Emeka Ihedioha's 100 days: Ihe o mere na ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Aha onyonyo, Emeka Ihedioha's 100 Days: Ihe ndị Imo na-ekwu maka ọchịchị ya
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Ilu Igbu kwuru sị na, e jighị ụtụtụ ama njọ ahịa mana nke bụ eziokwu bụ na ndị Imo sị na ọ bụ n'akwa ka e ji ama ọkụkọ ga-abụ oke, na Emeka Ihedioha na-emeta ha mma dịka gọvanọ ọhụrụ ha.

Ọ bụ site n'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2019 e duru Emeka Ihedioha nke PDP na osote ya bụ Gerald Irona n'iyiọrụ dịka aka na-achị Imo steeti ka ndị Imo bidoro gụkọwara ya ihe o mere na nke o meghị.

Aha onyonyo, Emeka Ihedioha: M ga-edozi ihe mebiri emebi n'Imo steeti

Nke a na-eme dịka Ihedioha kpụpụrụ Uche Nwosu (bụ onye Rochas Okorocha aka chịrị steeti ahụ na-afọ asatọ gara aga) n'akụkụ na ntuliaka Gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ọnwa Februwari.

Emeka Ihedioha na ụmụnwaanyị Imo

Ebe foto si, Emeka Ihedio/Facebook

Nnyocha BBC mere gosiri na na-agbanyeghị na e nweghị ọtụtụ ihe a ga-atụ aka Ihedioha meerela ndị Imo n'ọnwa atọ a, olileanya na ntụkwasaobi ha ka siri ike na ọ ga-emere ha ihe ha lekwasiri anya were tụnyere ya vootu.

Aha onyonyo, Imo state: 'A chọrọ m ka Ihedioha megharịa ihe niile Rochas mebiri '

Nke o merela:

Nhọpụta ndị ọchịchị imeobi ya

N'abalị 30 nke ọnwa Julaị bụ ọnwa abụọ o jiri banyecha n'ọchịchị, Ihedioha zigara ndị ọ họpụtara dịka ndị imeobi gọọmenti ya ụlọomeiwu steeti ya.

Ndị ọ họpụtara gụnyere ndị ọkachamara n'ihe ha na-eme doro anya dịka Prof Uchenna Uwaleke bụ ọkammụta na ngụkọ ego (Account & Finance) nakwa ahịa ego (capịtal Market) bụ onye o mere Kọmịshọna na-ahụ maka ego.

Úfódú ndí imeobi Góómenti Imo

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

Ndị ọzọ gụnyere onye bụbu Mịnịsta obere na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Viola Onwuliri nakwa Chuma Nnaji, onye bụbụ onyeisi ụlọọmeiwu steeti ahụ.

En weghị ndị ntọrobịa n'imeobi ya ebe ụmụnwaanyị nọ n'ime ya bụ naanị pasent 11.11(11.11%).

Onye ntaakụkọ bụ Martin Ori kwuru na "Emeka gbara mbọ hụ na ihe rutere 'zone' ọbụla; Orlu, Owere na Okigwe 'zone' nwere ihe ha ketara n'ọnwa ọchịchị."

Ego mkpata Imo

Dịka Ihedioha banyere ọchịchị, otu n'ime ihe ndị o mere bụ inye iwu ọkụ na steeti ahụ ga-enwe otu akpa ego nke Bekee kpọrọ 'TSA.'

Na nkọwapụta ya n'ọrụ ọ rụọla n'abalị 100, Ihedioha gbara ama na "ego steeti na-enweta sitere na nde naira 300 n'ọnwa Julaị rịa ruo nde naira 600 n'ọnwa Ọgọst."

Nrụgharị okporoụzọ

Emeka Ihedioha

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

Nkọwa foto, Emeka Ihedioha malitere atụmatụ ịrụzi okporoụzọ n'Imo

Ajọ okporoụzọ so n'ihe na-eme ndị Imo anyammiri dịka udummiri mere ọtụtụ ebe na steeti ahụ ghọọ ọnya na-achọ onye ọ gama.

N'abalị ise nke ọnwa Septemba, Ihedioha malitere nrụghari na ọrụrụ ọtụtụ okporoụzọ, amaegwuregwu na ewumewu ndị ọzọ.

Ụzọ ndị ọ mapụtara gụnyere Nkume/Umuowa/Owerri Ebiri/Umuna/Orlu; Imo State University Teaching Hospital, Umuna; Mgbidi/Oguta; Douglas/Emmanuel College/Naze and Naze/Poly/Ihiagwa/Obinze.

Ụzọ

Amaegwuregwu o metụtara bụ nke Dan Anyiam Stadium nakwa Grasshopper International Handball Stadium, dị n'Owere.

Otu onye ntorobia bụ Christian Asimole gbara akaebe n'ọchịchị ugbua "na-agbalị ịrụzitụ ụzọ n'ihi na ụzọ dịga n'Imo jọrọ oke njo ugbua bụ udummiri ganye oge ọkọchi oge ezigbo ọrụ ga-ebido na ha."

Ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.

Otu ihe na-ekpo ndị Imo ọkachasị ndị ọrụ oyibo ọkụ n'obi bụ okwu akwụghị ụgwọọnwa maọbụ agwụzughị ya oke.

Goddy Okoronkwo kwuru na "Ihedioha na-agbalị. Dịka ọ garala, obi dị anyị mma."

"Ọ maltere ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa ha. Oge mbụ anyị nụrụ na ana-akwụ ndị ọrụ 50% mana nke mbe nwaamadị batara, nke a gbanwere.

Nchekwa gburugburu

"Ọ malitere mepewa ọwa mmiri, mmiri na-aga."

ọwa mmiri

Ndị mmadụ pụtakwara n'igwe na-esonye na ime ngbocha obodo(sanitation)

Eke Ọnụnwa na ndị ahịa akuturu akutu

Oriakụ Rita Nkem Ihenacho bụbu ezenwaanyị ahịa n'ahịa Eke Onunwa (Owere Main Market) tupu akụda ya kọwara, "O (Emeka) nyere anyị ohere ịlọghachi ganye oge ọ ga-arụpụta ahịa ebe anyị ga-aga."

"Nke a bụ ihe anyị na-arịọbu gọọmenti nọbu n'ọchịchị."

Ihe ndị mmadụ na-akatọ ya maka ya

Mana dịka ụfọdụ na-eto Ihedioha maka ụkwụ ọ zọpụrụla na Imo steeti , ụfọdụ na-ekwu na ọ hapụrụ ịchụ oke na-achụ nkapị n'ihe gbasara ọchịchị obodo.

Ha katọọ ya maka ihe ndị a:

1. Nkụda a kụdara 'Akachi' na ihe akpụrụakpụ Okorocha akuturula na steeti ahụ bụ ihe ụfọdụ kwuru.

Akpụrụakpụ Akachi
Nkọwa foto, Akpụrụakpụ Akachi ka ọ dị taa bụ Wenezde

2. Ịchụghari ezinaụlọ Rochas Okorocha

Uloma

Ebe foto si, @ulomarochas

3. Ịhọpụta ndị bụ aka ochie dịka Ikedi Ohakim,Viola Onwuliri nakwa Chuma Nnadi n'ọchịchị.

Mana ọnụ na-ekwuru ya bụ Chibuike Onyeukwu kọwara na ndị a họrọ n'ọrụ bụ ndị maara ihe a na-akọ n'ọrụ a họrọ ha.

O kwuru na "ọ bụ nnukwu ihe na ha kwenyere ịji amamihe na nka ha gara Imo steeti ozi n'ihi n'ụdị ndị a ego abụghị mkpa ha"

N'okwu ichugharị Okorocha, Onyeukwu kwuru na ndị na-akatọ Ihedioha na soshal midia bụ ndị ojeozi Okorocha.

Akụkọ ndị a ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo