Ihe ndị uweojii mere ụmụnwaanyị Ipob na-eme ngagharịiwe

Nwaanyị Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii nwụchiri ụmnwaanyị Ipob na-eme nghariiwe n'Ọgọstụ 17,2018 n'Owere isi obodo Imo steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii n'Imo steeti nwuchiri ụmụnwaanyị otu Ipob ruru otu narị maka ime ngagharịiwe n'Owere ụnyaahụ bụ Fraịde.

Ụmụnwaanyị a so na ndị ruru puku abụọ si na steeti dị iche iche n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mere ngagharịiwe na-ekwu ka a tọhapụ onyeisi otu Ipob bụ Nnamdị Kanu.

Dịka ụmụnwaanyị ndị a mere ngharịiwe na-ebo ebubo na ndị agha Naịjirịa ma ebe ha dowere Kanu, onye na-efu efu kemgbe afọ gara aga oge ha gbachara 'Egwu Eke' nke abụọ n'ala Igbo.

Ụmụnwaanyị ndị a eyighị akwa-elu, ebe ụfọdụ yi akwa ojii ma na-agụ egwu agha na-agharị n'ọtụtụ okporoụzo, dị n'Owere nke butere ọtụtụ ụgbọala ịkwụ n'ahịrị.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị a bidoro gbawa egwu oge ndị uweojii zutere ha, ebe ndị uweojii gbara ha ikuku ọkụ (teargas), merụọ ụfọdụ ahụ ma nwuchikwa ọtụtụ n'ime ha.

N'okwu ya, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Andrew Enwerem kwetara na ndị uweojii ji ụmụnwaanyị Ipob ruru otu narị maka " Ime ngagharịiwe na-anataghị ikike n'aka ha, ya na maka ịbụ ndị otu iwu mabidoro."

Andrew Enwerem

Ebe foto si, Andrew Enwerem

Nkọwa foto, Ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii n'Imo Steeti

"Ị ma n'ihe gbasara the Indigineous Biafra gọọmenti Naịjirịa mapụrụ ya n'iwu."

"Nke abụọ ha agwaghị ndị uweojii. Ha bịara na-anọchi okporoụzọ na-eme ihe nwereike ibute ọgbaghara."

"E jidere ihe karịrị otu narị. Onweghị onye merụrụ ahụ, onweghị onye nwụrụ."

Enwerem ekwetaghị, nke ọ na-agọ na ndị uweojii gbara ụmụnwaanyị ahụ ikuku ọkụ.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Aha nkeananụānụ, "Anyị nwụchiri ụmụnwaanyị Ipob otu narị" - Kọmishọna uweojii Imo steeti

Akụkọ kọrọ na otu nwaanyị dị ime dara n'ihi ikuku anwụrụ ọkụ a gbara.

Otụtụ ndị mmadụ na-akpọ oku na soshal midia ka ndị uweojii tọhapụ ụmụnwaanyị ndị a ha ji.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: