Mbaka: Ụka katọlik amachiela ndị ụkọchukwu ịtinye ọnụ n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị
Akụkọ na-ewu na mgbede a
Ụka katọlik enwuchiela ọkwụ mgbasara ndọrọ ndọro

Ebe foto si, @NGRPresident
Ụka katọlik amachiela ndị ụkọchukwu ịtinye ọnụ n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Nke ana-eme dịka okwu gbasara ihe Fada Ejike Mbaka bụ onye nchịkọta Adoration Ministri, Enugwu gwara Peter Obi mụrụ ọkụ n'ọnụ kemgbe mbido izuụka a.
Buhari juru itinye aka n'akwụkwọ ịmegharị usoro ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images
Ozi na-eru anyị ntị taa na-ekwu na Onyeisiala Muhammadu Buharị ajụla itinye aka na-akwụkwọ iwu bụ nke a chọrọ iji hazigharịa usoro e ji eme ntuliaka na Naịjirịa.

N'ofesi, ndị ojiegbe ezu gburu mmadụ ise gụnyere otu nwata so na ndị ha jichiri ebe ha gara ohi na ụlọakụ abụọ na ugwu ndịda anyanwụ mba Brazil.

Ebe foto si, WHO
World Health Organisation akpọpụtala mba Afrika dị ka ebe ọnwụ mberede okporoụzọ kacha egbu mmadụ.
Akwụkwọ a ha dere na-akọwa na ihe karịrị mmadụ iri abụọ na isi (26) n'ime otu narị mmadụ na-anwụ bụ bụ ndị anaghị eso usoro iwu gbasara ịnya ụgbọala nke UN biputara.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, ndị Arsenal ekwuola na a ga-adọ Aubameyang, Ozil, Lacazette na Matteo Guendouzi bụ ndị e jidere na-ese anwụrụ n'eme ka mmadụ chịa ọchị bụ Nitrous oxide aka na ntị.
Nkeji
Egwu ogbunigwe n'ụlọọrụ CNN

Ebe foto si, Reuters
Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ CNN gbara ọsọ ndụ taa ka ha nụrụ kepu kepu na ogbunigwe dị na ụlọọrụ ha.
Onye ntaakụkọ CNN aha ya bụ Don Lemon dere na akara Twitter ya na ọ bụ ka ha na-ahazi emume ya ka ozi a batara, nke mere ha jiri gba ukwu ahụ ala.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nke a ga bụ ugboro abụo n'afọ a CNN na hụ ụdiri ihe a, mana ndi uweojii si na ha na lebaga anya na ya bu ihe.
Fuel Subsidy

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naịjirịa na ndị aka ha dị na atụmatụ Bekee kpọrọ Fuel Subsidy enwerela nkwekọrịta.
Nkwekọrịta a metutara etu a ga-esi kwụọ ha ijiri naira nari itoolu eji ha kemgbe afọ ato gara aga.
Cheta na ndị Depot and Petroleum Products Marketers Association na Independent Petroleum Products Importers Association gbaara gọọmentị ama na ha ga-achịsa mma na ọgụ ma ya bụru na ego eji ha erụghi ha aka.
Nzukọ FEC

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadụ Buhari na ndị ya na ha na-achi Naịjieịa ga-ezute n'Abuja taa na nzukọ Federal Executive Council.
Nzukọ nke taa bụ nke ọpụrụiche ha chọrọ iji tinye ọnụ na ihe banyere bọjị̄tị nke 2019.
N'ihe nkiri

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-ahazị ihe ntụrụ ugo a na-enye ndị aka ha dị n'ihe nkiri akpọrọ Golden Globe Awards na Bekee ewepụtara aha ndị ga-eso zuo ntụru ugo ahụ nke afọ a.
Ihe nkiri Black Panther, na Black klansman bụ ihe nkiri ndị isi ojii pụtara ọfụma so n'ime ha.
Ihe nkiri nke taa











