Coronavirus in Nigeria: Onyeisi NCDC anọrọla na 'quarantine'
Akụkọ ndị dị mkpa taa:
Coronavirus : Ihe mere onyeisi NCDC ji nọrọ na 'quarantine'

Ebe foto si, NCDC
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Chike Ihekweazu anọrọla na 'quarantine'.
Ihekweazu gwara BBC na ọ bụ ya ji aka ya wezụga onwe ya n'ọha n'ihi na ya si mba Chaịna lọta n'ọdị nso a.
O kwukwara na ihe ya ji wezụga onwe ya bụ iji kee nkwụcha dịka o kwesịrị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọ gara n'ihu kwuo na ya ga-anọ n'ime ụlọ abali 14 tupu mmekọ ya na ndị mmadụ amalitekwa.
Na mkparịta ụka ahụ, Ihekweazu kwuru na ụlọọrụ ya na-agba mbọ ịhụ etu a ga-esi hibe.
Ndị ekperima atọrọla fada ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima atọrọla onye ụkọchukwu ụka Katọlik na Benue steeti.
Aha ụkọchukwu a bụ David Echioda.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch si kwuo, ọ bụ n'ụbọchị Sọnde ka ya bụ ihe mere.
Onyeisi mgbasa ozi ndị Katọlik na Benue bụ ụkọchukwu John Okopupu kwuru na Fada Echioda si n'ebe ọ gara kaa ụka na-alọta oge ndị ekperima ahụ tọọrọ ya.
Fada Okopupu kwuru na ndị ahụ akpọbeghị onye ọbụla iji kwuo ihe a ga-eme tupu ha atọpụ Fada Echioda.
N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Benue steeti bụ Catherine Anene gwakwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.
Mana o kweghị ekwu ihe ọbụla ọzọ gbasara ya.
Nke a abụghị mbụ nke ọ na-abụ nke abụọ a na-atọrọ ndị ụkọchukwu ụlọụka dị icheiche na Naịjirịa.
Ụdị ihe a emeela n'Enugwu, Kaduna, Adamawa.
N'ụbọchị Sọnde, abalị mbụ nke ọnwa Maachị, ndị Bishọp ụka katọlịk mere ngagharị ekpere n'Abuja n'ihi ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naịjirịa.
Ha tikwara iwu ka ndị Katọlik niile yie akwa ojii n'ụbọchị 'Ash Wenezde'.
Ndị ụka ndị ọzọ dị icheiche e mekwaala ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu, ntọ na ohi nke dịka ọ na-abawanye na Naịjirịa ugbua.
'Abụbọọrụ ndị na ụlọọgwụ Parklane Enugwu bụ mgba okpuru'

Abụbọọrụ ndị dọkịta n' ụlọọgwụ Esut Teaching Hospital Parklane abaala ụbọchị abụọ ụbọchị Tuzde.Ndị dọkịta ahụ a kpọrọ 'Resident doctors' na bekee kwuru na iwe ha bụ na anaghị akwụ ha ụgwọ ọnwa ziri ezi ya na orubere ja ndị ọzọ nke mere ha jiri bagide abụbọọrụ ịdọ aka na ntị nke ụbọchị ise.Mgbe BBC batara n'ụlọgwụ Parklane, ọtụtụ ndị ahụ na-aya kwara arịrị na ndị dọkịta na else ndị mmadụ ahụ pere mpe n'ihi ya bụ abụbọọrụ.Otu nwaanyi bụ Benedicta Ugwu gwara BBC na ka mgbe ụnyịahụ ka ya bịwara ụlọ ọgwụ mana rule tata ya ahụbeghi dọkinta.Ụfọdụ ebe dị ka Accident and Emergency bụ ebe ndị Resident dọkinta na eju eju bụ nani dọkinta ndị isi old ma old nọ na ya.Onye dọkinta bụ Consultant gwara anyị na ha bụ ndị isi jisiri ike na arụ ya bụ ọrụ sọsọ ha, ma yọọ gọmenti ka otinye anya na ihe ndị out ha na ana ha ka were nwee ikebido ọrụ ọzọ.Permanent Secretary na ministri nke ahụike n'Enugwu adịla na mbụ katọọ abụbọ ọrụ ndị Rrsident dọlinta ahụ.Ministri ahụ kwuru na ha ekwesighị ịgba abụbọ ọrụ ugbua a na-alụ ọgụ Lassa Fever nakwa corona virus tinyekwara na ha gara ya bụ ihe na mberede na agwaghị gọmenti n'oge.Ministry ahụ kwuziri na onye ọbụla nwụrụ na Parklane n'ihi abụbọ ọrụa, na ọbara ya ga-adị ndị Tesident dọkinta n'isi.
Ọrịa coronavirus achụọla ndị omeiwu

Ebe foto si, @HouseNGR/ Twitter
Ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-aga ezumike izuụka abụọ.
Nke a bụ iji nye ohere ka e tinye ihe ụfọdụ ga-enye aka igbochi mgbasa ọrịa coronavirus n'ogige ha.
Ha rịọkwara ka ndị ọ dị n'aka gbasie mbọ ike ịchụpụ ajọ ọrịa na Naịjirịa.
Na mba Iran...
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mmadụ 23 ebutela coronavirus n'ụlọomeiwu ndị Iran.
Iran nwere ndịomeiwu mmadụ 290, nke a pụtara na otu onye n'ime mmadụ iri n'ụlọomeiwu ahụ bu ya bụ ọrịa.
Ewepụ Chaịna, Iran bụ mba nke abụọ ebe coronavirus kacha gbuo mmadu, ma bụrụkwa mba nke atọ kacha nwee ndị bu ọrịa ahụ.
Liverpool na Chelsea
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Liverpool ga-achịpụ ya n'abalị taa bụ Tuzde iji mata onye ga-agafe n'agba nke ọzọ nke asọmpi FA cup.
Otu abụọ a agbaala ọnyụpa n'ọdị nso a.
Cheta na n'ụbọchị Sọnde, ebe Mmanya ngwọ ndị Chelsea agbọghị ụfụfụ na be Bournemouth.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










