2019 Elections: Ndigbo e nwere ọnụ okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Lagos?

Babajide Sanwo-olu na Solomon Adeola

Dika 2019 tụnyerela n'ụkwụ, ndị na-azo ọkwa ọchịchị na Legọs steeti tinyere anya na mmiri were na-achọ ihu Ndigbo site n'achụmnta vootu ha.

I legharịa anya, ị hụ na ọtụtụ ha na-eyi akwa isiagụ aga mmemme dị mkpa, ebe ụfọdụ yi ya mee ozi achụmta vootu ha.

Otu onye ọrụ mgbasaozi achụmnta vootu nke Babajide Sanwo-Olu bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ na Legọs steeti bu Gboyega Akosile gwara BBC Igbo

na ihe mere ha jiri tinye Ndigbo n'obi n' ozi achụmnta vootu ha bụ na ''Ndigbo adika mkpa mmadụ ịgba nkịtị n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Legọs."

Babajide Sanwo-olu

Ebe foto si, BBC Igbo

Otu onye Igbo ọnụ na-eru n'okwu bụ Goddy Uwazuruike kwuru na ndị na-eme Ndigbo 'mụ na gị nọ' bụ n'ihi na Ndigbo nwere ọnụọgụgụ.

Uwazuruike, onye bụbu onyeisi otu Aka Ikenga, si: "Onye ọbụla kpọrọ Ndigbo asị si na ọ gaghị echeta ha n'oge ntuliaka bụ onye amaghị ihe n'ihi na Ndigbo nwere ọnụọgụgụ."

Ọ tụrụ arịrị sị na ọ bụ "naani na ntuliaka ka a na-echeta Ndigbo ma na Legọs ma n'etiti."

Ndigbo

Ebe foto si, Getty Images

Onye mere Ndigbo agbgh okoroba niile na-ach?

Nke a bụghị mbụ a na-achọ ihu Ndigbo n'okwu ndọrọndọrọ Legọs.

Lee ihe isii na-atu aka na nke a:

1. Ndigbo bi na Legos bara ba ka mkprgbaka

Ọchịchị onyekwuoucheya bụ egwu onye ka n'ọnụọgụgụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na Ndigbo bi na Legọs karịrị pasent iri atọ n'ime mmadu ruru nde 20 bi na Legọs.

Buhari na Jonathan

Ebe foto si, Getty Images

2. Na Ntuliaka 2015, na Legos, Muhammadu Buhari , onye zoro okwaonyeisiala n'aha APC jiri naani 160,133 (vootu 792,460) karia

Goodluck Jonathan nke PDP ,onye nwetara vootu 632,327. Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ nkwado Ndigbo nyere otu PDP mere ka vootu Jonathan gbalite.

3 .N'afọ 2015, Ndigbo at nwetara oherenchitempaghara Legos fd n'lomeiwu nke etiti nakwa nke Legs steeti nke gosikwara na onye gbara Igbo nkịtị bkpala okpoko gburu.

Rita Orji(Ajeromi-Ifelodun) na Tony Nwulu (Oshodi- Isolo) n'ụlọomeiwu nke etiti n'aha PDP, ebe Jude Idimogu(Oshodi/Isolo) nwetara n'ụlọomeiwu nke Legọs.

4. Ịhụta Ndigbo dika 'ọbịara-mba-kpara ala' mere Eze Legos, Oba Rilwan Akiolu, ji majaa Ndigbo na 2015 si ha tụnyere Akinnwumi Ambode nke APC, emeghi otu a, a tụba ha na mmiri.

Mana o mechara ọ rịọ mgbaaghara.

Rita Orji na Tony Nwulu

Ebe foto si, Rita Orji on Facebook/NASS

5. Iji nye Ndigbo mụọ na ha sokwa n'ihe a na-eme mere ka gọọmentLegos ji nye ụfọdụmafo Igbo kwa ọchịchị

Ndị dịka Joe Igbokwe, ọnụ na-ekwuru APC na Legọs nakwa Ben Akabueze, onye bụbu Kọmishọna mkpata na mmefu ego.

6. N'oge Zik, oge pati NCNC chị ọgbọ, ụfọdụ Ndigbo meriri na ntuliaka na Legọs.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: