IPOB agbahapụla Nnia Nwodo na Ben Nwabueze

Ebe foto si, Getty Images
Ipob si na nzụkọ ehibere n'etiti ha na otu NdiIgbo ndị ọzọ pụọ ụnyaaahụ.
Na nzụkọ ahụ, ha kwuru na sọsọ ihe ga-ebute udo n'etiti ha na gọvanọ ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ ịwepu aha ọjọọ akpọrọ Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu.
Ihe ọzọ Ipob kwuru bụ na ha chọrọ nkwụsị mmegbu ndị otu ha dịka ndị dara iwu ala nakwa ịkwụ ndi otu ha nwụrụ n'egwu eke nke ndị agha Naịjirịa ụgwọ itiaka n'obi.
Ha kwuru ihe ndị a na nzụkọ ahụ mere n'Atani bụ ụlọ Ben Nwabueze so n'otu 'Igbo Leaders of Thought' dịka ụlọ ntaakụkọ Guardian siri kwuo.
A na-anụ kepu kepu na nzụkọ a gwụrụ n'ọgbaaghara ebe ndị Ipob ji iwe pụọ na nzụkọ ahụ.

Ebe foto si, Enugu STate Police / Twitter
Lee ebe Radio Biafra kwuputara ya n'akara soshal midia ha na nke a mere n'ezie.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana a na-anụ na ndị Ipob, Ohaneze Ndịgbo nakwa gọvanọ dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ ga-enwe nzụkọ ọzọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa ọgọst.




