AFCON 2019: Lee 'ụmụanụmanụ' ga-achịpụ ya n'asọmpi AFCON 2019

Otu egwu bọọlụ Afrịka na anụmanụ e ji mara aha.
Nkọwa foto, Ebe a ma ụfọdụ ụmụanụmanụ a ka ndị na-akpa ike, ndị nke ọzọ bụ ndị a ma maka ịdị nwaayọ
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ọ bụ ụmụanụmanụ, kpakpando na ndịagha ga-achịpụ ya na mba Pharoah dịka asọmpi Iko mba Afrịka nke ugboro 32 ga-ebiri ọkụ.

Isi akụkọ bụ na ọtụtụ n'ime mba 24 na-azọ Iko mba Afrịka nke afọ a nwere aha e ji mara ha nke bụ aha ụmụanụmanụ.

Ugbua, n'agbanyeghi na e nwere ọtụtụ ọdụm n'Afrịka ndị dịka Ọdụm nke Atlas na Ọdụm nke Teranga mana Ọdụm nke Indomitable ka bụ eze nwe ọhịa.

Aha otutu abụghị naanị maka ịkpa ọchị n'egwuruegwu bọọlụ kama ọ bụ ihe dị oke mkpa n'egwuregwu bọọlụ Afrịka tinyere nmuke ndị nkwado na ịgba ha na-eti.

Aha otutu nke otu egwu bọọlụ bụ oke ihe nye mba Afrịka, ọ bụghị naanị na ọ bụ ihe njirimara nye ndị nkwado ha kama ọ na-akwalite mmụọ ndị ọgba bọọlụ.

Lee 'Ụmụanụmanụ' ndị a

Ụmụanụmanụ pụtara ihe n'aha ọtụtụ otu egwuregwu bọọlụ tozuru oke n'AFCON nke afọ a, ọkachasị ugo.

Naịjirịa - bụ ndị e ji uwe agwa ndụndụ mara mana aha otutu ha - NnukwuUgo bụ nke ka ada ụda. Aha otutu a si n'ugo dị na njirimara Naịjirịa, na mbụ ha na-aza 'Green Eagles'.

Mal - aha e ji mara ha bụ Ugo ebe Tunisịa na-aza Ugo nke Carthage makana ugo bụ otu n'ime ihe gbapụtara ihe e ji mara mmepeanya ndị 'Carthage'.

Chekeleke nkeUganda bụ mba ọzọ so n'AFCON 2019 nke aha otutu ha bụ nnụnụ a.

Otu egwu bọọlụ Afrịka ji ndị ji Ọdụm mere aha otutu ha.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Ivory Coast na-aza 'Enyi'

Agha ụmụanụmanụ n'ime oke ọhịa

Ebe mba ndị nọ na mpaghara Yurop na-azakarị aha otutu site n'agwa uwe egwuregwu bọolụ ha, ndị nke Afrịka na-aza nke ụmụanụmanụ nọ n'oke ọhịa.

Site n'ọdụm ruo agwọ, agụ ruo enyi, ha niile 'gbara kasa' n'asọmpi AFCON nke afọ 2019 a.

  • Kamerun - Ha bụ ndị 'Indomitable Lions': Aha na-arụrụ ha nnukwu ọrụ maka ụdịrị ike ha siri nakwa maka etu ha si bụrụ ndị burula iko asọmpi a ugboro ise; ha bụkwa ndị buru nke ikpeazụ a gbara.
  • Moroko - Atlas Lions: Ha bụkwa ndị nwere ọdụm n'aha ha. Ha buliri iko a n'afọ 1976.
  • Aịvọrị Kost- The Elephants: Nke a bụ aha otutu ndị mba Cote D'Ivoire maka ọrụ ha rụrụ n'orire "ivory" n'oge '19th senchuri'.
  • Sịnịgal - Teranga Lions: Naanị ha bụ ọdụm nke hụrụla ala eze ghara ịbanye. N'afọ 2002, ha ruru agba ikpeazụ, mana ọdụm Kamerun gbawara ha aka napụta ha iko.
  • Bene Repọblik - Squirrels: Ndị a na-aza "ọsa" n'olu Igbo. Ha bụ "anụmanụ" pekarịchara n'ọnụọgụgụ a.
  • Angola - Palancas Negras: Aha ha pụtara 'Giant Antelopes' bụ nnukwu mgbada n'olu Igbo.
  • DR Kongo - Leopards: Dịka e si mara agụ dịka anụmanụ mba ha, ọ bụkwa ihe e sere n'akara e ji mara obodo ha.
  • Ọljiria - Fennec Foxes: E ji nkịta ọhịa nke Fennec mara otu egwuregwu ha.
  • Guinea - Bissau - The Djurtus: Nke a pụtara nkịta ọhịa bụ aha e ji mara ha.
Pharaohs of Egypt

Ebe foto si, Getty Images

Afrịka na-akwanyere ndị Eze, ndị Agha na Kpakpando ugwu

Ụmụnwoke siri ike na ndị Eze na-amasị ndị Afrịka, ya mere e ji baa ụfọdụ otu egwuregwu ndị a aha ha.

A ma Ijipt dịka 'Pharaohs'; njirimara mmepụta obodo nakwa ọchịchị Eze, nke gosiri na ha bụ "Igwe na-achị Afrịka" maka etu ha si bụrụ ndị kacha buo Iko AFCON (ha ebuola ya ugboro asaa).

Mohamed Salah bụ onye na-agbara mba ha bọọlụ bụ Ọkacha agba nke CAF na BBC nke afọ a.

Ndị 'Warriors' nke mba Zimbabwega-anwa ike ha dịka ha ga-ezute ndị Eze nke Ijipt n'ime egwuregwu bụ nke e ji emepe asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ a.

E jikwa akara igwe mara ụfọdụ mba

Ihe ọzọ na-ewu ewu na mpaghara Afrịka bụ ndị na-aza aha akara igwe.

A ma ndị nke mba Kenya dịka 'Harambee Stars'- Harambee n'asụsụ Swahili bụ olumba ha, pụtara "ịdọkọta ọnụ", aha otutu na-akpọku mba ha na otu egwuregwu ha ka ha nwee otu obi.

A ma otu egwuregwu ndị Ghana dịka 'Black Stars' maka agwa kpakpando dị n'ọkọlọtọ mba ha, nke bụ nke ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ kwenyere ga-eme ka ndịnotu bawanye.

Ngwanụ ka asọmpi biri ọkụ.

Kedụ ndị ị chọrọ ka ha merie? Họrọ ebe a: Iko Mba Afrịka 2019: Họọrọ ndị i che ga-agwọ ibe ha ka abacha

Aha onyonyo, Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ