Gọọmentị Imo state ma maka akpụrụakpụ Rochas a na-akwatu - Ọnụ na-ekwuru Ihedioha

Ihedioha ma anya ihe a na-akwatu n'Owere

Ebe foto si, Ihedioha/BBC

Ọ dịzị ka ọ bụ chi foo ụtụtụ ọbụla a nụ maka ihe a kwaturu n'Imo steeti mana gịnị ka gọọmentị steeti ahụ nwere ikwu maka ya?

BBC Igbo kpọkuru Steve Osuji bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi nke Gọvanọ Emeka Ihedioha, onye kwuru na uche gọọmentị dị n'ihe na-eme.

Osuji kwuru na a kwaturu ụfọdụ ihe dị n'ọgbọ ebe a kpọrọ "Freedom Square" makana ọ nọghị n'atụmatụ e mepụtara maka ebe ahụ n'Imo steeti.

Ihe a kpụrakpụ dara ada
Nkọwa foto, Ihe a kpụrụakpụ a kwụbụ dịka ugwu n'ọgbọ Freedom Square

Osuji kwuru na e wepụtara ebe ahụ a na-akpọ Concorde Boulevard ka ọ bụrụ ebe ahịhịa ndụ a haziri ọfụma ga na-eto, na ọ bụghị ebe e dewere ka okwute nọrọ.

O kwuru na gọọmentị ha ka ga-akwatucha ihe niile gọvanọ chịburu achị bụ Rochas Okorocha rụrụ na steeti ahụ, nke nọchiri ụzọ Concorde Boulevard ahụ maka na ọ bụ ebe e wepụtara ka a kụọ osisi na ahịhịa na-eme ka ụzọ maa mma.

Ọ jụrụ sị "kedụ ihe Rochas jiri ego Imo steeti rụọ dị mma Ihedioha kwaturu?" na ọ bụ naanị ndị nke adịghị mma ka ọ ga-ewepụ.

Gọọmentị ọ ma maka "akantị a gbara nwa Rochas"?

Osuji tinyekwara ọnụ n'okwu nwa Okorocha bụ Uloma Nwosu akụkọ kwuru na a gbara ya akantị ka ya na ndị ọrụ nnakọta (task force) zutere.

O kwuru sị na gọọmentị akwadoghi mmadụ iji mmegide napụta onye ọzọ ihe, ọkachasị etu a na-achọ ịnapụta ihe ndị ha sị na Rochas Okorocha na ndị otu ya 'zuru' n'oge ọchịchị ha.

O kwuru na gọọmentị ha ga-anakọtacha ihe niile Okorocha "zuru" tupu ha agawa ụlọikpe ịma ma aka ha adị ọcha maọbụ ọ dịghị.

O kwukwara na ha ga-esi ụzọ ziri ezi mee ihe ndị a, makana gọọmentị nwekwara ikike ime nke a.

Cheta na a malitere ịkụda "Akachi" bụ ihe a kpụrụ akpụ n'Owere, mere ka ndị mmadụ na-ajụ onye zitere ndị bịara kụtuo ya.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha