Anambra Impeachment: Akwụsịla mmadụ atọ ọrụ n'ike
Akụkọ dị mkpa taa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọka na-ekpo ọkụ ugbua.
Akụkọ si Ọka kwuru na ọgbaghara dara n'ụlọomeiwu Anambra steeti nke mere ndị uweojii jiri gbochie ụzọ esi aba n'ime ya.
Anya hụrụ ihe mere sị anwụrụ anya mmiri chusara ndị mmadu na gburuguru Obi Gọọmenti n'Ọka.
N'akụkọ metụtara nke a, onyeisi otu APGA n'Anambara steeti bụ Chief Norbert Obi akwụsịla mmadụ atọ ọrụ n'ike maka nkata akpara iji chụtuo onyeisi ụlọomeiwu Anambara.
Ndị a kpọrọ aha ha maka ihe a bụ Ikem Uzoezie, Harford Osekke nakwa Victor Okoye.
Onyeotu pati APGA achọghị ka-akpọpụta aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na-akwụsịrị mmadụ atọ a ọrụ n'ike n'ezie.
N'ofesi

Ebe foto si, Reuters
Onye ọkaiwu gọọmentị Saudi Arabia ekwuputala na ha na-atụ mmadụ iri na otu aka maka ọnwụ Jahmal Khasoggi.
O kwuru na ọ bụ osote onyeisi uweojii nzụzọ nyere iwu ka kpulata Khasoggi Saudi Arabia, ma kwukwa na aka ọkparaeze Mohammed bin Salmman adịghị n'ọnwụ ahụ.
N'egwuregwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ FIFA ezigarala ogbo ha nke Naịjirịa ozi itiakanobi maka ọnwụ Ajuma Otache.
Otache bụbụ osote onye nkuzi otu ụmụnwaanyị Naịjirịa nke pụrụiche tupu ọ nwụọ.
Gee Nkeji nke mgbede a
Ihe onyonyo nke taa
A mịpụla ego ọzọ n'akpa NLNG - Sineti

Ebe foto si, Nigerian LNG/website
Ụlọomeiwu ukwu bụ Sineti ekwuola na ha achọpụtala ego dị otu ijeri dọla ndị ụlọọrụ NNPC mịpụrụ site n'akpaego ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ gaasị bụ NLNG.
Onyeisi kọmitee mere nyocha ahụ bụ Bassey Albert Akpan agwala ndị NNPC na CBN ka ha gosi akwụkwọ eji mịpụ ego ahụ.
Ị chọrọ ụgwọ opekatampe ka ọ bụ ọrụ gị? - Ndị gọvanọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ha agaghị akwụlị puku naịra iri atọ dịka ụgwọ opekatampe ọhụrụ ma ọ bụghị ya na ha ga-achụlata ụfọdụ ndị ọrụ n'ọrụ ha.
Gọvanọ Abdulaziz Yari nke Zamfara bụ onyeisi ndị gọvanọ kwuru na ha ga-aga hụ onyeisiala Buhari ka a achọọ ụzọ ọzọ a ga-esi gboo nsogbu a.
Na mba Amerịka:

Ebe foto si, Getty Images/Reuters
Osote onye ndụmọdụ na nchekwa na 'White House' bụ Mira Ricardel ahapụla ọrụ n'ihi nsogbu dị n'etiti ya na nwunye onyeisiala bụ Melania Trump.
Cheta nwunye Trump gwara Ricardel na onwezighi ugwu ịrụ ọrụ na 'White House'.
N'egwuregwu

Ebe foto si, @thenff
Ndị Super Falcons nke Naịjirịa awụchiela na Ghana maka asọmpi Iko mba Afrịka ụmụnwaanyị ga-amalite na Satọde abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba.
Nke a bụ agba nke iri na otu asọmpi a, bụ nke ha mabuterela ugboro asatọ.












