Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Melania Trump abịala Afrịka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Melania Trump anwụọla n'Afrika

Melania Trump

Nwunye onyeisiala Amerika bụ Melania Trump ebidoola njem ya n'Afrika.

Melania abataala Gana ebe ọ hụrụ ọtụtụ ụmụaka n'ụlọọgwụ.

Ọ ga-esi Gana gawa mba Kenya, Malawi na Ijipit.

APC amachiela ntuliaka imeụlọ nke APC n'Imo steeti

Akwọkwụ ndị mmeri n'APC Imo

Ha nwere mkpebia a dịka akwụkwọ pụtara na soshal midia nke Ahmed Gulak binyere aka na-egosi na Hope Uzodimma meriri ebe akwụkwọ onyeisi mgbasaozi pati APC n'Imo steeti bụ Onwuasoanya FCC Jones dere kwurui na ọ bụ Uche Nwosu meriri ya bụ ntuliaka.

Gịnị ga-eme Ambode n'ihu?

Akinwunmi Ambode

Ebe foto si, Lagos state government

Gọvanọ Legọs steeti bụ Akinwunmu Ambode abịaghị ebe ha na-ebinye aka na ntuliaka imeụlọ nke APC na Legọs steeti taa.

Cheta na akụkọ na-efegharị na-ekwu na nna ukwu patị APC bụ Bola Tinubu anaghị akwado Ambode maka esemokwu dị n'etiti ha abụọ.

Ronaldo na ebubo nwakpo

Ronaldo

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii na Texas Amerịka ekwuola na ha ebidola ịleba anya n'ebubo otu nwaanyị boro Christiano Ronaldo n'afọ 2009 na-ekwu na Ronaldo wakporo ya.

Ronaldo bu onye otu egwuregwu bọọlụ Juventus na-agọ ebubo a.

Gee nkeji BBC

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo, Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya

Chris Okotie ekwuputala uche ya gbasara ịzọ ọkwa ọchịchị

Chris Okotie

Ebe foto si, Household of God/Facebook

Ụkọchukwu ndị Household of God church bụ Chris Okotie ekwuputala na ya ga-esonye n'ịzọ ọkwa ọchịchị ala Naịjirịa n'afọ 2019.

Cheta na Chris Okotie apụtala ịzọ ọkwa onyeisiala ụgboro abụọ n'oge gara aga.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọzọ

Emeka Ihedioha

Emeka ihedioha abụrụla onye ga-anọchị anya otu pati PDP n'izọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti.

Onye so ya n'azụ n'ọnụọgụgụ vootu a tụrụ bụ Samuel Anyanwu nakwa Ethan Achonu.

N'okwu yiri ibe ya

Akụkọ ọgụ na mgba bụ ihe so ntụliaka imeụlọ nke e mere na Krọs Rịva steeti ụnyaahụ pụta.

A nụkwara na e mere ntụlịaka imeụlọ abụọ otu n'ime kwụnyere Matthew Achigbe ebe ndị ọzọ kwụnyere Etim John nke mere na e nwere mmadụ abụọ n'azọ nnọchị anya APC na Krọs Rịva steeti ugbua.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Na mba ofesi

Melania Trump

Ebe foto si, Getty Images

Nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Melania Trump ga-atụ ọkpa na mba Ghana taa na njem mbụ ya ọ na-esoghi di ya.

Ọ ga-aga kwa mba Malawi, Kenya nakwa Ijipit ịhụ maka ihe metụtara ụmụaka.

N'egwuregwu,

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Onye ndu otu Eguregwu Super Eagles bụ Gernọt Rohr akpọpụtala aha mmadụ iri abụọ na atọ bụ ndị ga-agbara Naịjirịa mgbe ha ga-ezute mba Libya iji chọpụta onye tozuru ịbanye asọmpị Africa Cup of Nations.

Alex Iwobi, Francis Uzoho nakwa Ikechukwu Ezenwa so na ndị Rohr kpọrọ aha.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile