Abia state: Ịga steeti a ga-agụ gị agụụ ma ị gụchaa akụkọ a

Abia steet

Kedụ ihe ndị ị nụrụla maka Abịa steeti ma nke ọma ma nke ọjọọ?

Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ndị ga-asị gị "tụfịakwa! Enweghi m ike ibi na steeti a", mana ọ bụ makana ha amaghị na e nwere uru dị n'ibi n'ime ya.

BBC Igbo chọrọ ịtụpenye gị azụ gbasara ihe ndị ga-agụ gị agụụ ibi na steeti ọma a a na-akpọ "steeti nke Chukwu".

1) Azụmahịa:

E nwere ike ikwute okwu Abịa steeti ghara ibu ụzọ ekwu okwu azụmahịa?

Akpụkpụ ụkwụ

Ndị obodo ejighi iji ego achụ ego egwu egwu, nke kpatara na ha nwere ọtụtụ ahịa na-ekwo ekwo ma na-ewu ewu.

E nwee ka ị si fugide ụzọ hụ onwe gị n'ime Arịarịa, Ahịa ọhụrụ, Isi gate maọbụ nke a na-akpọ "shopping center", dịrị njikere ibupute ego gị zụọ ihe dị iche iche mara mma.

2)War Museum/Ojukwu Bunker:

Ị bụrụ onye Igbo na-amaghị maka akụkọ agha Biafra, Abịa steeti ga-enyeju gị afọ n'ihe gbasara ya.

Aha onyonyo, Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu

Ị gaa na War Museum dị n'Ụmụahịa, ị ga-ahụju anya.

Site na ngwaagha ndị Igbo ji lụọ agha ahụ, nakwa ebe Odimegwu Ojukwu bụ ọchiagha bi n'ime ala mgbe agha a birila ọkụ, ihe ga-eju gị anya juru n'ime ebe ahụ.

3) Nrụpụta ihe:

Ndị Abịa bụ ndị na-emegharị aka ma a bịa n'ịrụpụta ihe.

Aha onyonyo, 'Uche m bụ inye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'

Ọ ga-ara ahụ ịhụ ihe ị na-agaghị arụnwu n'Aba dị n'Abịa, nke mere ka ụfọdụ ndị na-akpọ ha ndị "Chaịna nke mpaghara Afrịka".

A bịa n'akwa, ha nwere 'faktrị', a bịa n'ịrụpụta akpụkpọụkwụ, ha bụ dachịị.

4) Ọgbọegwuregwu Enyimba:

A ga-akọwa akụkọ Aba ghara ikwute okwu ndị otu egwuregwu Enyimba?

Ha so na ndị na-ebutere Abịa steeti, ọkachasị Aba, aha ọma.

Enyimba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Enyimba maburu iko Champions League nke mba Afrịka n'afọ 2003

Ha na-akpakwa ike n'egwuregwu ma na Naịjirịa ma na mba Afrịka.

Ọgbọegwuregwu ha dị n'Aba so na ndị e ji eme ọnụ na Naịjirịa.

5) Akwaete:

Ị makwa na ọ bụ ndị Abịa steeti na-eme akwa akwaete?

Akwaete

Akwaete so na njirimara ndị Igbo, nke e ji eme ọnụ.

6) Okwu e ji mara ndị Aba (slangs):

Kedụ ndị kacha atụpụta okwu ndị ahụ na-atọwa ntị ndị Igbo na-eji akpa nkata?

Ndị Aba ga-eji okwu kpọfee gị oge ọbụla, ma na mma ma na njọ.

Ahia akpụkpụ ụkwụ

Okwu ndị dị ka "nwanne gbara ọgwụ gị ṅụọ", "udo ma akwa", "a na-akọrọ onye ọcha?" na ndị ọzọ, nwere ike ịkpa gị ọchị maọbụ kpasuo gị iwe.

Onye Aba achọghị ịma, ọ ga-ekwu ka ọ ha ya n'ọnụ.

Kedụkwanụ maka "Aba nọọ jii, Aba ajụ"?, kedụkwanụ ndị e ji "ndị yọk" mara?