World Suicide Prevention Day: Ka ndi Igbo sị ahụta onye ọbụla wepụrụ ndụ ya

Okenye

Ebe foto si, Getty Images

Etu ndị mmadụ si ewere ndụ ha ugbua na Naịjirịa na-agbazi anya mmiri.

Ọ na dịzị ka chị bọọ a nụ ọzọ.

Ngalaba na-ahụ maka ahụike a kpọrọ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ihe karịrị mmadụ puku narị asatọ na-ewere ndụ kwa afọ ọbụla.

Na Naịjirịa, ọ dịkwazị ka ọdachị a na-ewuru ndị ntorọbịa tụmaadị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Naani na Mahadum nke Naịjiria dị na Nsukka ka enweterela akụkọ ndị ntọrọbia atọ chọrọ iwepụ ndụ ha.

Mmadụ abụọ gara n'ihụ mee ya ebe a zọpụtara otu onye mgbe ọ na-achọ ime ya.

Soshal Midia a na-enyere ndị mmadụ aka iwere ndụ ha?

Ihe ọzọ na-agba anya mmiri bụ na ụfọdụ ndị a wepụrụ ndụ ha ji soshal midia kwupute etu ha ga-esi mee ya.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ekwuola na mgbawa obi, ahụhụ ụwa, ụbịam, esemokwu ezinaụlọ, mwakpo, nakwa ihe ndị ọzọ nwere ike ibute nkopu ụbụrụ nke na-akpata mmadụ iwere ndụ ya.

Mana kedụ ka ndị Igbo sị ahụ ọdachị a?

Onye na-ahụ maka ihe gbasara omenaala Igbo bụ Olueze Ụkaejuoha kọwara na mmadụ igbu onwe ya n'ala Igbo bụ arụ ka arụ.

O kwukwara na etu o si di njọ bụ na a na-eburu ozu onye ahụ ga tunye n'ajọ ọhia.

Onye ahụ lọ ụwa ọzọ, a ga-akpọta dibia siri ike ga-agwọ nnukwu ọgwụ iji mee ka onye ahụ ghara iwere ndụ ya ọzọ.

Etu a ga-esi gbochie ọdachị a

Ukaejuoha kwuru na ọ bụrụ na akụziere ndị ntorobia Igbo omenala ọfụma, na ha agaghị na-eche maka iwere ndụ ha ma ihe isiike bịa.

Mcginger Ibeneme bụ dịbia ahụike kwukwara na ikwụsị atụmatụ ọjọ a ga-ahịa ahụ makana ụwa anaghị akwado ị dị mma echi.

O kwuru na ọ ga-aga ka mma ịma ọkwa ka ndị mmadụ mara ebe na ebe ha ga-emenwu mkpesa gbasara echiche iwere ndụ ha.

"Ọ dịkwa mkpa ikpesa onye ịchọpụtara na-akpa agwa ka onye chọrọ iwere ndụ ya n'aka ndị ọ bụ ọrụ ha inyere udiri ndị a aka.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, South Afrịka Killings: "M na di m na ụmụ atọ anyị na-agbalaga"

Akụkọ ndị ga-amasị gị