Muhammadu Buhari: Nkwa o kwere oge nta vootu ọ na-emezubeghi

Onyeisiala Muhammadu Buhari, nwunye ya Aisha, na osote onyeisiala Yemi Osibanjo na nwunye ya Dolapo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari, nwunye ya Aisha, na osote onyeisiala Yemi Osibanjo na nwunye ya Dolapo n'ogige ịchụ nta vootu n'Ogun steeti na Janụwarị 2015

N'emume olili Michael Nnadi, bụ nwa akwụkwọ semịnarị ndị ekperima gburu na Kaduna, Bishop Hassan Kukah boro onyeisiala Muhammadu Buhari ebubo na o mezughị nkwa niile o kwere ụmụ Naịjirịa.

Kukah, onye bụ onyeisi ụka Katọlik na dayọsis Sokoto, chetara nkwa niile Buhari kwere n'ọgbakọ Chatham House na London n'afọ 2015.

Nkwa ndị ahụ gụnyere iwulite ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Dịka Kukah si kwuo, ọnọdụ nchekwa akawanyela njọ mmaji kwuru mmaji n'ọchịchị Buhari a.

Bishóp Mathew Kukah
Nkọwa foto, Bishóp Mathew Kukah kwuru na Buhari bụ okwe nkw eme eme

Mana ọbụghị sọ na ọnọdụ nchekwa ka onyeisiala Buharị riri mperi.

Ha dị ọtụtụ nkwa ndị ọzọ o kwere oge ọ na-achụnta vootu n'afọ 2015 bụ ndị ọ na-emejupụtaghị.

Ha gụnyere:

Buhari kwere nkwa imeri Boko Haram.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari kwere nkwa imeri Boko Haram.

1) Ịga mba ofesi maka ahụike - Buhari n'onwe ya agaala mba ofesi ugboro ugboro ịga gwọọ onwe ya.

Otu aka ahụ kwa, ọtụtụ ndị ọchịchị na-agakwa mba ofesi ịnata ọgwụgwọ.

2) Ikwupụta akụnaụba ya - Buharị kwere nkwa na ya ga-ekwupụta ihe niile o nwere ka o doo ewu na ọkụkọ anya.

Mana taa, ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Femi Adesina agọọla na onweghi mgbe onyeisiala kwere nkwa dị etu a.

3) Iwulite ọnọdụ ọkụ latrik - Ọkụ latrik akawanyeghị mma n'ọchị Buharị.

4) Ime ka Naịra siwanye ike - Ọnụ ahịa naịra adaala ugbua karị etu ọ dị tupu Buhari ewere ọchịchị.

5) Ime ka INEC gbadosie ike iji gbochie nrụrụaka na ntuliaka - Na ntuliaka e mere n'afọ 2019, onweghị ihe gosiri na INEC esiwanyela ike.

Iji maa atụ, onyeisi INEC yịgharịrị ụbọchị ntuliaka ka ọ fọdụrụ naanị elekere ole na ole ka oge mmalite ịtụ vootu ruo.

Nkwa ndị Buhari merela

Yemi Osinbajo

Ebe foto si, Twitter/Ekiti State Government

Nkọwa foto, Osote onyeisiala Yemi Osinbajo so ụmụakwụkwọ eri nri

1) Inye ụmụakwụkwọ nri n'efu - Gọọmenti etiti nwere atụmatụ a na-akpọ 'free school feeding'.

2) Inye ndị dara ogbenye bi n'ime obodo puku naịra ise kwa ọnwa - ha kporo nke a 'Conditional Cash Transfer"

Yemi Osinbajo, Chris Ngige na ndí N-Power

Ebe foto si, Twitter/N-Power

Nkọwa foto, Gọọmentị etiti nwere atụmatụ iji nyere ụfọdụ ndị ntorobịa enweghị ọrụ aka

3) Ikepụta atụmatụ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka inwe ọrụ aka - atụmatụ a kpọrọ N-Power na-aga n'ihu ugbua.

Nkwa ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ dị n'ime akwụkwọ nke pati Buhari bụ 'All Progressives Congress' wepụtara n'afọ 2015.

Ọrụ akwa mmiri Naịja nke abụọ na-aga n'ihu ugbua

Ebe foto si, Twitter/@BuhariCentre

Nkọwa foto, Ọrụ akwa mmiri Naịja nke abụọ na-aga n'ihu ugbua

4) Akwa mmiri Naịja nke abụọ - Buharị amalitela ịrụ akwa mmiri Naịja nke abụọ. A na-atụ anya na a ga-arụcha ya tupu ọ rituo na 2023.

Ihe ha kpọrọ akwụkwọ ahụ bụ "My Covenant with Nigerians".

Ọnụ na-ekwuru Buharị bụ Garba Shehu mechara gọọ na aka Buhari adịghị na mmepụta akwụkwọ nkwa ahụ.

Mana nnyocha Premium Times mere gosiri na Buhari na ndị APC binyere aka n'akwụkwọ ahụ n'ezie.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: "Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa"