Python Dance III: Etigbula ndị ị kwesiri ịchekwa - Ndị Gọvanọ ọwụwaanywanwụ

Governor Umahi nakwa onyendu ndịagha

Ebe foto si, Emmanuel Uzor

Nkọwa foto, Rụọ nụ ọrụ 'egwu eke' ọfụma

Ọgbakọ ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ esila n'ọnụ onyeisi ha bụ Gọvanọ Umahi gwa ndịagha ha gbado anya n'ọrụ ha.

Ha kwuru okwu gbasara atụmatụ ndịagha kpọrọ egwu eke ndịagha Naịjirịa malitere ịme n'ala Igbo.

Umahi gwara ndịagha na nsogbu agaghị adị dịka o meburu n'etiti ha na ndị Ipob nakwa otu ndịọzọ boro ha ebubo ogbugbu mmadụ.

O kwurukwara na ndịagha chọọ ụzọ ha ga-eji metuo obi ndị ọwụwa anywanwụ iji mee ka olileanya atụkwasiri na ha gbalite.

"Dịka a na-akwado ntuliaka afọ 2019, gbaa nụ mbọ hụ na unu ruru ọrụ unu n'ụzọ ziri ezi" ka Umahi kwuru

Govanọ Umahi nakwa Abubakar Maikobi

Ebe foto si, Emmanuel Uzor

Abubakar Maikobi bụ onye nọchitere anya onyeisi ndịagha kasiri ndị mmadụ obi maka etu ha ga-esi rụ ọrụ ha.

O kwuru ka obi ndị mmadụ dajụọ n'ihi na ha ga-arụ ọrụ ha dịka akwụkwọ iwu siri kwuo n'akwụnyeghiri otu ndọrọndọrọ ọbụla na ntulaiaka n'abịa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ