Coronavirus Outbreak: Onye e che na o bu ya bata n'Ivory Coast ebughi ya n'ezie

Ebe foto si, Reuters
Nwata akwụkwọ e che na o bu coronavirus si Cahịna bata Ivory Coast mechara ọ bụrụ na o bughi ya.
Mịnịstry ahụike na mba Ivory kwuru na nwata bụ enyocharala ahụ ma chọpụta na o bughi ọrị a n'ezie.
Dịka ọ dị ugbua nwata alakwurula ezinaụlọ ya n'ahụike nakwa izuoke.
Nke a na-egosi na ọrịa ọjọọ a marala ụkwụ n'ọtụtụ mbaụwa abatabeghi mba Afrịka chaachaa.
Buhari gbaa arụkwaghịm n'ọchịchị - Abaribe

Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye ndu ndị sinetị kachasị nta agwala onyeisiala Buhari ka ọ rịtuo n'ọchịchị ya n'ihe ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
O kwuru nke a na nzukọ ha n'ụbọchị Wednezde mgbe ndị omeiwu na-atụgharị uche n'ọnọdụ nchekwa ma kpọọ oku ka a hazigharịa obodo.
Abaribe sị na ihe o ji kpọọ oku a bụ maka na Buhari amala afọ n'ala n'ihe banyere nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ Naịjirịa kamgbe ọ bara n'ọchịchị.
Ndị Sịnetọ ndị ọzọ gara n'ihu kwuo ka Buhari chụọ ndị isi ngalaba nchekwa dị iche iche na Naịjirịa.
E buliela ego ọnwa ndị NYSC

Ebe foto si, TWITTER/@NYSC_NG
Gọọmentị etiti sị na ha ga-amalite ịkwụ ndị ji otu afọ efe ala nna a kpọrọ NYSC n'ịchafụ ego dị puku naịra isi atọ na atọ dịka ụgwọ ọnwa.
Onyeisi ngalaba ahụ bụ Brig. Gen. Shuaibu Ibrahim sị na ụgwọ a ga-amalite na-egbughi oge dịka o si na eko mkpata na mmefu nke afọ 2020.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'ofesi

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Mba Palestine ajụla atụmatụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara maka ime udo na mpaghara Middle East.
Trump sị na Jerusalem ga-abụ isiobodo ndị Izrel ebe ọwụwa-nyanwụ Jerusalem ga-eso bụrụ nke Palestine.
Mana onyeisiala Palestine bụ Mahmoud Abbas sị na anaghị ere Jerusalem ere.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu Tennis, Dominic Thiem meriri Rafael Nadal ma gbochie ya ịgafe n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi Australian Open na-aga n'ihu ugbua.
Nkeji
Ihe nkiri
'Anyị achọghị Iyaloja na Babaloja n'ahịa anyị'

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Igbo na-azụ ahịa n'Odunade na Legọs egosila iwe ha maka atụmatụ Iyaloja na Babaloja a chọrọ ịmalite n'ahịa ahụ.
Otu onye na-azụ ahịa n'ebe ahụ bụ Emmanuel gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ ụzọ a chọrọ isi nara ha ụgwọ ụtụisi ugboro abụọ.
Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agba mbọ i nweta ndị isi ahịa na ndị okpuruọchịchị ka ha tinye ọnụ n'okwu a.
Cheta na otu ihe a mere na ndị na-ere ahịa na 'Computer Village' dịkwa na Legọs.
#JusticeforChima

Ebe foto si, Chima Ikwunado/Facebook
#JusticeforChima na-ewu n'elu soshal midia dịka ndị mmadụ ji ohere ahụ a kpọ oku ka-enwetara Chima nwụru n'aka ndị uweojii ikpe ziri ezi
Ndị uweojii boro ya na ụmụ nwoke anọ ndị ọzọ ka nọ n'ime mkpọrọ ebubo izu ohi nke ha gbara mbọ gọnarịa.
Coronavirus eburula bata 18

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ ụgboelu British Airways amachiela njem niile na-aga mba Chaịna nakwa ndị si ebe ahụ apụtakwa n'ihi egwu ọrịa Coronoavirus
Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ narị anwụọla site n'ọrịa a.
Ọ pịa ọkpọ bụ Anthony Joshua a ga-eme ka Mohammed Ali si me?

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-ahaziri Joshua ọrụ ekwuola na ọ na-akwado ị lụ ọgụ na mba Kongo dịka Ali si me.
Ọ bụ ebe ahụ ka Mohammed Ali nọ kụpụ George Foreman ọkwụrụ n'anya.
Akụkọ ụwa n'otu nkeji
Anambra steeti ga-ebido inye ndị lụrụ agha ọgwụgwọ n'efu

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano enyela iwu na ndị agha niile lụrụ ọgụ n'agha Biafra ga-ebido ị nata ọgwụgwụọ n'efu na steeti ahụ.
Ha kwuru na mere nke a iji nyere ndị agha ahụ enyemaka ma cheta kwa agha Biafra biri n'afọ iri ise gara aga.
Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba gara n'ihu kọwaa na a ga-ebido ngụkọ na ndenye aha ndị a iji mata ole ha dị.
Ịba Lassa ataala is mmadụ 41 kemgbe 2020.

Ebe foto si, Karen Kasmauski
N'aka ọzọ Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ site n'ọrịa Iba Lassa eruola iri anọ na otu.
Minista ahụike bụ Osagie Ehanire kwukwara na mmadụ narị abụọ na iri ise na asaa bụ ọrịa ahụ na steeti iri na itoolu ugbua n'ala Naịjirịa.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
A na-enyocha mmadụ anọ na mba Itiopia maka egwu na ha bu nje Coronovirus.
Gọọmentị mba ahụ agbachiela ndị mmadụ ahụ gụnyere ụmụakwụkwọ atọ n'otu ebe dịka ezigara ọbara ha mba Saụt Afrịka maka nyocha.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọ ga-akpọtụ na Manchester taa dịka ndị ekwensu ọbara na Manchester ga-achịpụ ya taa n'asọmpị EFL Cup
Cheta na otu Man City ji point atọ gafee otu Man United site n'asọmpị ndị ha gbaburu ochie.
Gee akụkọ n'otu nkeji ebe a












