Boko Haram awakpoola ndị nọ njem ma gbuo mmadụ 30 na Borno

Ebe foto si, @govborno
Mmadụ 30 nwụrụ n'ụtụtụ Mọnde n'obodo Auno dị n'isi obodo steeti Borno bụ Maịduguri nso, dịka ndị hụrụ ihe mere siri kwuo.
Aka na-achị steeti ahụ bụ Babagana Zulum gara ebe ihe a mere were kwuo na ndị bi ebe ahụ gwara ya na ọ bụ ndị nọ n'ime ụgbọala ka ọdachị a dakwasịrị.
Agbakwara ụfọdụ ụgbọala ọku na-ebe ahụ ma tọrọkwa ọtụtụ mmadụ.
Otu onye no nso ebe ihe a mere dere maka ya n'akara Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Govanọ Zulum gwara ndị ya bụ ihe metụtara ka ha kara obi.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Onye ọzọ na Twitter tinyekwara ihe ọ sị bụ ihe onyonyo mwakpo a .
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
'Ndị Igbo ga-eji ihe ọbụla ha nwere zọọ isi onwe ha' - Nnia Nwodo

Onyendu ndị Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo adọọla aka na ntị na ndị Igbo agaghịzị anọ na nkiri ana egbu ndị be ha.
Nwodo kwuru nke a n'ọgbakọ ime obi ha nwere ụbọchị Sọnde n'Enugwu sị na Ndị Igbo ga-eme ihe niile ha nwere ike ime iji chekwaa onwe ha Naịjirịa.
Na ya bụ ọgbakọ ndi Ime Obi nwere na Nike Lake n'Enugwu, Nwodo gwara ndị ntaakụkọ ka onye ọbụla ghara iji Ndi Igbo tie epele.
Ọ sị na ya agaghịzị ekiri ka ana egbu Ndịgbo.
Na ya bụ akwụkwọ ha biputere ndị ntaakụkọ ndị Ime Obi sị na "Ohaneze agaghịzị ekiri ka na-egbu Ndịgbo. Anyi ga-eme ihe ọbụla anyi nwere ike iji chekwa ndụ onye Igbo ọbụla n'ala Igbo."
Nke a mere ka ha họpụta ndị Ichie na ndị nwere agba ga-enwe ike ka ha na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpaa nkata mirieme maka ọdọdụ nchekwe Alaigbo.
Ohaneze kwuru na "ọ bụ ezie na ọnọdụ nchekwe n'ala Igbo adịghị nfe mgbe ọbụla, mana anyị na-eji akọ na uche na onyinye chi nyere anyị azọ onwe anyị. Onye ejikwala Ndị Igbo tie epele."
Ụfọdụ ndị bịara ya bụ nzụkọ gụnyere Archbishop Emmanuel Chukwuma, Peter Obi, Chief Achike Udenwa, Prof. Oriakụ Uche Azikiwe, Chief Mbazulike Amaechi, Hon Tobi Okechukwu, na Dr Walter Ofonagoro.
N'aka ọzọ, ọgbakọ ndị gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ enyela ntuziaka ka ndị ụlọomeiwu ha dị icheiche malite ịbado iwu ga-enye ikike ịmepe otu nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ.
Onyeisioche ha bụ Gọvanọ Dave Umahi kwuru na ha edegerela gọọmenti etiti akwụkwọ maka nke ahụ.
Umahị sị na ndị ọwụwa anyanwụ amaltelarị otu nchekwa nke ha kemgbe 28 Julaị 2019 ma mee ntọnala ya na ọnwa 31 ọgụst 2019.
Aisha Buhari etiela mkpu maka itibọrịbọ n'Ugwu Awusa

Ebe foto si, Aisha Buhari/Twitter
Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari etiela mkpu maka itibọrịbọ karịrị n'Ugwu Awụsa.
Aisha bụ onye tiri mkpụ a mgbe ọ na-emepe ogige ịzụ ụmụaka narị asaa na ụmụ iri ise na-arịọ gọọmenti ka ha kpọọ ya bụ msogbu mkpa.
UK etiela mkpu maka Coronavirus

Ebe foto si, PA Media
N'ofesi, gọmentị United Kingdom etinyela Coronavirus dịka ọrịa cheere ha ezigbo akamgba nke mere ha ji sị Chaịna bulata mmadụ narị abụọ ụbọchị Sọnde.
N'iwu ọhụrụ ha tiri, gọmenti nwere ike ịkpọchị onye ọbụla gafere ụzọ ya bụ ọrịa ma sie ọnwụ na ọ gaghị apụ ruo mgbe ha mechere nchọncha ha.
Mmadụ anọ bu ya bụ ọrịa na UK ka ọ dị ugbua.
Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji
Inter Milan anwụọ AC Milan anya

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu Italia Serie A a gbara ụnyahụ, Inter Milan ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie AC Milan.
Nke a mere ka Inter Milan sị na nkatụ nke atọ mafere na nke mbụ n'ogogo AC Milan.
Kepu kepu egwuregwu bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images
Kepu kepu na-erute anyị ntị na otu Bayern Munich na-akwado imefu paund iri asaa na ise n'isi Roberto Firminho nke Liverpool i jị kpota ya Allianz Arena.
N'aka nke ọzo ka Jurgen klopp nke Liverpool na-akwado ikpọghachita Phillippe Coutinho onye ndị Barcelona binyere Bayen munich.
Onye agha gburu ọchụ gbara ọsọ

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Onye agha Naịjirịa so na ndị amara Ikpe afọ iri maka ịrụgbu nwanne ya n'ụrụ eriela mbọmbọ ọsọ n'ụlọikpe ebe anọ maa ha ikpe.
Akeem Useni sọ na mmadụ anọ ndị ọzọ a mara ikpe ụbọchị Fraịde sị ka ya kele nwaanyị akpị gbara were si ebe ahụ waa.
Ndị agha Naịjrịa amalitelarị isi imi n'ala ịchọta ebe ya bụ nwaamadị gbagara.
Akwụkwọ ndị agha biputere maka ọchịchọ Useni gosiri na ha agbasaala ozi nye ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwe ndị ọzọ maka ọchịchị Useni.
Useni so na mmadụ anọ ji ahụhụ tagbuo onye otu ha bụ Bejamine Collins onye si River steeti maka ịhapụ ogige ndị agha na-enwetaghị ikike n'afọ 2017.
Mmadụ anọ ahụ gụnyere Useni sị ebe edowere Collins na Mogadishu Barracks kpọrọ ya ga na-akụkụ ọhịa diketere Ihejirika Quarters dị n'ụzọ Abuja-Nyanya Expressway ebe ha nọ rụgbụo ya.
Ihe nkiri African Eye ka apụta taa

Dịka a na-ekwụ maka ụzọ arụrụala dị iche iche ndị ọrụ nchekwa jị aghụpụta ndị mmadụ okwu n'ọnụ, BBC African Eye ewepụtala ihe nkiri gbasara nke a taa bụ Mọnde.
Kee nkwụcha chebiri ya. Ọ ga adị kpọkpọ
Ọgbakọ African Union

Ebe foto si, Bashri Ahmed/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari etoola ndị otu ECOWAS maka mbọ ha na-agba iji buso ndị omekataraihepụọụjọ agha n'Afrịka.
Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ nke iri atọ na atọ nke ndị otu African Union nke na-aga n'ihu ugbua n'Addis Ababa, Ethiopia.
Oscar 2020

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, ihe nkiri a kpọrọ Parasite nke ndị Saụt Koria eturula ugo nke Oscar 2020.
Ya bụ ihe nkiri bụ nke mbụ e ji asụsụ mba ọzọ mee tutere ya bụ ugo kemgbe a malitere ya bụ emume n'afọ 1929.










