2019 Elections: 'Wepụ mmachi Rochas dịka onye otu APC' -Otu

Otu na-akwado onyeisiala Buhari enyela iwu ka APC welie mmachi ha machiri Rochas Okorocha dịka onye otu pati ahụ na-erughị elekere iri anọ na asatọ.
Mana onye na-ekwuchitere Rochas bụ Ebere Nzewuji kwuru na ha nabatara ya bụ iwu otu a nyere ma na-ekwu na Adams Oshiomhole bụ onye na-amaghị ihe ọ na-eme nakwa na ọ na -
emebikarị iwu APC.
Ọzọ,

Ebe foto si, Pdp facebookpage
Ndị ọchịchị pati PDP emela ngahrịwe n´isi ụlọọrụ Inec dị n'Abuja maka ntuliaka nke ọkwa onyeisiala nke emechara n'ọnwa Februwarị iri abuọ na atọ.
Onye ndu pati ahụ bụ Uche Secondus duru ndị otu PDP ruru puku kwuru puku wee me ya bụ ngagharị iwe.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, AFP
Atọghapụla nne ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Samuel Kalu ndị ntọ tọọrọ.
Ndị ntọ bu egbe tọọrọ Ozuruonye Juliet Kalu ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Februwarị mgbe ọ na-aga Abia steeti.
Ndị uweojii ekwughị ma akwụrụ ụgwọ wee gbapụta ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ebe otu Egwuregwu Chelsea na-arịọ otu na-ahazi ihe gbasara egwuregwu bọọlụ na mba ụwa niile bụ Fifa maka mkpebi ha kpebiri ịkwụsị ha ide banye ndị egwuregwu bọọlụ ọhụrụ n'otu ha.
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Hilary Clinton zọrọ ọkwa onyeisiala n'Amerika n'afọ 2016 ekwuola na ọ gaghị azọ oche ahụ na ntuliaka na-abịa na mba ahụ n'afọ 2020.
Nkeji taa,
Ihe nkiri taa










