Massob: Ihe anyị ejighị chọọ ka a tụnyere Bianca Ojukwu

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook
Ndị otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Movement for the Actualization of Sovereign State of Biafra, (MASSOB) akpọọla ndị APGA oku ka ha ghara ịtụnyere Bianca na ntuliaka imeụlọ ha na-abịa.
N'ozi mgbasaozi otu Massob wepụtara nke onyeisi ha bụ Uche Madu binyere aka, ha kwuru na ọ bụ ihe mkparị ma Bianca Ojukwu banye na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ha kwuru na Bianca banye n'ụlọoimeiwu, na ọ ga-enye ohere ka ndị omeiwu ndị ugwu ndị anaghị akwanyere Ojukwu ugwu nwe ohere inye ya mkparị dịka e nyere nwunye Bola Tinubu.
"N'ihi ezi ugwu Ndigbo na-akwanyere Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, nwunye ya, Iyom Bianca ekwesighị ịbanye na ndọrọndọrọ ọchịchị.
"Dịka nwunye Eze Igbo Gburugburu, Iyom Bianca Ojukwu nọ ka nne Ndigbo onye ikwụba aka ọtọ, ebube na ugwu ya ga-emetọ ma ọ bụrụ na o tinye aka na ndọrọndọrọ ọchịchị."
Otu ahụ kwuru na ha hụrụ nwunye Dim Odumegwu Ojukwu n'anya dịka onye na-anọchite anya Ndịgbo n'ihe niile, gara n'ihu sị, 'Massob na-akpọ ndị nnọchite anya wọọdụ Anambara-Saụt n'ụlọomeiwu sineti oku ka ha kwanyere Ojukwu ugwu n'ihi na ikwado nwunye ya ma tụnyere ya bụ inye Ojukwu mkparị."
N'okwu ha, ndị na-akwado Bianca ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị iro Ojukwu na Ndịgbo.
Ha kpọkuru gọvanọ ndị na-achị steeti dị n'ọwụwa anyanwụ ka ha kwado Bianca site n'inyere ya na ụmụ ya aka ka ọ ghara ịdị ka Ndịigbo a gbarapụrụ ha.
Cheta na nsonso, otu si Massob kewapụta bụ Biafra Independence Movement(BIM) nke Ralp Uwazuruike nọ n'isi ya kwupụtara nkwado otu ahụ nye Bianca ịzọ ọkwa Sineti.










