FAAN: Lee ihe coronavirus ga-agbanwe ma e bido njem ụgbọelu

Ụgbọelu tọgbọ chakoo

Ebe foto si, Reuters

Dịka ụwa niile na ọrịa coronavirus na ama aka, ọtụtụ ihe nke gụnyere njem ụgbọelu so na ihe gọọmentị machiri maka igbochi mfesa coronavirus.

Kama dịka ọ dị ugbua, gọọmentị na-eme njikere ịwepụ mmachị amachiri njem ụgbọelu.

Onyeisi na-ahụ maka mmekọ na-etiti ụlọọrụ nke ngalaba na-ahụ maka ọdọ ụgbọelu bụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) aha ya bụ Henrietta Yakubu zara ụfọdụ ajụjụ na ụfọdụ ihe ndị mmadụ chọrọ ị ma maka njem ụgbọelụ n'oge a.

Ọ dị kwa mma ka ndị mmadụ buru n'obi na gọọmentị ewepụtabeghị akwụkwọ usoro a ga-eji bido njem ụgbọelu n'oge coronavirus a.

Lee ka Yakubu siri zaa anyị

Maka ego njem ụgbọelụ

Henrietta Yakubu kwuru na ọ chere na ndị ụlọọrụ na-eme njem ụgbọelu nwereike ibuli ego njem ụgbọelu ha.

Ọ kwuru na ọ na-atụanya na ụlọorụ ndị a ga-eme nke a iji beleta ibu arụ ha ga-ebu dịka usoro nnọpụ iche ha ga-eme.

Nke a pụtara na aga-enwe ohere na-etiti oche n'ụgbọelu.

Yakubu na-eche na ụlọọrụ ụgbọelu nwereike ibuli ụgwọ njem ha maka nke a.

Ọnọdụ ndị mmadụ n'ọdọụgbọelu

Usoro njem ụgbọelu ga-agbanwe

Ebe foto si, Getty Images

Henrietta kwuru na ndị mmadụ ga-enye onwe ha ohere mgbe ha kwụ ọtọ ma mgbe ha nọ ọdụ oge niile.

O kwuru si " Ebe dịka ogige ndị na-apụ apụ, anyị ga-ewepụ ụfọdụ oche nke ga eme ka ohere dị n'etiti ndị mmadụ".

Oge e ji abanye ụgbọelu

Henrietta Yakubu kọwara na ọ dị mkpa ka onye chọrọ ịme njem ụgbọelu bịa ọdọ ụgbọelu ihe dịka awa atọ tupu ụgbọelu ya efepụ.

Yakubu kwuru sị "Anyi ga-eme ọtụtụ nyocha maka ahụike, nke gụnyere igbu nje nwereike ị nọ n'akpa mmadụ. Ihe ndịa ga-ewe ọtụtụ oge nke mere na ọ dị mkpa ka ọnye ụgbọelu ya ga-apụ ihe dika elkere iri ka ọ bịa ọdọ ụgbọelu n'ihe dịka elekere asaa".

Ịzụta akwụkwọ njem(Ticket) na "Check-in"

Ndị njem ụgbọelu

Yakubu kwuru na ọ na-adụ mmadụ niile ndụmọdụ ka ha gaa n'intaneti zụta akwụkwọ njem ha ma mee kwa nke a na-akpọ "Check-in" n'okwu bekee n'otu ebe ahụ.

Ọ kọwara na nke a ga-eme ka oge mmadụ ga-anọ n'ọdọ ụgbọelu tupu ofepụ pee mpe ma dịkwara onye ahụ mfe.

Enweghị onye ga-edu mmadụ bata

Ndị njem
Nkọwa foto, Ndị njem tọrọ na ọdọụgbọelu Muritala Muhammed nke abụọ (MM2) dịka ndị otu ọrụ ụgbọelu kpọchiri ebe niile

Henrietta kọwakwara na ha agaghị ekwe ga ndị mmadu duru mmadụ ọzọ bata n'ọdọ ugbọelu.

Ọ kwuru na ndị nọ n'ọkwa maọbụ ndị ọzo yiri ha agaghị akpọ ndị na-eso ha bata n'ọdọ ụgbọelu.

Ọ kọwara na FAAN nwere ihe ha na-akpọ "Passenger Support System".

Yakubu kwuru na "Passenger Support System" bụ usoro ha ji ahụ na ndị mmadụ ọkachasị ndị nọ n'ọkwa nwetere enyem aka niile ha chọrọ mgbe ha na-eme njem.

Kama o kwuru sị na tupu amachie njem ụgbọelu, na ha ebidola usoro nchekwa dị iche iche nke gunyere ị bịa n'oge, ihicha ụgbọelu ha, inyocha ndị mmadụ nke ọma na ihe ndị ọzọ.

Ihe ndị ụlọọrụ DANA Air nwere ikwu

Aha onyonyo, Female Pilot: O nweghị ihe ọzọ m kaara ịme karịa ịnya ụgbọelụ

Onye na-ahụ maka mmekọ n'etiti ụlọorụ nke ndị Dana Air bụ Kingsley Ezenwa gwara BBCIgbo na ha na-eche ka gọọmentị wepụta usoro ọhụrụ a ga-eji eme njem ụgbọelu.

Ezenwa kwuru na nyocha ndị ngalaba jịkọrọ ha bụ "International Air Transport Association" (IATA) mere chopụtara na ikuku na-adị n'ụgbọelu kacha a dị ọcha ma sịkwa na o siri ike mmadụ ibute ọrịa coronavirus na njem ụgbọelu.

Kama o kwuru sị na tupu amachie njem ụgbọelu, na ha ebidola usoro nchekwa dị iche iche nke gunyere ị bịa n'oge, ihicha ụgbọelu ha, inyocha ndị mmadụ nke ọma na ihe ndị ọzọ.

O kwukwara na otu ihe ndị mmadụ amaghi bu na ikuku na-adị n'ụgbọelu na-adị ọcha n'eziokwu.

Ezenwa kwuru sị "Anyị amabeghị ma anyị a ga-ebuli ego ụgbọelu anyị maka na anyị ga-ebu ụzọ bido tupu anyị atule ma anyị a ga-ebuli ya".

Ọ kọwara sị " Anyị kwuburu na anyị ga-ewepụ oche nke etiti kama ngalaba na-achịkọta ụlọọrụ ụgbọelu bụ IATA gwara anyị na ọ gaghị enwe isi n'ihi ego ọ ga-efu.

Kama nchekwa ndị nọ n'ụgbọala anyị dị anyị mkpa, anyị ga-atule ya otu izuụka maọbụ abụọ ma na-echekwa usoro gọọmentị ga-ewepụta".

Ezenwa kwuru na ndị mmadụ nwereike iji intaneti zụta akwụkwọ nJem ha ma mee kwa "Check-in" tupu ha abịawa ọdọ ụgbọelu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: