Appeal Court Judgement: Ụlọikpe mkpegharị enyela Ọrji Uzor Kalu mmeri

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ ga-amasị gị:

Ụlọikpe enyela O.U.K mmeri

Sịnetọ Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook

Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Owerri enyela aka chiburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu mmeri na ntuliaka ọkwa ịnọchite anya Abia North.

Onyeisioche ụlọikpe a bụ R.A Ada kwupụtara mkpebi ụlọikpe a iji katọọ ikpe ụlọikpe nta bụ 'Tribunal' kpere na mbụ nke sị ka e megharịa ntuliaka n'ụfọdụ wọọdụ.

Ọ sị na usoro ụlọikpe 'Tribunal' ji kagbuo mmeri Kalu abụghị ihe iwu kwadoro.

Ọ gara n'ihu kwuo na onye mere mkpesa bụ Mao Ohuabunwa nke PDP enweghi ndị akaebe iji kwado mkpesa ya.

N'otu aka ahụ

Rochas Okorocha

Ebe foto si, @RealRochas/Twitter

Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Owerri nọrọ sị na ọ bụ sịnetọ Rochas Okorocha bụ aka chiburu Imo steeti meriri na ntuliaka ọkwa sịnetọ ịnọchite anya Imo West.

Onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Sam Onwuemeodo gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu.

Ụlọikpe a kachapụrụ mkpesa Osita Izunaso nke APGA na Jones Onyereri nke PDP mere ma kwuo na ha achịtaghị aja.

Onyeisioche ndị ụkaikpe a bụ R.A Ada gụpụtara nke a sị na ndị mere mkpesa a enweghi ihe akaebe n'ebubo ọgbaghaara ha sị mere na ntulaiaka ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe akaebe gosiri na a magidere onye ọrụ Inec n'ike ka ọ kpọpụta mpụtara ntuliaka.

Cheta na ụlọikpe ntuliaka dị na mbụ chabie ikpe na ọ bụ Okorocha meriri na ntuliaka a e mere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febụwarị 2019.

Mọnde bụ ụbọchị ezumike ndị ọrụ Bekee

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị etiti amapụtala ụbọchị Mọnde bụ abalị iri na otu ọnwa Nọvemba dịka ụbọchị ezumike nye ndị ọrụ Bekee.

Odeakwụkwọ mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Mohammed Manga sị na nke a bụ maka emume Eid-ul-Mawlud nke afọ 2019.

N'ofesi

Emmanuel Macron

Ebe foto si, Reuters

Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron sị na nzuko Nato abụrụla ihe nwụrụ anwụ kwuo na obi mba Amerịka adịchaghị na ya ọzọ.

Ọ sị na mba Amerịka agwaghị otu Nato tupu o wepụ ndịagha ya site na mba Siria.

N'egwuregwu

Manchester United

Ebe foto si, Getty Images

N'asọmpi Uefa Europa taa, Manchester United ga-anwale ike ha mgbe ha ga-ezute Partizan Belgrade dịka ha gbachara ọnyụpa n'aka ndị Bournamount.

Onye nchịkọta ha bụ Ole Gunnar Solskjaer sị na ha dị njikere maka asọmpi a.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?

Gọọmentị enyela iwu ọzọ maka mmechi ọkeala Naijirịa

Ụgọala mmanụ Agbịdị

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị etiti enyela iwu ka akwụsị ibunye ọdọ mmanụ ụgbọala ọbụla nọ na ogige kilomita iri abụọ n'oke Naijiria mmanụ ụgbọala.

Ọ bụ ndị ọrụ ngalaba 'Customs' ndị zipụru akwụkwo mgbasa ozi n'ụbọchị 6 nke Nọvemba maka atụmatụ a gwara BBC okwu maka ya.

Ha s ị na iwu a kwuru na ndị niile ometụtara ga-erububere ya isi na egbughị oge.

Aha onyonyo, Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''

Cheta na nke a na-abịa dịka gọọmentị mechiri oke Naijirịa n'ọnwa Oktoba maka ndị na-ebubata ahia iwu na ahia adigboroja, ma kwa ndị na ebu mmanụ ụgbọala site Naijirịa gaa mba ndị ọzọ

Afọ iri na anọ na nga chere onyekụzi mahadum metọrọ nwata akwụkwọ

mwakpo

Ndị ụlọomeiwu Naịjirịa akwadola ịmanye iwu ga-eme ka onye nkuzi Mahadum ọbụla metọrọ nwata akwụkwọ maọbụ nye ya nsogbu mmekọrịta ga-aga ụlọ mkpọrọ afọ iri na anọ.

Echiche ha bụ na nke a bụ ụzọ a ga-esi wepu ya bụ nsogbu na Mahadum kpam kpam.

Ọ bụ Ovie Omo-Agege bụ Osote Onyeisi n'ụlọ Omeiwu Ukwu hibere iwu a.

Okwuru maka ebe ọ kwụ ugbua n'akara Twitter ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Atụmatụ a na-abịa n'azụ akụkọ banyere ihe a BBC mere.

Aha onyonyo, SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya

Ebe ọzọ na Legọs

Babajide Sanwo-Olu

Ebe foto si, @jidesanwoolu

Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu agwaala ndị mmadụ kpọọ ya "Maazị Gọvanọ" dịka o wepụrụ 'His Excellency" n'aha a na-etu ya.

O kwuru na aha ọhụrụ ya ga-egosi ihe niile e kwesiri ịji mara ya bụ obi ume ala nakwa ijere ndị Legọs ozi.

Na mba ofesi

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ruru mmadụ iri atọ na asaa anwụọla ebe mmadụ iri isii merụrụ ahụ mgbe a wakporo ụgbọala njem ise bu ndị ọrụ na mba Burkina Faso.

E chere na ọ bụ ndị na-eyi ndụ egwu kpara ya bụ mkpa mkpa

N'egwuregwu

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ dịka enweela Neymar ọhụrụ na otu Real Madrid

A na-etu Rodrygo Silva de Goes "Neymar" dịka o nyere ọkpụ goolu atọ n'ime ọkpụ goolu isii nke otu ya ji merie Galatasaray ụnyaahụ.

Gee nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile