Ihe Umahi, Ikpeazu nakwa gọvanọ ndị ọwụwaanyanwụ ndị ọzọ kpebiri maka akwa 'Second Niger Bridge'

Nzukọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu

Ebe foto si, Gov. Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ agwaala ndị nkuzi niile nọ na Naịjirịa ka ha ga mee nyocha maka covid 19.

Onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ bụ David Umahi kwuputere nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ka nzụkọ ha nwere n'elu intanet si gaa n'ụlọ gọọmenti dị na Abakaliki.

Lee ihe ndị ọzọ pụtara n'ọgbakọ ahụ:

1. Umahi kwuru na ha tulere etu ọrịa coronavirus si metụta mpaghara ọwụwaanyanwụ ma na--ekwu na ha ga-atụle ihe gbasara ụlọakwụkwọ iji kwado atụmaatụ nile Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) wepụtara wee na-eche mgbe a ga-emepe ụlọakwụkwọ.

2. Mpaghara ọwụwaanyanwụ niile ga-amalite ime nyocha n'ụlọ n'ụlọ tụmadị ndị ruru ma gafee afọ iri isii na ise.

3. Ha rịọrọ ka onye bụbụ odeakwụkwọ gọọmenti Naịjiria, Anyim Pius Anyim na Arthur Eze bụ ide ji ego kwụsị esemokwu dị n'etiti ha ma kwe ka ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ dozie okwu na-esere ha. Ihe na-esere ha abụọ

4. Ha kelere onyeisiala Buhari ka o si wete ego eji arụ akwa mmiri Naịja nke abụọ nakwa ndozi ọdọ ụgbọelu Enugu.

5. Ha kwetere na a ga-emeperiri ọdọ ụgbọelu Enugu n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ ma rụcha akwa mmiri abụọ nke Niger n'afọ 2022.

6. Ha kwetere na ha ga-akpọpụta aha ngalaba nchekwa ọhụru ga-echekwa mpaghara ọwụwaanyanwụ nile n'ọgbakọ ọzọ ha ga-enwe.

7. Ha kwetere na ha na gọọmenti etiti ga-etikọta aka wepụta ego a ga-eji rụ ụgbọ oloko ga-erute mpaghara ọwụwaanyanwụ.

Ihe pụtara na nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu n'ọnwa Febrụwarị

Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwanyanwụ nke Naịjirịa nwere nzukọ n'Enugwu Steeti taa.

Ozi a si n'aka gọvanọ na-achị Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi bụ onye lere ha ọbịa n'obi ọchịchị ya dị n'Enugwu.

Ndị so n'ọgbakọ ha gụnyere gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi, gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia na osote gọvanọ Anambra bụ Nkem Okeke.

Ndị ọzọ bụ ọkanmụta Barth Nnaji, onyeisi ọgbakọ ha bụ ọkanmụta Simon Ortuanya na ndị ọzọ.

Dịka ọ dị ugbua, amabeghi ihe ha kpatara na nzukọ a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Nwada Igbo chọtara ihu ọma n'aka gọvanọ Borno Steeti

Obiageli Mazi na Gọvanọ Borno steeti

Ebe foto si, Borno state goverment/Twitter

Nkọwa foto, Gọvanọ Borno steeti na Obiageli Mazi mgbe ọ jere njem nleta mberede

Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ajaala Obiageli Mazi mma na ndụ maka uchu na mbọ ọ na agba n'ọrụ nkuzi ya.

Gọvanọ ahụ mere njem mberede n'ụlọakwụkwọ ya bụ nwaanyi n'isi ụtụtụ Fraịde were zute naanị ya n'ọrụ n'elekere isii nke ụtụtụ.

Gọvanọ buliri ya n'ọkwa ma nyekwa nwaego mmachiakpa.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka atụmaatụ a n'elu soshal midia

@henryshield kwuru na etu a esi gosipụta atụmaatụ a nwereike itinye ndụ nwaanyị a na nsogbu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@TeemahK1 na-eto gọvanọ Borno maka obioma ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@ogundamisi na-eto onye nkuzi a maka etu o si nọrọ na-agba mbọ na steeti ahụ agbanyeghị ụfọdụ mmekpa ahụ na-eme ebe ahụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@oil_shaeikh kwuru na ọ bụ etu Naịjirịa kwesiri , nihi na ekwesighị nwe nkewa.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ndị ụka Metọdisti emeela ngagharịiwe

Ngagharịiwe ndị ụka Metọdisti

Ndị ụka Metọdisti nke Naịjirịa emeela ngagharịiwe megide oke ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa karịsịa ndị ụka Kraịst.

Ọ bụ ụka Metọdisti nke ngalaba Opebi dị n'Ikeja nke Legọs Steeti mere nke a.

Cheta n'izuụka gara aga, na onyeisi ụka Redeemed bụ Pastọ Adeboye na ndị ụka ya mere otu ngagharịiwe a n'ihi nchekwa na Naịjirịa.

Atụọla ndị agha gburu mmadụ nga

Onye nọ na mkpọro

Ebe foto si, AFP / Getty Images

Ụlọikpe ndị agha Naịjirịa amaala mmadụ atọ ndị otu ha ikpe afọ iri maka iji arụrụala rụgbụọ onye otu ha.

Majors Oseni, Ogbemudia Osawe, Captain Amosu na Second Lieutenant Nuhu Dogary gburu Bejamine Collins n'afọ 2017.

Egburu ndị agha Amerika abụọ

Ndị agha Amerika

Ebe foto si, AFP/Getty Images

N'ofesi, ndị agha mba Amerika ekwuola na egburu ndị agha ha mmadụ abụọ ma meruo isii ahụ na ọwụwa anyanwụ mba Afganistan.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha Amerika ebe ahụ bụ Sonny Leggett sị na onye mere ihe a yi akwa ndị agha Afganistan kpọpere mgbo ebe ndị agha ndị ọzọ nọ.

Shieffield na Bournemouth

Sander Berge

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye egwu Sander Berge bụ onye Shielffield United gotere ọhụrụ akwadowela egwu mbụ ya

N'egwuregwu, Sheffield United ga-ezute ndị Bournemouth n'elekere abụọ nke ehihie a na asọmpị premier league.

Gee akọkọ ndị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Bishop Chukwuma etinyela ọnụ n'okwu

Ụlọụka

Ebe foto si, Getty Images

Archi Bishop ndị Anglikan nke Enugu bụ Emmanuel Chukwuma ekwuola na kepu kepu a juru sosha media kemgbe na gọọmenti Enugu steeti ruru ụlọ ndị Alakụba bụ ọkpụrụ kpụrụ asi.

Chukwuma sị ndị na-agbasa ya bụ asiri wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ.

Aha onyonyo, 'Ụmụnwaanyị bụ ndị na-ejekarị ebe a na-eburu ha amụma' - Bishop Chukwuma

Fashola sị na iji mmadụ gwọọ ọgwụ ego anaghị arụ ọrụ

Babatunde Fashola

Ebe foto si, Babatunde Fashola/Twitter

Minista na-ahụ maka ọrụ na ụlọ, Babatunde Fashola ekwuola na iji mmadụ gwọọ ogwuego adịdghị ire ma rịọ ndị na-eme ihe nkiri ha ejizina ya eme ihe nkiri.

Fashola kwuru nke a n'ọgbakọ ekpokobara maka nchekwa obodo ebe ọ nọ sị ndị ọnụ na-eru n'okwu kawa ahụ gwa ndị mmadụ nke bụ eziokwu.

Agbagbuola onye gburu ndị mmadụ na Thai Land

Ndị agha na Thai land

Ebe foto si, EPA

N'ofesi, ndị ọrụ nchekwa egbuola ya bụ onye agha gburu onyeisi ya nakwa mmadụ iri abụọ na Thai Land.

Odobeghị anya ihe mere Jakraphanth Thomma jiri kpaa udi agwa ahụ mana Minista ahuike mba ahụ kelere ndị ọrụnchekwa maka ịkwụsị ya bụ nwoke.

Raheem Sterling agaghị eso gbaa bọọlụ ndị West Ham

Raheem Sterling

Ebe foto si, AFP/GETTY IMAGES

N'egwuregwu, Manchester City ga-ezute West Ham taa na ọgbọegwuregwu ha bụ Etihad.

Onyeegwu ha bụ Raheem Sterling agaghị eso gbaa maka ahụ o meruru mgbe ha na Tottenham gbara bọọlụ n'izuụka gara aga.

Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile