Kim Kardashian: Gịnị bụ ọrịa 'lupus' na-arịa ya?

Kim Kardashian West

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kim Kardashian West

Kim Kardashian, nwanyị a ma ama na mba Amerịka, kwuputara na ya na-arịa ọrịa a na-akpọ "lupus".

O kwuru na ya gbalịrị ihe nille o nwere ike iji ụzọ dị ka chi si kee ya wee gwọọ ya bụ ọrịa mana onwebeghi isi.

Ugbua, otu dibia bekee bụ ọkaibe aha ya bụ Dkt Wallace, na-enyezi Kardashian ọgwụ maka ya bụ ọrịa.

Kardashian kwuru na ụjọ tụrụ ya mgbe a gwara ya na o nwere ọrịa ahụ.

O kwuru na ọbụ mgbe e mere ya nnyocha ahụ n'ọnwa Mee ka a chọpụtara ọrịa a.

Anyammiri juru Kardashian anya oge ọ na-akọpụta ihe ndị a na ngwụcha izuuka gara aga.

Gini bụ Lupus

Kim Kardashian na nwa ya nwoke

Ebe foto si, Instagram/kimkardashian

Nkọwa foto, Kim chọpụtara na o nwere ọrịa "lupus" n'ọnwa Mee, tụpụ a mụọrọ ya nwa ya nwoke

"Lupus" so n'ọrịa nke bekee kpọrọ "autoimmune diseases".

Dịka Chioma Ofoekii onye bụ dibia bekee si kọwwara BBC Igbo, e nwere ihe ndị dị n'ime ahụ mmadụ nke na-enye aka iji gbochie ọrịa.

Mana mgbe ụfọdụ, ihe ndị ahụ na-egbochi ọrịa nwekwara ike tụgharịa buso ahụ mmadụ agha.

"Ọbụ mgbe ihe dị otu a mere ka a na-ekwu na mmadụ nwere 'autoimmune disease'".

Ofoekii kwuru na ọbụ ụmụnwanyị na-enwekarị ụdị ọrịa ndịa.

Mana ọpụtaghị na nwoke anaghị enwe ya.

Ọmụmaatụ ụfọdụ ọrịa ndị a gụnyere, ọrịa agba ikpere tụmadi nke a kpọrọ (Rheumatoid arthritis), dayabitis nke mbụ (Type 1 diabetes), dgz.

Kedu ka ọrịa "Lupus" si eme mmadụ?

Onye na-arịa ọrịa "Lupus"

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye ihe ghakasịrị n'ahụ n'ihi ọrịa "Lupus".

Ọrịa "Lupus" na-emetụ akụkụ ahụ dị icheiche.

Ọ na egburi njikọ ọkpụkpụ, na emetụta akpụkpọ ahụ, kidini, ọbara, ụbụrụ isi, obi nakwa ngụgụ.

Onye na-arịa ọrịa "Lupus" nwere ike ị na-enwe oke ike ọgwụgwụ, mgbu na njikọ ọkpụkpụ, ihe ịghakasị n'ahụ, oke ahụ ọkụ, dgz.

"Lupus" e nwere ọgwụgwọ?

Dibia bekee Chioma Ofoekii

Ebe foto si, Chukwunaeme Obiejesi

Nkọwa foto, Dibia bekee Chioma Ofoekii

Dịka nwaada Ofoekii sị kwuo, ọrịa niile a kpọrọ 'autoimmune' anaghị enwe ọgwụgwọ.

Otu aka ahụ, e nwebeghị ụzọ ọbụla a ma e nwere ike iji gwọọ ọrịa "Lupus" ka ọ laa kpam kpam.

Mana ndị ọkacha mara kwuru na ihe ka mma bụ ịchọ ụzọ a ga-esi ebelata ụmụ ọrịa ndị ọzọ ahụ "lupus" na-akpata, dịka ahụ mgbu, ihe ịghakasị n'ahụ, nakwa oke ahụ ọkụ.

Nwaada Ofoekii kwuru na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma.

Ọ dọrọ aka na ntị ka mmadụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọbula ọ dara ọrịa.

Ofoekii kwuru sị: "Ọ dịghị mma mmadụ ịnọ n'ụlọ were aka ya na-enye onwe ya ọgwụ."

"Maka na onye ahụ agaghị ama ihe na-arịa ya."

"Onye rịawa ahụ, ya gaa n'ụlọọgwụ n'oge ma mee nyocha zuru oke tupu ọrịa ahụ akawanye njọ".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Code Club: 'Etu anyị si eji 'coding' arụpụta ihe na-egbo mkpaeme'