Poju Oyemade arịọla ụmụ Naịjirịa mgbaghara

Ebe foto si, @busoladakolo/ @pastorpoju/@BidounFatoyinbo
Onye nchịkọta ụka "Covenant Christian Centre" bụ Poju Oyemade arịọla ụmụ Naịjirịa mgbaghara.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Oyemade kwuru ka ha gbara ndị ụka ọgbara ọhụrụ ụzọ ọbụla ụka ahụ si go meruo onye ọbụla n'ekpere Chukwu n'ụlọụka ha.
O mere nkeaa Biodun Fatoyinbo eboro ebubo ikwaso nwaanyi iko n'ike rịtuchara n'ọkwa ya dịka onyeisi nchuaja 'Common Wealth of Zion Assembly' akpọrọ COZA n'ịchafụ.
Cheta na Biodun Fatoyinbo rituru n'ọkwa dịka onyeisi nchuaja ụlọụka ya taa bụ ụbọchị July nke mbụ.
Fatoyinbo depụtara nkea n'akara instagram ya.

Ebe foto si, @Biodun Fatoyinbo
Lee ihe o depụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Nke a na-eme dịka otu akpọrọ #churchtoo nakwa ndị Naịjirịa mere ngagharịwe n'ụlọụka COZA dị na Naịjirịa ụnyahụ iji gwa Fatoyinbo ya rituo n'ọkwa ka ebochara ya ebubo ikwaso nwaanyị iko n'ike.

Onyeisi otu a bụ Bukky Shonibare kwuru na ya na ndị otu ya ga-akwụ n'ahịrị ga n'ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ ebe a na-enweta ikpe kwụ ọtọ.
Cheta na nwunye ọgụ egwu ama ama bụ Timi Dakolo boro ya ebubo na ọ kwasoro ya iko n'ike ,mana Fatoyinbo kwuru na ọ kwasotubeghị onye ọbụla iko na ndụ ya.
Onyeisi 'Common Wealth of Zion Assembly' akpọrọ COZA n'ichafu bụ Biodun Fatoyinbo arịọla ndị otu ya ha tinye mma n'ọbọ gbasara ebubo ikwaso nwaanyi iko n'ike eboro ya.

Ụkọchukwu Fatoyinbo onye pụtara ka akachara ụka taa gwara ndị otu ya ha awakpola onye ọbụla.
Etu ọ dị ugbua akagbụola ọgbakọ "Seven nights of glory" nke ekwesiri ime n'ụbọchị ọnwa nke mbụ na-abịanụ.

Ndị ọrụ nchekwa na-egbochi ndị mmadụ ime ngagharị iwe n'ihu ụlọụka COZA dị n'Abuja maka ebubo eboro ukọchukwu Bidoun Fatoyinbo na o kwasoro Busola Dakolo iko n'ike.
Ọtụtụ mmadụ zukọkwara n'ihu ụlọụka COZA dị na Legos na-emekwa ngagharị iwe.
Ndị ntaakụkọ BBC kwuru na ndị agha, ndị uweojii, ndị ọrụ 'Civil Defence' nakwa ndị nke DSS kwụchiri ụzọ iji gbochie ndị mmadụ ibanye n'ime ụlọụka ahụ dị n'Abụja.
Na Abuja, lee ụfọdụ foto ndị ntaakụkọ anyị setere na COZA

Ụmụnwaanyị pụtara n'uju.

Ihe Timi Dakolo gwara BBC Igbo

Ebe foto si, @timidakolo
Timi Dakolo bụ dị Busola na-ebo Fatoyinbo ebubo ikwaso iko n'ike ekweghị agwa BBC Igbo ihe ọbụla .
Anyị gbara mbọ ịjụpụta ya ihe o chere maka etu ụmụ Naịjirịa si buru okwu a n'isi mana ọ gwara anyị na ọkaiwu ya gwara ya ya azala ajụjụ ọnụ ọbụla.
N'ọnụ ya, oge ruo, m ga-ekwu okwu.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ ruru anyị nti kwukwara na onwere ndị otu ọzọ biakwara ebe ahụ igosi nkwado ha maka ụkọchukwu Fatoyinbo.

Ndị mmadụ na-eme ngagharịwe na Mobolaji Bank Anthony dị n'Ikeja.

Ndị ọrụ nchekwa kwụ chim n'ihu ụlọụka ahụ na-enyocha ndị bịara ika ụka.

Agbanyeghị na ihu igwe adịghị mma, ndị mmadụ nọ na-emekwa ngagharịwe ha.

Dịka ndị mmadụ ka na-eme ngagharịwe a, cheta na onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyinbo depụtara n'akara soshal midia ya na ọ kwasotubeghị nwaanyị iko n'ike mbụ.
@queeninghere gosipụtara ebe ndị ọrụ nchekwa na-egbochi ndị na-eme ngagharịwe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana Busola nwunye ọgụ egwu ama ama bụ Timi Dakolo na-ekwusi ike na Fatoyinbo wakporo ya n'ike.
Akụkọ ka na-abịa.









