Coronavirus egbuola mmadụ 170, jide mmadụ 7834

Ebe foto si, Getty Images
WHO etiela mkpu si ka mba ụwa kee nkwucha dịka ọrịa Coronavirus ghọrọla nnukwu nsogbu nye ahụike ọha na eze mba ụwa nke Bekee kpọrọ " Public Health Emergency of International concern".
WHO gbara ama na ya bụ ọrịa egbuola m mmadụ otu nari na iri asaa, ebe ya bụ ọrịa ji derela mmadụ.
N'ozi ha wepụtara n'abali Tọzde, WHO kwuru na ọtụtụ ndị ọrịa si mba China dịka ngụkọ gosiri na mmadụ 7736 nke pụtara mmpasent 99 ndị bu ya bụ na mba China.
Ha kwuru na ihe gara aka njọ ma ọ bụrụ n'ọbụghị na mba China bidoro n'ehihie chọwa ewu ojii.

Ebe foto si, WHO
Ihe ndị a nile pụtara ihe na mkparitaụka nke Dọkịta Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi otu WHO na ndị ntakụkọ nwere .
"Aha a ga na-akpọgodị ọrịa coronavirus ọhụrụ a bụ "2019-nCoV acute respiratory disease"
Orịa Coronavirus nke bidoro na China n'ọgw ụgwụ afọ 2019 abanyela na mba Japan, Vietnam nakwa Germany.
Gịnị bụ isiokwu nzuko Buhari na Jonathan nwere?

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter
Onyeisiala Muhammdu Buhari lere onye bubụ Onyeisiala bụ Goodluck Jonathan ọbịa n'obi ọchịchị Aso Rock n'ụbọchị Tọzde.
Ndị isi abụọ a nwere obere mkparịtaụka ime ụlọ bụ nke na-ewere ihe dịka nkeji iri.
Jonathan mgbe ọ pụtara agwaghi ndị ntaakụkọ okwu mana kepukepu kwuru si n'akwụkwọ Punch sị na ọ bịara ikele Buhari maka nkwado o nyere ya mgbe a wakporo ụlọ ya.
Akụkọ kwukwara na Buhari kwere Jonathan nkwa na a ga-echekwa ya.
Cheta na Jonathan bịakwara ụdị njem a n'ụbọchị 10 nke ọnwa Ọktoba, 2019.
Bruno ọ ga-ebuputa Manchester United?

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Manchester United azụọla Bruno Fernandes na-agbara Sporting Lisbon bọọlụ n'ebe etiti.
Manchester United ji ọnụego dị nde paund iri anọ na asaa zụta Fernandes bụ onye ga-abara ha bọọlụ ruo afọ ise na ụma.
Dịka ọ na-etinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta, Fernandes sị na ọ ga-agba mbọ ịhụ na ọ mabutere iko na Manchester United.
Ọwụwanyanwụ ga-enwe ndị ọrụ nchekwa nke ha - Umahi

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ọgbakọ gọvanọ ndị ọwụwa anywanwụ kwuru nke a n'Abakaliki n'ụbọchị Wenzde.
O kwuru na ọ bụ iji chekwa ndị Igbo n'aka ndị ọchịehi Fulani na nsogbu ndị ọzọ n'ebe ndụ na akụnaụba ha dị.
Ọ kpọpụta beghị aha ọbụla a ga-agụ otu ahụ mana a na-atụ anya na ọ ga-amalite n'oge adịghị anya.
Buhari na ndị ọru nchekwa na-eme nzukọ n'Abuja

Ebe foto si, Bashir Ahmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọọla ndị isi ọrụ nchekwa niile nzukọ na-aga n'ihu n'Abuja ugbua.
Nzukọ a bụ nke ndị akpọrọ "National Security Council Meeting" na-eme n'Obi Gọọmentị dị n'Abuja.
Nke a na-abịa n'azụ ụfọdụ ndị omeiwu sị ka ndị isi ọrụ nchekwa rituo n'ọkwa maka oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa.
Otu onye n'ime ha bụ Enyinnaya Abaribe sị na Onyeisiala Buhari n'onwe ya kwesiri iritu.
Lee ihe onyonyo si nzukọ a pụta ọnụ na-ekwuru Buhari na soshal midia bụ Bashir Ahmad wepụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Coronavirus ka na-akpọtụ taa

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwata akwụkwọ Naíjiría na-agụ mahadum na Chaịna agwala BBC Igbo ihe ha na-agabiga dịka ọrịa Coronavirus na-abawanye na mba ahụ
Nwaokoroọbịa ahụ aha bụ Emmanuel si na ọ bụ kwa ụbọchị ka a na-enyocha ha ahụ ịmata ka ha enwere ịba.
Ọ sị na nke ka njọ bụ na anaghi ekwesi ka mmadụ me ngaghari na-ejighi ikike nke mere na agụ bụzi ezigbote nsogbu ha nwere ugbu a.
Nke a na-abịa dịka ekwuputala na nje Coronavirus abaala mpaghara Chaina niile ma gbuo mmadụ otu narị na iri asaa ebe mmadụ puku asaa na narị asaa bu ya na ya bụ mba.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Novaj Djokovic na Roger Federer na-asọmpị onye ga-agafe ruo agba nke ngwụcha na iko Australian Open
Na asọmpị ụmụnwaanyị Garbine Muguruza mere Simona Halep iji ruo agba nke ngwụcha
Abaribe ekwughi uche ụmụ Naịjirịa - Garba Shehu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Graba Shehu asaala Enyinnaya Abaribe maka oku ọ kpọrọ ka Onyeisiala gbaa arụkwaghị m.
Shehu kọwara na oku ahụ enweghi isi nakwa ọbụghị uche ụmụ Naịjirịa.
Ebe Buhari Resign na-ewusike na Twitter dịka ndị mmadụ ji ya a kpọ oku ka Onyeisiala Muhammdu Buhari ritue n'ọkwa ọchịchị.
N321m maka akwa mmiri Niger abụọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
N'akụkọ yiri ya, gọọmentị Naịjirịa ahazichaala usoro a ga-esi weghachite nde naira narị atọ na iri abụọ na otu so n'ego Abacha zopuru Naịjirịa
Ha kwuru na ego ahụ ka a ga-eji rụọ okporoụzo Lagos na Ibadan, nke Abuja na Kano nakwa Akwa mmiri Niger nke abụọ.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Mba Cote d'Ivoire ekutuola ugbua dịka a chọpụtara na onye e chere na o bụ Coronavirus ebughị ya bụ ọrịa.
N'akwụkwọ ozi ha depụtara ha kwuru na nwata akwụkwọ ahụ si Pekin bata Abidjan alaala be ya.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu Manchester Utd azaala aha nna ha mgbe ha ji otu ọkpụ goolu merie otu Manchester City.
N'agbanyeghị nke a, otu Mancity eruola agba ikpeazụ n'asọmpị iko EFL ebe ha ga-ezute Aston Villa.
Gere akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a










