Ebonyi State University : A chụọla ndị nkuzi karịrị 60 n'ọrụ n'ihi ịkpụ asambodo, arụrụ ndị ọzọ

Ebe foto si, EBSU website
Otu onye nkuzi Mahadum Ebonyi steeti agbala ama na otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum bụ ASUU ga-elebanye anya n'okwu ndị nkuzi a chụrụ n'ụlọakwụkwọ ha.
Ebonyi State University chụrụ ndị nkuzi dị 63 maka ebubo ịkpụ asambodo, ịrịọ ụmụakwụkwọ ndịna na ego a mmanye, na ịda iwu ndị ọzọ.
Ozi si mahadum ahụ na-ekwu na ọtụtụ ndị a chụrụ n'ọrụ bụ ndị nwetara asamboddo sekọndrị tupu ha nweta nke Praịmarị.
Ọchụchụ a na-eso nyocha nke mahadum ahụ nyochara ndị ọrụ ha n'etiti afọ a. Ha tụkwara asị afọ ha ma kpụkwa asambodo ha.
Otu onye nkuzi a chọghị ka akpọ aha ya, gwara BBC na akụkọ ahụ bụ eziokwu mana o kwuru na o nweghị onye nkuzi nọ na ngalabaya o metụtara.
O kwuru na dịka otu jịkọrọ ndị nkuzi nke a kpọrọ ASUU n'aha ịchafụ agbakọbeghị maka ihe mere n'ihi abụbụọrụ ndị nzuki mahadum Naijiria.
"Mana ha gwara ndị o metụtara ka ha zitere ha akwụkwọ e jiri chụọ ha n'ọrụ ka ha lebanye ha anya n'otu n'otu."






