EFCC vs T.A Orji: 'Anyị ka na-enwe mkparịtaụka maka ihe anyị ga-asa ụwa'- Ọnụ na-ekwuru Nwa T.A Orji

Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu aka Abia Steeti

Ebe foto si, Nora Onuoha

Nkọwa foto, Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu.

Ọnụ na-ekwuchitere nwa onye bụbu gọvanọ Abia steeti ekwuola na nwamgbe nta ha ga-apụta gwa ụwa okwu gbasara nnyocha EFCC na-enyocha T.A Orji na nwa ya.

Uzoma Okoro kwuru na ha ga-akpọ ndị ntaakụkọ oku mgbe ha di njikere ikwu okwu.

Ihe wuru ụbọchị itoolu nke Februwarị niile bụ na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) na-enyocha nde kwuru nde achọpụtara n'ọbaego Chinedum Orji, nwa aka chiburu Abia steeti bụ

Theodore Ahamefula Orji.

Mana ọnụ na-ekwuru T . A Orji ekwuola na ha ga-ekwu okwu gbasara ya bụ ebubo n'oge na-adịghị anya.

T.A Orji

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade kwuru na ya bụ ebubo bụ nke otu a kpọrọ 'Save Nigeria Group' depụtara n'akwụkwọ mkpesa ha wepụtara kamgbe ọnwa Maachị nke afọ 2017.

Akwụkwọ ebubo ahụ kwuru na T.A Orji, oge ọ bụ gọvanọ Abịa steeti, nwetara ma bubaa n'akpa ya ego e kenyere ya iji rụpụta ihe na steeti ahụ.

Lee ụfọdụ ego e depụtara n'akwụkwọ mkpesa ahụ

  • N383 billion - ego si n'ọba ego gọọmenti etiti
  • N55 Billion - ego ọma eretelu ka erechara ego mmanụ agbịdị
  • N2.3 billion - ego Sure-P
  • N1.8 billion - ego ewepụtara maka ilebanya mmekpa ahụ gburu
  • N10.5 Billion - ego ebitere n'aka ụlọakụ ukwu Naịjirịa
  • N4 billion - ego diamond Bank
  • N12 billion - ego Paris Club refund
  • N2 Billion - ego ebitere maka ndị ọrụ ugbo.
  • N55 billion - ego ASOPADEC

'Save Nigeria Group' depụtara na ha chọpụtara ọba ego ruru otu narị bụ nke Chinedum Orji nwa Theodore Orji.

Mana Orilade kwuru na ụlọọrụ ha ka na-enyocha ya bụ ebubo.

Anyi ga na-ege ntị ka anyị mara ihe ha nyochapụtara.

Cheta na n'afọ 2018, EFCC kwuru na ha na-enyocha ụmụ T.A Orji maka ego ruru nde iri abụọ na asaa (N27bn).

Akụkọ ndị ga-amasị gị