Ghana arrests Nigerian professor : Ihe onyonyo etinyela ọkammụta Prof Austin Nwagbara na nsogbu?

Austin Nwagbara

Ebe foto si, Austin Nwagbara/Linkedin

Nkọwa foto, Austin Nwagbara bụ onyenkuzi na mahadum, University of Lagos gara ezumike nkuzi 'Sabbatical' na mahadum, University of Ghana

Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naijiria bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi ekwuola na ihe onye ọkammụta Naijiria bụ Austin Nwagbara kwuru maka agụmakwụkwọ Ghana abụghị ikwuwa ọnụ kama ọ bụ okwu dịka ọkachamara.

Inwe ịfụnanya nye ala nna ya tinyere Ọkammụta Austin Nwagbara bụ onyenkuzi na mahadum nke Lagos, gara nkuzi ezumike (Sabbatical) na mahadum nke Gana na nsogbu n'ihi okwu a na-ebo ya na o kwuru.

Nwagbara danyere na mmiri ọkụ n'aka mahadum Gana ebe ọ gara ọrụ nkuszi otu afọ (sabatical) ka ihe onyonyo pụtara ebe ọ na-agwa ọgbakọ ndị e chere bụ ndị Naijiria okwu, na-ekwu na agụmakwụkwọ Naijiria ka nke Gana mma.

N'ihe onyonyo ahụ nke na-efegharị na soshal midia, Nwagbara kwuru na ndị Naijiria ka nwee ndị ka mara ihe a na-ekwu na agụmakwụkwọ karịa ndị ogbo ha ndị Gana dịka o kwukwara n'mahadum nke Naijiria nwere ebu nwee mfụ karia ha.

Okwu ahụ mere ka mahadum Gana gbakụta ya azụ ma mee ka ndị uweojii mba ahụ nwuchie ya, ma mechaa tọhapụ ya.

Ọkammụta Biodun Ogunyemi

Ebe foto si, Biodun Ogunyemi

Nkọwa foto, Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naijiria bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi

Mana na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naijiria bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'okwu Nwagbara kwuru nke na ndị Ghana ga-akpaso ya ụdị agwa ha kpasoro ya.

"Anyị echeghị na ọkammụta ahụ kwuru ihe karịrị ọnụ ya dịka onye ọkacha mara.

"Obi adịghị anyị mma etu ndị ike dị na aka na mba Ghana si soo ya bụ okwu.

"Ebe ọbụla ndị ọkammụta anyị gara n'Afrịka, o kwesịrị ka a kwanyere ha ugwu dịrị ha.

"Ndị ọkammụta Naijiria kwesịkwara ịkwanyere ogbo ha ndị mba ọzọ ugwu."

Cheta na otu ASUU nke University of Lagos dọpụrụ mba Ghana aka na ntị sị na ha achọghị ịnụ na mmiri bara ntị Ọkammụta Nwagbara.

Akụkọ ga-amasị gị: