Akanu Ibiam Airport: Lee ihe minista njem hụtara maka ya bụ ọrụ

Ebe foto si, FAAN
Minista na ahụ maka njem ụgbọleụ bụ Hadi Sirikana ndị ọrụ ya gara njem nleta na ọdọụgbụelụ Akanu Ibiam n'Engwu taa bụ Tọzde ịmata ka ọrụ sị aga na ya bụ ebe ahụ.
Lee ga ya bụ nyocha siri gaa

Ebe foto si, FAAN






South East: South East Development Commission ọ ga-apụta ihe?

Ebe foto si, Twitter/Nass
Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itinye ọnụ n' okwu gbasara ihiwe ngalaba puruiche maka ọwụwa-Anyanwu a 'kpọrọ South East Development commission.'
Ndị Ụlọmeeiwu si ọnwụ wanya kwadoro akwụkwọ iwu a nke Stella Oduah nke Anambra Nọt tinyere si na ọ ga-enye aka maka mmepe ala Igbo niile.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Okporoụzọ Enugwu gara Onicha

Gọọmenti etiti amapụtala ijeri naịra iri abụọ na itoolu na uma maka ịrụgharị okporo ụzọ awarawara sị Onitsha gawa Enugwu.
Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola sị na- anapuru ndị ọrụ ngo mbụ ji ya bụ ọrụ maka amaghị eme ha.
Saụt Sudan

Ebe foto si, Reuters
N'Afrika, a turu anya na mba Saụt Sudan ga-akpọpụta aha ndị ọchịchị echi bụ Faịde.
Ndị a ahọpụtara bụ ndị ga-ejigodi ọchịchị nwamgbenta tupu ha emee ntuliaka dịka onye isi ndị Joint Monitoring and Evaluation Commission bụ Augostino Njoroge si kwuo.
Coronavirus na Ọstralịa

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọrịa Coronavirus na-akpa mkpa na-aga n'ihu, akagbuola egwuregwu Grand prix nke kwesiri ịbịa na Ọstrelia.
Nke a na-eme dịka otu onye n'ime ndị kwesiri isonye bụ egwuruegwu butegoro ya bụ ọrịa.
Gịnị ka 'pandemic' pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahu maka ahụike mba ụwa niile bụ World Health Organisation eji WHO mara ekwuola na ọrịa Coronavirus abụrụla 'Pandemic'.
Kama ọtụtụ na-ajụ sị "Gịnị bụ dị Pandemic a?"
Ụfọdụ na-ama ahụ riri n'ụjọ maka coronavirus ị bụzị Pandemic mana eziokwu bụ na Pandemic pụtara ọrịa na esi na ahụ mmadụ banye n'ahụ onye ọzọ.
Nke a na-ekwu na Pandemic pụtara na ọrịa agbasaala ụwa niile.
Mgbe ọ bụla WHO kwuru na ọrịa bụ Pandemic, ọ pụtara na WHO na mba ụwa niile ma tinye kwa ndị Sayencị dị iche iche na-arụkọ igbochi ya bụ ọrịa.
Nanị ihe WHO chọrọ ịme maka mkpọpụta bụ ka mmadụ niile nwee ahụike.
Pandemic na-egosi etu ọrịa siri gbasaa ma ọ bụghị na ọ na-egbu mmadụ karịa.
Tom Hanks na ndị ọzọ ama ama bu Coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-eme ihe nkịrị ama ama bụ Tom Hanks na nwunye ya bụ Rita Wilson ebutela Coronavirus.
Dị na nwunye abụọ a gbara afọ iri isii na atọ ewepụla onwe ha iche maka nchekwa na ọgwụgwọ ya bụ ọrịa.
Tom Hanks mere ihe onyonyo dịka "Forest Grump" na "Castaway" bụ ide na Hollywood.
Ya na nwunye ya butere ya bụ ọrịa dịka ha gara mba Ostralịa.
Tom Hanks kọwara na ya na nwunye ya nwere ike ọgwụgwụ, azụzụ na ahụ mgbu nke mere ka ha mee nyocha.
Ọ bụ nyọch a ka ha mere were mata na ha bu ọrịa Coronavirus.
Lee ihe ọ depụtara na Instagram ya
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
"Anyị agaghị amachi ndị mbịarambịara ọbụla"- Gọọmentị Naịjirịa

Gọmentị Naịjirịa ekwuola na o nweghi onye ha ga-akwụsị ịbata na mba a dịka ọrịa Coronavirus jisi ike efesa na mba dị icheiche.
Kama ha kwuru na onye ọbụla si mba Italy, China, Iran, South Korea na Japan nata ga-aba Quarantine ụbọchị iri na anọ tupu atọghapụ ha.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ebidola nrụpụta ngwaọrụ nwereike ịnyochapụta ọrịa Coronavirus n'ime nkeji iri na mba Senegal.
Ndị sayensi na-eme nyocha na-ekwu na e nwereike iweputa ya n'ọnwa Juun maka ndị chọrọ ịnyocha ngwa ngwa.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Cristiano Ronaldo abanyela Quarantine na be ya na Madeira mba Spen dịka akụkọ pụtara na onye otu ya n'otu Juventus bụ Daniele Rugani bu ọrịa Coronavirus.
Ronaldo gara mba Spen ịleta nne ya rịachara ọrịa mkpọnwụ ahụ.
Gee akụkọ ụwa na nkeji ebe a
Nadine Dorries bụ Minista Ahuike mba Briten

Minista na-ahụ maka ahuike ndị mba Briten bụ Nadine Dorries ebutela ọrịa coronavirus.
Dorries onye dị afọ iri isiina abụọ kwuru na ọ wepụrụ onwe ya iche n'ụlọ ya mgbe ọ chọpụtara na o bu ya bụ ọria Coronavirus.
Mịnịsta Dories bụ onye mbụ bụ onye omeiwu Briten bu ọrịa Coronavirus.
Ndị bu ọrịa a na mba Briten eruola mmadu narị atọ iri asatọ na abụọ ebe mmadụ isii lagoro mụọ maka ya bụ ọrịa na Briten.
Dịka ọ dị ugbua, Dorries kwuru na akwụkwọ ọ depụtara na ngalaba na-ahụ maka ahuike ebidola ịchọpụta ndị niile ha na ya nwere mmekọ.
O kwu kwara na twitter ya were sị "Ọ bụchaghị ihe nwere isi, ebum n'obi na nke ka njọ agafela...kama ọ bụ nne m gbara afọ iri asatọ na anọ mụ na ya bị bidoro kwọwa ụkwara ka ụche m dị."
Ihe ọ depụtara na Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Daniele Rugani na agbara ndị Juventus na mba Ịtalị bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọnye na-agbara ndị mba Italị na otu boolụ Juventus bụ Daniele Rugani ebutela ọrịa coronavirus.
Dịka ọ dị ugbua. Ewepụla Ruganị na Quarrantine ma ndị ọzo kwa ha na ya nwere mmekọ.
Lee ihe onyonyo ọ wepụtara na Twitter ya ebe ya na ndị otu ya na aṅụrị mmerị ha meriri Inter Milan.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Evangelos Markinakis bụ onye nwe otu Olympiakos na Nothingham Forest

Ebe foto si, Getty Images
Evangelos Markinakis gbara afọ iri ise na abụo bụ onye nwe otu bọolu abụo bụ Nottingham Forest na Olympiakos.
Dịka o siri kwuo na Instagram "Nje ọrịa bụ coronavirus biara lee mụ ọbịa m were sị ka ndị mmadụ mara".
King Paul Akpan Udoh

Ebe foto si, Twitter
Nwaafọ Naijirịa aha ya bụ King Paul Akpan Udoh ebutela ọrịa CoronaVirus.
Udoh na-agbara ndị otu Pianese na 'Serie C' ndị mba Itali.
Dịka ọ dị ụgbụa, ewepụla ya si n'ebe ọha nọ pụọ nke bekee na-akpọ "Quarantine".
Akụkọ na-ekwu na enwere mgbe ndị otu Juventus Chọburu ịgote ya mana ọnweghị isi.
Ndị egwuregwu bọọlụ na-atụ ụjọ na enwere ike ị sị ha sọo asọmpị n'ebe ha nwereike ibute oria a.
Mana ka ọ dị ụgbụa, eyiharịala ụfọdụ asọmpị nke dịka AFC Champions league maka ọrịa Coronavirus.
Uganda na Coronavirus

Ebe foto si, AFP
Mba Uganda enyela iwu na ndị ọbụla sị mba iri na isii ha depụtara nke gunyere Amerịka na Briten ga-anọ Quarantine ụbọchị iri na anọ.
Nkea na-abịa dịka Minista Uganda na-akọwa na ụloọgwụ ha na Akụnauba ha agaghị ebulị ọrịa Coronavirus ma ọ wakpo ha n'ike.
Abụbọ ọrụ ndị ASUU

Goọmentị Naijirịa ekwuola na abụbo ọrụ ngalaba jịkọtara ndị nkuzi mahadum na Naijirịa bụ Academic staff union of universities bụ ASUU megidere iwu.
Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naijirịa bụ Chris Ngige kwuru nke a were sị na ọ bụ maka na ASUU agwaghị goọmentị tupu ha ebido abụbọ ọrụ ha.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nkata bụ Basket bọọlụ amchiela asọmpị Basket bọọlụ niile dịka optu onye na atụrụ ndi otu Utah Jazz butere ya bụ ọrịa.










