RCCG Prayer Walk: Adeboye na ụka RCCG na-eme ngagharịiwe maka nchekwa

Ebe foto si, PastorEAAdeboye/Twitter
Onyeisi ụka 'Redeemed Christain Church of God' bụ Enoch Adeboye du ndị ụka na-eme ngaghariwe na Naịjirịa niile maka ọnọdụ nchekwa.
Ọ sị ka ndị otu soro na njem ekpere nke ndị jikọtara ụka Kraịst bụ CAN n'ịchafụ hiwere n'ihi ogbugbu a na-egbu ndị otu ha na Naịjirịa.
Osote onyeisi ụka a bụ Funso Odesola sị na parishi dị 25000 na Naịjirịa ga-eso mee ya bụ ngagharịiwe.
Ngagharịiwe a na-abịa dịka onyeisi ụka Katọlik na Naịjirịa bụ Bishọp Hassan Mathew Kukah kwupụtara ogbugbu otu nwata akwụkwọ Semịnarị.

Ebe foto si, ISAAC JEREMIAH
Nwata a bụ Michael Nnadi, onye gbara afọ iri na asatọ so n'ụmụakwụkwọ anọ a tọọrọ na Kaduna n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020.
E mechara gbuo ya na otu nwaanyị ma tọhapụ ụmụakwụkwọ atọ ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na ndị ụka Katọlik mekwara ngagharịiwe maka ogbugbu ndị ụkọchukwu ha n'ọnwa Mee afọ 2018,
Ọtụtụ ndị mmadụ na-abatara atụmatụ a nke ha gosiri na soshal midia;
Anwụchiela onye chọrọ ịtụ ogbunigwe n'ụlọụka 'Winners Chapel'

Ebe foto si, Twitter/David Oyedepo Ministries
Aka ndị uweojii akparala otu onye chọrọ ịtụ ogbunigwe n'ụlọụka na Kaduna n'ụbọchị Sọnde.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna gwara BBC na aha nwoke ahụ bụ Nathaniel Samuel.
O kwuru na amatabeghị ma nwoke ahụ ọ bụ onye ụka 'Winners Chapel' ka o si esi bịa.
Mana nnyocha ka na-aga n'ihu iji chọpụtachaa etu ya bụ ihe si mee.
Taa bụ otu afọ Osinbajo nyara ihe mberede ụgbọelu

Ebe foto si, Instagram/kikiosinbajo
Ụgbọelu a ị hụrụ ebe a bụ nke osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo sị na ya ripụta otu afọ gara aga mgbe ọ dara kụjaa na Kabba.
Osinbajo na-aga njem ịchụ nta vootu na Kogi mgbe ya bụ ihe mberede mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọ tụụrụ Chineke mmamma maka ịme ka ya na ndị otu ya bụrụ ndị dị ndụ n'ala ndị dị ndụ taa.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ezitere Osinbajo ozi iji soro ya kelee Chineke maka ịzọpụta ya na ndị ọrụ ya n'ihe mberede ahụ gaara ịta isi ha.
Ọkụ gbara ụlọọrụ Inec n'Anambra steeti

Ebe foto si, @Cleorukkiss
Ka o ji ọkara gafee elekere iri na abụọ nke ehihie ụbọchị Sọnde, ọkụ malitere ịgba ụlọọrụ ndị Independent National Electoral Commission (Inec) nke dị na Ogidi n'ime okpuruọchịchị Idemili Nọt dị n'Anambra steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed mere ka anyị mata na ya bụ ọkụ malitere n'ọhịa dị n'akụkụ ụlọ ahụ were bata.
Ebe ndị ọrụọkụ gbaliri ike ha ịgbanyụ ya bụ ọkụ, ndị uweojii egbochiela ogige ahụ maka ndị ohi na ndị ekperima dịka ha na-etinye anya n'ihe kpatara ya bụ ọkụ.
BBC gbaliri inwete onyeisioche Inec n'Anambra bụ Nkwa Orji, mana ọ zaghị ekwenti ya.
Igwurube na-enye nsogbu n'Ọwụwa anyanwụ Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Nnụ kwuru nnụ igwurube na-eyi ndị mmadụ egwu ugbua na mba dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Afrịka site n'ịtakasị ihe ha kọrọ n'ubi.
Mba ebe igwurube ndị a na-akpa ike gunyere Somalịa, Ethiopia na Kenya, mana ọ bụ na Somalia ka ọ ka njọ.
Otu mba ụwa bụ UN kwuru na igwurube a ga-enye mba 20 nsogbu.
Djokovic emeriela

Ebe foto si, Getty Images
Novak Djokovic emeriela Dominic Thiem iji turu ugo n'asọmpi tennis Australian Open nke afọ 2020.
Mmeri a mere ka Djokovic gbagote n'ọkwa onye nke mbụ na ụmụnwoke na-akụ tennis n'ụwa niile.
Nke a bụkwa nke ugboro asatọ Djokovic na-eturu ugo n'asọmpi a.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji
Naịjirịa ọ dị njikere maka coronavirus?

Ebe foto si, EPA
Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa kwuru na ha enwetela ngwaọrụ eji enyocha ahụ maka ọrịa coronavirus.
Ha sị ka onye ọbụla si mba Chaịna bata n'ime otu ọnwa gara aga gbalịa chịkọta onwe ya ruo izuụka abụọ ma kpọtụrụ ndị ọrụ ahụike.
Ozi a si n'akara twitter ha pụta kwuru na otu 'World Health Organisation' nyere ha aka nwete ngwaọrụ ndị ahụ.
N'aka ọzọ Coronavirus egbuola otu nwoke gbara afọ iri anọ na anọ na mba Philippines dịka ọ bụ onye mbụ ọrịa a gburula na mba ọzọ na-abụghị Chaịna.
N'agbanyeghi na nwoke a bụ onye Chaịna, a sị na ọ dịka o bu ọrịa a si Chaịna bata zie na Philippines bụ ebe ọ nwụrụ.
A sị na oke oyi (pneumonia) malitere tụwa nwoke a mgbe ebugachara ya n'ụlọọgwụ na Manila bụ isi obodo Phillippines.
Ihe karịrị mmadụ narị atọ anwụọla n'ọrịa a kamgbe ọ pụtara ebe ibu ya akarịala puku iri na anọ n'ụwa niile.
Mana ndị ọ ka metụta bụ ndị si na Wuhan dị na mpaghaara Hubei nke Chaịna.
Nwaanyị ọzọ ya na nwoke so si mba Chaịna bata Philippines bukwa ọrịa a mana ọ ka dị ndụ.
Ndị dọkịta etiela mkpu maka ọrịa Lassa Fever

Ebe foto si, Getty Images
Ndị dọkịnta na Naịjirịa agwala gọọmentị etiti busie agha ike megide ọrịa Lassa fever dịka ọrịa na-egbu onye ọ na-arịa nakwa onye na-agwọ ya.
Dịka ọ dị ugbua ọrịa a eguola ihe ruru mmadụ iri anọ na otu na Naịjirịa nke gụnyere ndị ọrụ ahụike.
Akwụm chịm na PDP - Nwosu

Ebe foto si, Anyadike Nwosu
Onye na-anọchiteanya ndị Ezinihitte n'ụlọomeiwu Imo Steeti bụ Anyadike Nwosu ekwuola na kwụchịm n'otu PDP iji katọọ akụkọ sị na ọ mabala n'APC.
N'ozi o wepụtara, Nwosu sị na o nweghi ebumnobi ọbụla ịbanye Pati APC.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwu Manchester City bụ Pep Guardiola sị na ahụta ya dịka onye mara afọ n'ala maọbụrụ na ọ mabuteghi Iko Champions League.
Agbanyeghi na Guardiola ebutela Iko ise kamgbe afọ anọ ọ bịara Man. City mana ọ sibeghi Iko asọmpi Uefa ọbụla n'imi.
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











