Kelechi Iheanacho: Nna m achọbụghị iji ntị anụ na m na-agba bọọlụ

Aha onyonyo, Kelechi Iheanacho: Nna m achọbụghị iji ntị anụ na m na-agba bọọlụ

Kelechi Iheanacho na-agbara Naịjirịa bọọlụ akọwala ihe ọ gabigara n'aka nne na nna ya mgbe ọ na-amalite ịgba bọọlụ.

Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo, Iheanacho sị na na mbụ, nna ya akadoghị ka ọ gbaa bọọlụ.

Mana ugbu a, obi ụtọ na-eme nna ya n'ihi na ọ bụ onye ama ama n'egwuregwu bọọlụ.

Ọ zarakwara ajụjụ banyere alụmnwaanyị ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo

Kirizie ajụjụ ya ebe a.