtaụka kọmitii ahụ na ndị ntaakụkọ nwere na Legọs ụbọchị tọzde, PFN enweghị ike ichịkọta ya bụ okwu.
"Anyị enweghị ike ịchịkọta okwu n'ikpe ahụ n'ihi na otu onye na ndị o metụtara bụ Pastọ Fatoyinbo azaghị oku niile a kpọrọ ya bịa kwuru ọnụ ya."
"Mana anyị na-ekele Oriakụ Dakolo onye ya na di ya so bịara kwuo ihe mere ya n'olu arịrị."
Akụkọ ga-amasị gị:





