Rochas Okorocha: Ụlọikpe enyela Inec iwu ka ha nye Okorocha asambodo mmeri ya.

Ebe foto si, @RealRochas/Twitter
Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ asaala okwu gbasara iwu ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja nyere ha ka ha nye Rochas Okorocha, aka chịburu Imo steeti asambodo mmeri ya dịka sinetọ.
Na mkpebi nke Jọstis Abang Okon nyere ụbọchị Fraide, o kwuru na Inec enweghị ikike ijichi asambodo mmeri Okorocha dịka a kpọrọla ya onye meriri na ntuliaka e mere n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 2019 maka ọkwa onye ga-anọchite Imo-West n'Ụlọomeiwu Ukwu.
Ma na mgbarịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwenti, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na Inec ga-ebu ụzọ lebanye anya n'okwu ahụ.
Dịka Okoye siri kọwaa, ụlọikpe abụọ; ụlọikpe ukwu n'Abuja nyere ha iwu, ebe ụlọikpe ukwu ọzọ dị n'Owere nyeburu ha iwu ka ha hapụ inye onye ọbụla na ndị zọrọ ọkwa ahụ asambodo ganye na ha ekpebie ikpe ahụ nke ga-abịa ọzọ n'ụbọchị Juun 26.
Okoye gara n'iru kwuo sị "Ụlọọrụ anyị na-eme ọgbakọ ilebanye ka e si mee ntuliaka na steeti dị icheiche nke ndị kọmishọna anyị na steeti ga na-esonye.
"Ọ bụ emecha ya ka anha ga-anọkọọ lebanye anya n'okwu ahụ."
N'okwu ya na ịnabata mkpebi ahụ, Okorocha gosiri obi ụtọ ya were kwuo na mmeri ahụ bụ mmeri nye ọchịchị onyekwuoucheya.
Okorocha onye kwuru nke site n'ọnụ onye na-ekwuru ya bụ FCC Jones Onwuasoanya, boro "ndị iro ọchịchị onyekwuoucheya n'ime APC na ndị anọghị na APC" ebubo ịkpa nkata ọjọọ butere ya ihe ọ gabigara."
Akụkọ ka na-abịa.












