Tiwa Savage eferela Mavin Records aka, feghara Universal Music

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ ndị dị mkpa:

Tiwa Savage

Ebe foto si, Getty Images

Otiegwu a ma ama bụ Tiwa Savage ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke ya na ụlọọrụ egwu ọka ibe n'ụwa bụ 'Universal Music Group' maka ikesa egwu ya n'ụwa niile.

Universal Music Group bụ ụlọọrụ ntipụta egwu so na ọkachamma na mba ụwa nke nwere ndị otiegwu kara aka gụnyere Aaliyah,Elton John,Katy Perry na Lady Gaga dịka ndị egwu ha.

Cheta na Tiwa Savage nọrọ na Mavin Record afọ asaa ebe ọ nọ tipụta ọtụtụ egwu wuru ewu dịka "Lover, lover."

N'ozi ekele nke onyeisi Mavin Records bụ Don Jazzy zipụtara n'igwe Instagram ya, o kerele Tiwa maka "ịbụ ihe mkpalite mụọ" nye ha n'ụlọọrụ ha ma kwee nkwa ikwado ya dịka ọ na-aga n'ihu.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Eze Thailand alụọla onye nche ya ma chie ya ezenwaanyị

Foto eziaụlọ eze wepụtara nke gosiri Eze mba Thailand dịka ọ na-agbasa mmiri nsọ n'isi Ezenwaanyị Suthida

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Eze mba Thailand dịka ọ na-agbasa mmiri nsọ n'isi Ezenwaanyị Suthida

Eze Maha Vajiralongkorn nke dị afọ 66, alụọla Generalụ Suthida Vajiralongkorn Na Ayudhya, onye bụ osote onyeisi ndị na-echekwa ya ma mee ya 'Ezenwaanyị Suthida'.

Eze Vajiralongkorn onye nwere ụmụ asaa, alụọla nwaanyị ugboro atọ ma gbasa.

Eze na nwaanyị ọhụrụ ya a emeela enyị ọtụtụ afọ dịka a na-ahụ ha abụọ n'ọha ọtụtụ afọ mana nke a bụ mbụ a na-akpọ okwu aha banyere mmekọrịta dị n'etiti ha.

Suthida na-arụbu n'ụgboelu mba Thai bụ 'Thai Airways' tupu Vajiralongkorn akpọpụta ya mee ya otu na ndị na-eche ya nche n'afọ 2014.

O mere ya generalụ n'afọ 2016.

Ndị ntọ atọrọla ọgọ onyeisi nche Buhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari na Onye nche ya

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ anọ bu egbe wakporo ma tọrọ Alhaji Musa Umar bụ eze Daura, obodo onyeisiala Muhammadu Buhari n'abalị Wenezde.

Umar , onye e kwuru si n'ụlọụka alakụba ebe ọ gachara kpee ekpere pụta ma nọrọ ọdụ n'ihu ụlọ ya mgbe ndị omekeome wụbatara, gbalie egbe elu iji chụsasịa ndị mmadụ ma kpụrụ nwoke ahụ.

Ntọrị ndị mmadụ na-arị ibe ya elu n'ugwu Awusa na nso nso a.

Na nso nso a , onyeisi ndị uweojii kwuru na opekatampe, atọrọla mmadụ 685 bido n'ọnwa mbụ n'afọ wee rue n'ọnwa Eprelụ afọ a.

Naanị abalị ole na ole, a tọrọ onyeisi ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ praimarị nke a kpọrọ 'Universal Basic Education Commission" bụ Mohammad Mahmood Abubakar na nwa ya nwaanyị abalị atọ.

gara aga.

Magu amajala ndị gọvanọ n'okwu nchekwa

Magu

Ebe foto si, EFCC FACEBOOK PAGE

Nkọwa foto, Buhari họpụtara Magu ugboro abuọ ka ndị sineti were ya dịka onye isi EFCC

Ọ sị na ụfọdụ ndị gọvanọ na kwanye ọkụ na nsogbu nchekwa na steetị ha ka gọọmentị etiti were tinyekwuoro ha ego na ego nchekwa a na-enye ha

Ndị gọvanọ na afụnye ọkụ na nsogbu nchekwa iji nweta ego-MaguMagu arụala ndị Gọvanọ aka ọjọọ gbasara.

Okorocha sị na Inec enweghị ike ịnapụ ya ike

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Facebook/Rochas

Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwusiela ike na Inec enweghị ike ịnapụ ya mmeri o meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa maachi.

Okorocha kwuru nke a n'akwụkwọ ọ degaara onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu bụ ebe o kwuru na Inec dara iwu site na ijichi asambodo ya.

CBN sị na ọtanisi agaghị abịa

Godwin Emefiele

Ebe foto si, Getty Images

Osote onyeisi Central Bank nke Naịjirịa bụ Joseph Nnanna ekwuola ka obodo dere jụụ na o bụghị eziokwu anisi ga-alọhachị na Naịjirịa.

Onyeisi ọgbakọ ndị otu gọvanọ bụ Abdulaziz Yari kwuru na e lewe anya ka ụsụ dowere ọnụ na ọtanisi nwere ike ịlọhachịte n'ala a afọ na-abịa.

Barcelona 3 - 0 Liverpool

Barcelona na Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụibe n'egwuruegwu, Barcelona etinyela otu ụkwụ n'asọmpi nke ikpeazụ site na mmeri ha jị ọkpụ atọ merie Liverpool ụnyahụ.

Goolu abụọ a Messi nyere mere ka goolu ya kụrụ ọnụ na narị isii kpọmkwem n'afọ iri na anọ.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:

Gee Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị: