Okorocha's monuments: Onye zitere ndị bịara ịkụda ‘Akachi'?

Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha

Ebe foto si, Facebook/Emeka Ihedioha/Rochas Okorocha

Nkọwa foto, Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu kemgbe e mechara ntuliaka 2019

Gọvanọ ọhụrụ Imo bụ Emeka Ihediora si na aka ya adịghị ya. Rochas Okorocha na-ebokwa ebubo na ọ bụ Ihedio zigara ndị mere ya.

Kedụ onye zitere ndị kuru akụkụ ụfọdụ akpụụ akụ 'Akachi' n'Imo?

Ndị a na amatabeghi ndị ha bụ buru igwe e ji akutu ụlọ were bia ikutu akpụrụakpụ Akachi.

Akpụrụakpụ Akachi
Nkọwa foto, Akpụrụakpụ Akachi

Cheta na ọ bu onye chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha kpụrụ akpuruakpu a ebe osote onyeisiala Naịjirịa bụ Okammuta Yemi Osibanjo kpuhere na izu ụka abụọ gaara aga.

Ndị onye ntaakụkọ BBC gbara ajuju ọnụ kwuru na ọ bụ n'ehihie Monde ka ndị mmadu bịara kwụsi ndị bịara ịkụda akụrụakpụ Akachi.

Ọgu bịara ida nke mere ka ndịagha ji ụgbọala na-agbafe bịara kwusi were chusaa ndị mmadụ.

Onye odibo pụrụ iche na mgbasaozi nke Gọvanọ Emeka Ihedioha bụ Steve Osuji gwara BBC na Gọọmenti ha amaghi ihe gbasara ikutu akpụrụakpụ Akachi.

Mazi Osuji kọwara na ha ka batara ọchịchị ọhụrụ,na ọ bụghị Gọọmentị nyere iwu ka a kwatuo akpụrụakpụ Akachi.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Aha onyonyo, 'Gọọmenti zigara ndị ọrụ nchekwa ebe ahụ ka anyị nwetara ozi ihe na-eme'

Ka ọ si dị, onweghi onye ma ọ bụ ndị kwetere na ọ bụ ha biara ikwatu akpụrụakpụ Akachi.

Kama ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ onye kpọpuru Govmenti ụlọikpe maka na ya na Govementi na-adọ ala ahụ kụturu Akachi.

BBC ga- ewetere gi akụkọ a n'uju ya.

Akụkọ ga-amasị gị: