Anambra state: Ihe mere steeti a ji bụrụ 'ọmalịcha nwaanyị' a kpụ n'ọnụ

Kedụ ihe ndị ị nụrụla Anambara steeti dị mma ya?
Na "ha anaghị eji ntị anụ maka ego"? Na "ha na-agwọ ọgwụ ego"? Na ha nwere "arụsị Ọkịja"?
Nke a nwere ike iso n'akụkọ ndị mmadụ ji chọọ iji ịkatọ steeti ọma a, mana ndị gatụrụla steeti a ga-agwa gị na ha so n'ihe a na-eme na Naịjirịa.
Ọ bụrụ na ị gatubeghi Anambara steeti, akụkọ a ga-agwa gị ihe ndị ga-akpalite mmụọ gị ịgaru na steeti ahụ.
1)Ha bụ ndị nrụpụta:
Ị na-anụ maka Innocent Chukwuma na-ebukọta ụgbọala na Nnewi? E ji Innoson mara ya na gburugburu Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọzọ dịka Chika Okafor e ji Chicason mara, Stella Okoli bụ onye nwe "Emzor", Chika Emenike na-arụpụta nri "indomie a kpọrọ "Tummy Tummy" wdgz.
2) Ude ha na-ede n'ọchịchị:
Ị ma na ọ bụ Anambara bụ steeti mbụ nwaanyị chịrị na Naịjirịa?
Virginia Etiaba bụbu osote gọvanọ Anambara steeti rigoro ọchịchị ka ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụturu Peter Obi bụ gọvanọ oge ahụ.

Ebe foto si, AFP
Ha gbakwara onye mbụ n'ụzọ ọchịchị ndị ọzọ dịka ịmụta Nnamdi Azikiwe bụ onyeisiala mbụ Naịjirịa nwere site n'afọ 1963 ruo 1966.

Ebe foto si, Getty Images
Anambara mụtakwara Alex Ekwueme bụ osote onyeisiala mbụ Naịjiria nwere.
3) Ha bu njem ụgbọala n'isi:
A bịa na ndị na-ebuputa ụgbọala ka ndị mmadụ were mee njem, ọ dị ka ọ bụ ha ka ọ kacha n'isi.
A ga-agụ ole ghara ole? Ị nụla maka "Ekenedilichukwu motors"? Ọ bụ Augustine Ilodibe nwe ya.
Chisco? Ọ bụ Chidi Anyaegbu nwe ya. The Young Shall Grow Motors? Ọ bụ Vincent Obianodo nwe ya, GUO, wdgz.
Ha niile ndị Anambara, ndị Anambara.
4) Nnukwu emume na-agara ha aka ọfụma:
Ndị Anambara na-erite ọnụ ha na ji ọhụrụ; e jikwa ịgba mmọnwụ mara ha.
E nwere nke ha na-akpọ "ịpịa agba", bụ ebe mmọnwụ abụọ ga-eji ụtalị pịakasịa onwe ha ahụ (nwanne ị na-ele m anya ka m kwuo gịnị?)
Emume ha agụpụghị ụmụnwaanyị maọlị; a na-eme emume, ụmụnwaanyị ha na-agba egwu a na-akpọ "ịtụ nya" maọbụ "ịtụ mpete".
Ị nụla maka Ọfala? Ede-Aroh? Ito-ogbo? Idegwu? E jicha ha mara ndị Anambara.
5) Ha bụ ndị "afịa":
Ị na-ele ihe nkiri Nollywood ebe ha na-akọ maka "kọntena nọ na high sea", ọ bụ ndị Anambara ka ha bu n'uche.
Ịzụ ahịa na-amasị ha nke ọma, ya mere ha ji nwee ahịa kachasị ibu na mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka bụ Main Market nke dị n'ọnịcha.

Ebe foto si, Getty Images
Ị nụla maka Ahịa Ọchanja, Ose, Relief, Mgbuka, Nkwọ Nnewi, Oye Olisa, ahịa "head bridge" na ndị ọzọ? Ha bucha ya n'isi.
6) Agụmakwụkwọ na ihe so ya:
Ọ bụghịkwa naanị ahịa ka ha ma anya ya, ha makwa nke ekwe kụrụ ma ọ bịa n'agụmakwụkwọ.
Ọ bụ ya mere ha ji nwee ọtụtụ ndị e ji eme ọnụ n'agụmakwụkwọ na steeti ahụ.
Ị nụla maka Chinua Achebe, Chimamanda Adichie, Philip Emeagwali, Ben Enwonwu, Chike Okoli nakwa ndị ọzọ?
"Nwanne rapụ okwu" ma ọ bụrụkwa ha, makana ọ bụkwa n'Anambara ka ụmụakwụkwọ buliri iko "Technovation na mba Amerịka si.
7) Kedụ ndị bu okwu rụrụ arụ a kpọrọ "slang" n'isi?
A na-ajụ ajụ? Ndị Anambara, ọkachasị ndị "otu Ọnịcha" nọ n'ụwa nke ha ebe ọ metụtara ịtụpụta okwu ọhụrụ.
Ndị a na-asụ "ị fụrọ na ị fụrọ" na "ịve nke a ịve kwọ" na-atụpụta okwu ndị dị ka "gbachaa m ahụ", "nwanne e kogo m", "ife a sị", "nothing mega", "ị ma ife a na-arụ" wdgz.
8) Nri ha bụ "Igbo bịa lee":
Ofeakwụ ahụ na-amasị gị, ị ma na ọ bụ ndị Anambara buputara ya n'ọgbọ?
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ofe onugbu ha bụkwa rie ma rachaa aka gị, ụkwa ha kwanụ? Ha ga-esicha ya tinye ya onugbu, ogiri, azụ ọkpọọ nakwa ihe ndị ọzọ (ngwa agụzịla asọmmiri!)
Ha nwekwara ebe nlegharị anya gụnyere Ogbunike Cave, Igboukwu Museum nakwa ebe ndị ọzọ pụrụ iche.
Ngwa gwa anyị eziokwu, ọ bụ na ọ naghị agụ gị agụụ ugbua?













