Imo state tourism: Ihe o ji bụrụ "elelebe ejeghi ọrụ"

Ebe foto si, Munachi Abii/Instagram
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Gịnị na gịnị na-agbata gị n'uche mgbe ị nụrụ "Imo steeti"?
Ị jụọ ọtụtụ ndị, ha nwereike ibu ụzọ kwuo "Rochas Okorocha" nakwa ihe akpụrakpụ ya, mmiri Ọtammiri nwereike ibu mmadụ, Assumpta Cathedral, na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Mana ị ma na ọtụtụ ihe gbasara steeti ahụ bụ sọ mma?
Tinye aka gị n'aka BBC Igbo ka anyị kpọga gị ebe ahụ:
1) Ụmụnwaanyị Imo bụ "olu gbajie boys"

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị ihe itu ọnụ, mana otu njirimara ụmụnwaanyị imo steeti bụ mma ha mara nakwa "ihe ha bu n'ukwu".
Maka ụdịrị mma ha mara, e jirila ha gụọ ọtụtụ egwu, ma mgbe gboo ma ugbua.
Ọtụtụ n'ime ha agaala ihe a kpọrọ "beauty contest" bụ emume e ji ahọpụta nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa, ma merie.
Ị nụla maka Munachi Abii Nwankwo? Kedụkwanụ maka Anita Ukah, Ugochi Ihezue nakwa Ezinne Akudo?
Ka ọ bụ ndị nke na-eme ejije; Genevieve Nnaji, Rita Dominic, Stephanie Okereke Linus, Lilian Esoro na ndị ọzọ?
Ọ bụ gịnị ka i che mere e ji ekwu na ụgwọ isi ha dị oke ọnụ?
2) Nri ha bụ "dachịị"

Ebe foto si, JevinikAbuja/Instagram
Ọ bụ maka etu ofe a si atọwa agba na ụdịrị ihe na-atụ ndụ mmanụ ka mmadụ ji were ya gụọ egwu.
E nwere ofe Igbo ọzọ nwere aha obodo? Ofe Owere bụ ofe ndị "rijuru afọ" makana a na-akwọ aka esi ya.
I riela ofe ụgba/ofe akwụkwọ? I nwereike ijide ụgwọ ma i rie ofe a, makana ị gaghị ama mgbe ị ga-eji rifee afọ gị nakwa ego dị gị n'akpa.

Ebe foto si, Ntanta Delicacies/Instagram
Ofe ọkazị? Ụgba kwanụ? Ụlọ ọbụla e nyere gị ụgba a gwọrọ agwọ nakwa/maọbụ nkwọbi na isiewu, mara na ha nabatara gị dịka nwanne.
Ụkwa ndị Imo steeti, anaghị achọ ya mma mana ị ga-ericha taa ngajị gị.
3) Ebe ị ga-elepụrụ ụwa gị anya
Ọ bụ eziokwu na obodo niile nwere ebe ị nwereike ịgbara anya gị ekeresimesi, mana ị hụla nke dị n'Imo steeti?
Ị bịa Imo steeti, gbaa mbọ ruo mmiri Ugwuta nke e ji 'Oguta Lake' mara. Ị ma na mmiri abụọ dị ebe ahụ bụ Ụrashị na Ogbuide na-ezute mana ha anaghị agwọkọ ọnụ?
Ọ bụ ihe Bekee kpọrọ "confluence", ọ dịghị ọtụtụ n'ụwa.
Steeti ole na Naịjirịa nwere ogige ebe ụmụanụmanụ nwereike ịnọsapụ ahụ?
Ị garuo Owere, ndị mmadụ ga-egosinwu gị ebe ogige a dị na Nekede.
Kedụkwanụ maka Ịbarị Ọgwa ebe a na-erisa na-atasa nri Igbo dị iche iche? Kaọbụ ugwu dị n'Okigwe? Nakwa Ngwu Spring?
4) Akpụrakpụ Rochas:

Kedụ steeti dị na Naịjirịa ndị isiala mba juru na ya na-abụghị n'Imo steeti?
I chee na ọ bụ asị, gaa n'ebe a na-akpọ "Heroes Square", ị ga-ahụ Ellen Johnson-Sirleaf chịbụrụ mba Liberia, Jacob Zuma chịburu Saụt Afrịka na ndị ọzọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ akpụrụla Imo steeti n'ọnụ maka akpụrakpụ ndị a.
5) Mahadum

Ebe foto si, Imsu/ Facebook
Steeti ọzọ dị na mpaghara Ala Igbo na-agụ akwụkwọ ka ndị Enugwu steeti bụ Imo steeti.
Ọ dị ọnọdụ ka ebe ọbụla i lere anya n'Imo steeti bụ naanị mahadum ka ị ga na-ahụ.
Ha nwere Imo State University (IMSU), nwee Eastern Palm University, Federal Polytechnic, Nekede, Federal University of Technology Owerri (FUTO), University of Agriculture, Umuagwo na ebe ọmụmụ ndị ọzọ.
6) Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba

Ndị Naịjirịa ahụkwala ndị Imo steeti nwere agba n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ndị dịka Sam Mbakwe, aka chịburu Imo steeti ochie, Evan Enwerem chịrị ụlọomeiwu ukwu Naịjiria, Arthur Nzeribe, Pats Acholonu, Chris Anyanwu, Kema Chikwe, Chile Eboe-Osuji bụ onyeisi ụlọikpe mbaụwa, Emmanuel Iwuanyanwu, Kingsley Ozumba Mbadiwe.
Alvan Ikoku bụ onye e sere n'elu ego naịra 10 nke Naịjirịa bụkwa nwaafọ Imo steeti nwere agba.
7) Ndị na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-eme mmadụ obi aṅụrị a kpọrọ "entertainers" na Bekee juputara na steeti a.
Ndị dị ka Onyeka Onwenu, Charly Boy, Okey Bakassi, Uche Ogbuagu, Saint Obi, Kanayo O Kanayo, Osita Iheme e ji "Paw paw" mara na ndị ọzọ.
8) Egwu Ọyọrịma ("Highlife")
Ndị Imo steeti anaghị achị ma ọ bịa n'ụdịrị egwu ndị Igbo a.
Ị nụla "Arabanko", "Obi ejile ekwele m", "Ọzọ bụ iwe m", "Ọbaraeze", Echi dịime, na ndị ọzọ?
Ọ bụ n'Imo steeti ka ndị na-agụpụta ọnụ ha dịka Dr Sir Warrior, Oriental Brothers, Kabaka mechara gụwa nke ya, Sunny Bobo, Chima Eke na ndị ọzọ na-agụ egwu gụpụtara egwu ndị a wuru ebe niile.
9) Ihe na-amịpụta n'ala

Ebe foto si, Science Photo Library
Ndị Imo steeti anaghị eji ọrụugbo egwu egwu; ya mere ala ji amịtara ha mkpụrụ ọma.
Ọ bụ mkpụrụosisi dịka ụdara, mango, ka ọ bụ nri dị ka akpụ, ụkwa, ụkpaka/ụgba, akwụkwọ nri, kashuu (juputara n'Ọkigwe), mmanụ nri juputakwara n'ala a.
A hụkwala mmanụ agbịdị n'ụfọdụ mpaghara steeti a, dịka n'Ugwuta.
10) Omenala

Emume ndị Imo steeti pụrụ iche.
Ihe dị ka ịgba mmọnwụ, Owu, echichi ma nwaanyị ma nwoke, Ikeji Arọ, Ahịajọkụ na ndị ọzọ.
Ka ọ bụ egwu ndị dị ka Abiigbo, Ikoro, Ọkọnkọ?
11) Ndị egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Imo steeti nwere ndị ụkwụ ha bụ sọọsọ egwu dịka Sam Okwaraji, Emmanuel Amunike, Emmanuel Emenike, Kelechi Iheanacho, Kelechi Nwakali na ndị ọzọ.
Christy Opara nwetara ọlanchara n'olimpiks nke afọ 1992 ma bụrụkwa nwaanyị kacha agba ọsọ n'ụwa nke afọ ahụ, bụkwa onye Imo.
Chioma Ajunwa ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo n'Olimpiks nke afọ 1996 bụkwa nwaafọ Imo.
12) Ụlọndina, oriri na nkwari
E lee anya ọfụma, e nwere ike ịchọpụta na ọ bụ Imo steeti ọkachasị Owere kachasị nwee "hotel" na Naịjirịa.
Site na Concorde, All Seasons, na ndị ọzọ, ebe niile i tụgharịrị n'Owere nwere ụlọndina ndị a.
Kedụ ihe ị ka na-eche ịgaru Imo steeti?
Akụkọ ndị ga-amasị gị:














