Anambra Assembly: 'Ọrịa 'Sickle Cell' a egbuchaala ndị anyị ji maka ha tinye iwu a'

Aha onyonyo, Anambra Assembly: Ihe mere eji mee iwu alụm di na nwunye ndị 'Sickle Cell'

Ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onwe na ndị ọkaiwu akatọọla iwu ọhụrụ ndị omeiwu Anambara steeti mere nke machiri ndị bụ ọbara na-amụta ọrịa ọwọ ịlụ onwe ha.

Ndị ụlọomeiwu Anambra Steeti nọọrọ n'ụbọchị Tuzde abalị iri atọ nke ọnwa Eprelụ mee iwu ga-eme ka ụmụafọ Anambara steeti ọbụla nyocha onwe tupu ha na-alụ dịka di na nwunye, ma machie ndị nwere ọbara ọwọ ịlụ onwe ya.

Ha kwuru na iwu a a kpọrọ "Iwu njikwa na kpochapụ ọrịa ọwọ" bụ nke Charles Ezeani wepụtara bụ iji betala mmekpa ahụ na ọnwụ ndị ọrịa ọwọ a (Sickle Cell) na a gabiga.

Ha kwuru na onye dara iwu a ga-akwụ puku narị naịra abụọ ma ọ bụ gaa ụlọ mkpọrọ afọ atọ.

Di na nwunye na-agba akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kwuru na iwu ịmachi ndị bu ọbara na-ebute ọrịa Ọwọ(sickle-cell anaemia) megidere iwu Ala Naijiria, na ọ gaghị adị ire.

Ọkaiwu Ezeh kwuru na iwu ọhụrụ ahụ megidere Akụkụ nke 37 nke Iwu Naijiria nke nyere onye ọbụla ikike ibiri onwe ya ndụ ezinaụlọ nakwa Akụkụ nke 42 nke megidrere 'ịkpa oke'.

Eze onye bụ onye nkụzi na mahadum Nasarawa State University sị, "O megidere iwu Naijiria n'ihi na Akụkụ nke 37 nke Iwu Naijiria nyere onye ọbụla ikike ibiri onwe ya ndụ ezinaụlọ."

"Akụkụ nke 42 megidere ịkpa oke."

Eze gara n'ihu kwuo na e wezuga na ọ ga-ebute ịkpa oke megide ndị na-arịa ọrịa ọwọ, na itinye iwu ahụ n'ọrụ ga-ara ahụ.

Ọkaiwu Chukwuemeka Eze

Ebe foto si, Chukwuemeka Eze/Facebook

N'otu aka ahụ, onyeisi otu 'National Sickle Cell Foundation' bụ ọkanmụta Olu Akinyaju kwuru na iwu a adabaghị adaba na otu ha a nabataghị ya.

Akinyaju kwuru na ụdị iwu a nwere ike iduba ndị mmadụ ime ihe dị icheiche n'ihi na ọ bụ ịhụnanya ga-eme ka ndị mmadụ lụọ onwe ha.

Na nkọwa ya, otu onye omeiwu na-anọchite anya Njikoka 2 na steeti ahụ bụ Pete Ibida gwara BBC Igbo na iwu a bụ iji kwụsị ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ n'oge ha kwesiri ị bara ezinaụlọ nakwa obodo ha uru n'ihi ọrịa ọwọ a.

Ndị na-agba akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Agbamakwụkwọ abụghị ụkwa achị na'aka n'ụka Katọlik

O kwuru na iwu a abụghị ka akpa oke n'ebe ndị a nọ kama na ọ bụ iji nyere ha aka.

O kwukwara na ọ bụ ụfọdụ ndị nwere ọrịa a mere kpesa ka ha mee iwu dị etu a.

Ibida kwuru na ha na-eche ka gọvanọ Willie Obiano tinyeaka n'akwụkwọ a ka ọ bụrụzie iwu.

Di na Nwunye jikọrọ aka

Ebe foto si, Getty Images

BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị ntoroọbịa ajụjụ ọnụ, ma ha a ga-eme nnyocha ahụ tupu ha alụọ di maọbụ nwunye.

Nwada Vivian Chisom Nwabụghịogu kwuru na ihe bụ ihe mbụ ọ ga-ebu ụzọ mee tupu ọ na-alụọ nwoke ọbụla ka ha ghara ịta ụmụaka ha ahụhụ.

Chisom kwukwara na iwu a ndị ụlọomeiwu mere bụ ihe ziri ezi.

Nwaokoroọbịa aha ya bụ Kingsley Eṅogwe kwuru na inyocha ahụ tupu alụmdinanwunye bụ ihe dị oke mkpa.

O kwuru na o kwesiri ka enyocha ma ọbara mgbali elu, ọrịa HIV nakwa ihe ndị ọzọ, nke bụ na iwu a dị mma.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: