Coronavirus: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus
Ọrịa Coronavirus bụ ọrịa na-efe efe si n'ikuru ume na-egbu mmadụ. A chọpụtara ya n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna.
Gịnị bụ coronavirus?
Ọrịa coronavirus na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ.
A chọpụtara nke a ka ndị ahụike na-elekọta ndị bu ya butekwara ya.
Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ na-akpa arụ.
Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Sars (si na buusu malite) nakwa Mers (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite.
Olee mba ndị coronavirus metụtara?
Kedụ ihe eji amata Coronavirus

Ọ na-ebidokarị dịka ahụọkụ na ọkwara ike.
O ruo otu izuụka, ọ bido ume obibi (onye ahụ agaghịzị eku ume nke ọma), mgbe ahụ onye ahụ nwere ike ịnọ n'ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.
Ọ na-egosịkwa dịka ahụụfụ na ike ọgwụgwụ.
Mana onwere ike ịnọrụ izuụka abụọ n'ahụ mmadụ tupu ihe ndị a egosiwa.
O nwere mgbochi?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya.

- Kpuchie imi na ọnụ mgbe ị na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere.
- Gbado anya, mara etu gị na onye na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere si emekọrịta
- Jiri mmiri na ncha na-akwọ aka gị kwa mgbe kwa mgbe.
- Gbaa mbọ hụ na e siri akwa na anụ ị na-eri ọfụma tupu i rie ya.
Kedụ ebe a kwụ akwụ ugbua?

A ka na-enyocha ihe si n'ahụ ndị na-arịa ọrịa a na laabụ, ịchọpụta ihe kpatara ya na etu e si agwọ ya.



Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị:










