Shiite Procession: Ndị otu IMN kachiri ntị mee ngagharị

Ebe foto si, Twitter/@SZakzakyOffice
Ndị otu Islamic Movement in Nigeria, bụ ndị e jikwa "Shiites" mara, kachiri ntị mee ngagharị na steeti dị icheiche na Naịjiria.
Ngagharị a bụ nke ha ji eme emume nke ndị ụka Alakụba kpọrọ "Ashura".
Nke a bụ n'ihi na gọọmentị Naijiria na-ahụtazị otu IMN dịka ndị oyi egwu.
Mana akụkọ si Abuja wee pụta n'ụtụtụ a kwuru na ndị IMN mere ngagharị iwe n'ụtụtụ na mpaghara Wuse n'ụbọchị Tuesday.
Ọnụ na-ekwuru ndị IMN bụ Ibrahim Musa gwara BBC na ha nwere ngagharị n'ezie nke bidoro na Wuse we ruo mpaghara Berger.

Ebe foto si, Twitter/@SZakzakyOffice
O kwukwara na ndị otu ha mekwara ngagharị na Kaduna Steeti mana ha na ndị uweojii kwakọtara isi nke mere ka mmadụ atọ nwụọ.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna steeti kwuru na o nweghị onye ha gburu kama ha chụsasiri ha achụsa.
Ndị otu IMN sikwa n'akara "Twitter" ha wee kwuo na ha gbakọrọ ime ngagharị na Sokoto Steeti, mana ndị uweojii ekweghi ha zọpụ ụkwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị uweojii ekwubeghi ihe ọbụla banyere ebubo ndị a.
Anjuguri Manza, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja azaghị oku anyị kpọrọ ya n'ekwentị.
Ọ zaghachighikwa ozi "SMS" anyị zigaara ya.
BBC ka na-eme nchọpụta iji mata nke bụ eziokwu n'ihe niile a.
Cheta na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu dọsiri aka na ntị ike n'ụbọchị Mọnde gbasara ngagharị ndị IMN.
Adamu kwuru na ndị uweojii ga-akpaso onye ọbụla so mee ahụ ngagharị ahụ agwa dịka onye oyi egwu.
Frank Mba, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii, kwukwara na ọbụ naanị ndị IMN ka a machiri ime ngagharị.
Mba kọwara na ndị ụka Alakụba ndị ọzọ nwere ike ime emume "Ashura" dịka ha si emebu.
Mana onye ọbụla emekwala ihe megidere iwu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









